< Ndị Hibru 12 >

1 Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
THEREFORE also seeing we have so great a cloud of witnesses surrounding us, laying aside every weight, and that most easily besetting sin, let us run with patience the race lying before us,
2 Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
earnestly looking up to Jesus the author and the finisher of faith; who, for the joy set before him, endured the cross, despising shame, and hath sat down at the right hand of the throne of God.
3 Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.
Consider then attentively him that endured from sinners such opposition against himself, that ye be not wearied out, fainting in your souls.
4 Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu.
As yet ye have not resisted unto blood, struggling against sin.
5 Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
And have you forgotten the exhortation which is addressed to you, as children, “My son, count not lightly of the Lord’s childlike correction, nor faint when under his rebuke:
6 Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”
for whom the Lord loveth he correcteth, and scourgeth every son whom he receiveth.”
7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.
If ye patiently endure correction, God carries himself towards you as his children: for who is the son whom the father doth not correct?
8 Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.
If then ye are without correction, of which all are partakers, then are ye bastards, and not children.
9 Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.
If then we have had the fathers of our flesh for correctors, and reverenced them; shall we not much more be under subjection to the Father of spirits, and live?
10 Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.
For they indeed for a few days as seemed proper to themselves corrected us; but he for our own advantage, that we might be partakers of his holiness.
11 Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.
Now all correction at the moment seemeth not to be cause for joy, but for sorrow; but after a while it produceth peaceable fruit of righteousness to those who have thereby been disciplined.
12 Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.
Wherefore stretch out again the hands that hang down, and the paralytic knees;
13 Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.
and make strait paths for your feet, that what is halting may not be turned out of the way; but that it may rather be healed.
14 Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.
Earnestly seek peace with all men, and holiness, without which no man shall see the Lord:
15 Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.
carefully observing lest any of you fail of attaining the grace of God; lest any root of bitterness springing up trouble you, and by it many be defiled;
16 Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.
lest there be any fornicator, or profane person, as Esau, who for one morsel of bread parted with his birthrights.
17 Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.
For ye know, that when afterwards he wished to inherit the blessing, he was rejected: for he found no place for a change of his father’s mind, though he sought it earnestly with tears.
18 Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe,
For ye have not approached the mountain that could only be groped for, and that burned with fire, and the thick cloud, and the darkness, and the tempest,
19 na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.
and the sound of a trumpet, and the voice of words, which they who heard, earnestly begged that the discourse might not be directed to them:
20 Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”
for they could not bear the charge given, and “If but a beast touch the mountain he shall be stoned, or shot through with a dart:”
21 Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”
and so terrible was the appearance, that Moses said, I am exceedingly afraid and trembling:
22 Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ.
but ye are come unto mount Sion, and to the city of the living God, to the heavenly Jerusalem, and to myriads of angels,
23 Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.
and to the general assembly and church of the first-born registered in the heavens, and to God the judge of all, and to the spirits of just men perfected,
24 Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.
and to Jesus the mediator of the new testament, and to the blood of sprinkling, which speaketh better things than that of Abel.
25 Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.
Beware that ye reject not him that speaketh: for if they escaped not, who rejected him, that upon earth spake by divine influence, much more shall not we escape, if we turn away from him who speaks from heaven:
26 Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”
whose voice then shook the earth, but now he hath promised, saying, “Yet once more I shake not the earth only, but also the heaven.”
27 Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.
Now this word yet once more manifests the removal of the things shaken, as of things formed, that the things not shaken may endure.
28 Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata.
Wherefore receiving a kingdom that cannot be shaken, may we hold fast the grace, by which we can offer to God acceptably divine service, with reverence and pious awe:
29 Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.
for our God is a devouring fire.

< Ndị Hibru 12 >