< Ndị Hibru 11 >

1 Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya.
Ulyeteho ni lioli yalinayo umntu lwagolela ahantu ahamo hudandamazu. Ahantu hasanga haoneshe awe uyinga lioli.
2 Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama.
Nantele awababu wetu waheteshe kwa lweteho lwao.
3 Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya. (aiōn g165)
Kwa lweteho timenye aje munsi wahawombwelwe hundajizwa zya Ngolobhe, aje hala hahawoneha sagahahagombwilwe afume huvintu vivioneha. (aiōn g165)
4 Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe.
Ihali kwa lweteho lwa Habili ahafumizizye Ungolobhe isadaka inyinza hushile u Kaini. Husababu eyo ahasombwelwe aje alinuugolosu. Ungolobhe ahasombele. Huje ahaletile izawadi, U Habili ayanga hata nkafyiye.
5 E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.
U Henoko ahali nulweteho ahengwilwe humwanya sagaahalolile ufye. “Sagaahawoneshe, kwa vile ilinenwa juu yake kuwa alimpendeza Ungolobhe ahamwenjile” humwanya.
6 Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.
Bila lweteho sagauwajie hugwezye Ungolobhe, yawala hwa Ngolobhe ahnaziwa awe nulweteho aje Ungolobhe. Akhala naje ahuwapela izawadi wala wawahumwanzo.
7 Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.
Ihali hulweteho aje uNuhu, ahasundilwe nu Ngolobhe humambo gasaga gahaoneshe, ishishi ya Ngolobhe ihagombile. Mbongoso yahukombole ikhaya yakwe. Ahawombile esho ahalonjile munsi, ahawa mlithi wa lioli eyo ihezele ashilile ulweteho.
8 Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.
Ihali lweteho aje u Abrahimu, alipoitwa alitii na kwenda mahali ambapo alipaswa kupokea kama lwahakwiziwe aheteshe ahawalile ahaposhe ulithi ahasongoe bila amanye aje awala hwii.
9 Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ.
Ihali lweteho ahiishi hunsi aje jenu. Ahakheye hu mahema peka nu Isaka nu Yakobo, walithi awamwao wa ndagano yiyile.
10 Nʼihi na ọ na-ele anya ala ahụ nke nwere ntọala, nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke.
Huje ahasowenye ahwenje umji wapime na wazenje yu Ngolobhe yuyo.
11 Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi.
Ihali lweteho aje Ibrahimu, nu Sala yuyo wahaposheye ingovu zya amyemye ulwanda lakini wahali wagogolo hani wahombile Ungolowe aje golosu. Ahawasowezezye umwana wishilume.
12 Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri.
Huje afume hwamuntu oyo weka yahakaribiye afye wahapapwa awana wasagawazye. Wahali wichi nazi inzota zya humwanya na msanga wa hu bahari.
13 Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa.
Ewe wonti wahafyiye nu lwetiko sagawahaposhea ulusuwelo. Ila wahalolile wahakalibisizye hwahutali waheteshe aje wahali wajenu aje washila shila munsi yao wewo.
14 Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha.
Wala wawayanganga amambo nazi engo awashe wahuanza insi yao wewo.
15 Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ.
Lioli nkawasewenga insi yawahafumile indi walininafasi ya wele, wangelikuwa na nafasi ya kurejea.
16 Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
Eshi shileho wanyonywa insi yilishinza ya humwanya. Eshi Ungolobhe sangaalola isoni akwiziwe Ngolobhi wao yuyo agombile umji khaajili yao.
17 Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja,
Ihali ilweteho u Abrahamu ahapata ingelo, ahafumya u Isaka. Umwene ahapashela ulusuwelo husheshelo, ahafumizye umwana wakwe weka,
18 ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
yuyuyo ahayangwile, “Afume hwa Isaka ishikholoshakwe azakwiziwe.”
19 Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya.
