< Ndị Hibru 13 >
1 Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.
愿兄弟姐妹之间的爱永远保持!
2 Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
不要忘记对陌生人也表达爱意,因为这样做,有些人就会在不知不觉间迎来了天使。
3 Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
记住那些被关在监狱里的人,就像你和他们一起关在里面一样。记住那些被虐待的人,就像你和他们一起遭受肉体的痛苦。
4 Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
人人都应该尊重婚姻,丈夫和妻子应该彼此忠诚。上帝会审判淫乱之人。
5 Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
不要贪钱;满足于自己所拥有的。 上帝自己说过:“我永远不会让你们失望;我永远不会放弃你们。”
6 Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
所以我们可以自信地说:“主来帮助我,我决不害怕,别人能把我怎么样呢?”
7 Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
记住那些向你解释上帝之道的领导者。再看看他们生命得到了,要效法他们对上帝的信任。
8 Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn )
耶稣基督昨天、今天、一直到永远都是一样的。 (aiōn )
9 Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
不要被各种奇怪教义分心。心要被恩典说服,这样才是好的,不要被那些告诉我们吃什么的律法说服。遵守这些法律之人,不会得到任何好处。
10 Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
我们有一座祭坛,坛上的祭物,礼拜堂中的祭祀没有权利食用。
11 Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
那些祭牲的血,由大祭司带进圣幕进行赎罪献祭,祭牲的身体却要在营地外焚烧。
12 Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
耶稣同样也死在城门外,用自己的血让上帝的子民成变得圣洁。
13 Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
那么,让我们也出到城外他那里去,受他曾受过的凌辱。
14 Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
因为在这里我们没有永远的城,我们却是寻求那将要来的城。
15 Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
所以我们常常要借着耶稣,把颂赞的祭品献给上帝,这意味着说上帝的善语,宣扬他的品格。
16 Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
别忘记行善,与其他人分享你拥有的,因为这样的献祭会让上帝喜悦。
17 Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.
遵从你的领导,按照他们的吩咐去做,因为他们关心你并为你负责。通过这种方式行事,让他们可以快乐——而不是悲伤地做这件事,因为这对你没有帮助!
18 Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.
请为我们祷告,因为我们深信自己良心无愧,愿意凡事遵行正道。
19 Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.
我真的希望你们为我们努力祷告,好使我们能够尽快看到你们。
20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios )
那赐平安的上帝,是他用永恒约定的血让我们的伟大牧羊人、主耶稣死而复生。 (aiōnios )
21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn )
愿上帝为你们带来一切美好的东西,让你们可以遵行他的旨意。愿他与我们同在,通过耶稣基督,一起做他喜欢的一切,愿荣耀归于他,直到永远。阿门。 (aiōn )
22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.
兄弟姐妹们,建议你们关注我在这封短信中所说的一切。
23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
你们要知道,我们的兄弟提摩太已经释放了;如果他来得早,我就跟他一起去看你们。
24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
请问候你们的所有领导和所有信徒。在意大利的信徒来也问候你们。
25 Ka amara dịnyere unu niile.
愿恩惠与你们同在。阿门。