U Ablaimu ahamenye aje Ungolobhe ahali ni ngovu wa huzyosye u Isaka afume hufyiye, ahayanjile hukabila ya shitenda wili ahaposheye.
20 Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu.
Ihali lweteho aje u Isaka ahasaile uYakobo nu Esau ahusu amambo gagahuenza.
21 Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.
Ihali lweteho aje uYakobo lwahali lwahali karibu afye ahasaile awana wa Yusufu wekaweka. U Yakobo ahaputile ahategemee humwanya yi ndesa yakwe.
22 Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya.
Ihali lweteho aje u Yusufu uwakati wakwe wa malishe lwahakalibia ahayenje aje afume hwawana wa Israeli huMisri ahawalajizya ahweje peka amafupa gakwe,
23 Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.
Ihali lweteho aje uMusa iwahapapwilwe wahafisile amezi gatatu na awazazi wakwe wahanolile aje mwana usanga ya hali mwinza, sagawaahongope indajizwo izwa mwene.
24 Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.
Ihali lweteho aje uMusa lwahali muntu ugosi ahakhanile akwiziwe mwana wa nendi wa Farao.
25 Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie.
Pamande ahasaluye ahale na malawa peka na wantu wa Ngolobhe saga ahasungwenzye ianasa imbiwi izya papepe.
26 O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.
Ahasewele isoni ya hufuante uKristi aje uutajili ugosi kuliko imali ya Mmisri ahakazile amaso ahunye izawadi husiku zizihwenza.
27 Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.
Ihali lweteho aje uMusa ahahepile huMisri. Sagaahogope ilioyo lya mwene, ahuenye gasanga gawoneha.
28 O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka.
Ihali lweteho aje ahaikhente ipasaka na atonyelezwe idada, aje umiwi yananganya awawapapwe awahwande awashilume apotwe huwa khante, awaIsraeli.
29 Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile.
Ihali lweteho aje wahashilile pahati yi isumbi ya shamu aje mahali pumu. Awamisri lwawahajezya ashile wahamililwe.
30 Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.
Ihali lwetiho aje uluwumba wa Yeriko wahagwiye pasi, wahazwongolile isiku saba.
31 Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
Ihali lweteho aje u Rahabu ula umalaya sanga ahangamie peka na wala wasanga wahali wagolosu, ahawaopesheye wawahezele ahwenyelezye ahawa wehsele pinza,
32 Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma,
Injanje zwoni hani? Amasala sanga gakwela ayanje u Gidioni, u Barak, u Samsoni, u Yeftha, u Daudi, u Samweli na awakuwa,
33 ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm.
aje ashilile ulweteho wahazimenile umwene wahawombile ihaki na wahaposheye ulusuwelo, wahazinjile amalomu gihanu,
34 Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ.
wahazimile ingovu zwonti zi moto wahaponjele uwonji wipanga wahapona afume hu mpungo, wahali wadandamazu iwho wahezele awalogo awajenu wahashembeye.
35 Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma.
Awashe wahaposhe awafyewao hwidala la ufufulwe. Awamo wahalawile, saga waheteshe aleshwe shinza aje wawaje uzyoswo amwinza hani.
36 E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ.
Awamo wahalawile, wahasoshele, wahashetwilwe, nantele wahapinywilwe mwijela.
37 A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ.
Wahakhomilwa amawe. Wahawolilwe. Mentu mentu. Wahabudilwe nu panga. Wahajendanga namakwembe gingole na makwembe gi mbuzi ewo wahazanga, wahawalanga shawavyaleye wahawombwelwanga amawiwi
38 Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu.
(ewo munsi sagabhahazwanga awe nao), wahaziongolaga ziongolanga mwihombe, mwigamba, magwenya, mmagondi igamusni.
39 A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa.
Lelo awantu wonti ewo Ungolobhe ahawenteshe wahali nulweteho, sagawahaposheye indangano.
40 Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.
Ungolobhe ahalongeye hutupele ahantu ahiza, aje bilaante sangawawajie.

< Ndị Hibru 11 >