< Ndị Hibru 10 >
1 Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke.
For in the law there was a shadow of the good things to come; not the substance of the things themselves. Therefore, although the same sacrifices were every year offered, they could never perfect those who offered them.
2 Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha.
For, if they had perfected them, they would long ago have desisted from their offerings; because their conscience could no more disquiet them, who were once purified, on account of their sins.
3 Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile.
But in those sacrifices, they every year recognized their sins.
4 Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
For the blood of bulls and of goats cannot purge away sins.
5 Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.
Therefore, when entering the world, he said: In sacrifices and oblations, thou hast not had pleasure; but thou hast clothed me with a body.
6 Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị.
And holocausts on account of sins, thou hast not asked.
7 Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’”
Then I said: Behold I come, as it is written of me in the beginning of the books, to do thy pleasure, O God.
8 O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị).
He first said: Sacrifices and oblations and holocausts for sins, which were offered according to the law, thou desiredst not;
9 O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.
and afterwards he said: Behold I come to do thy pleasure, O God: hereby, he abolished the former, that he might establish the latter.
10 Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.
For by this his pleasure, we are sanctified; through the offering of the body of Jesus the Messiah a single time.
11 Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie.
For every high priest who stood and ministered daily, offered again and again the same sacrifices, which never were sufficient to purge away sins.
12 Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke.
But this Priest offered one sacrifice for sins, and for ever sat down at the right hand of God;
13 Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
and thenceforth waited, until his foes should be placed as a footstool under his feet.
14 Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile.
For by one offering, he hath perfected for ever, them who are sanctified by him.
15 Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo:
And the Holy Spirit also testifieth to us, by saying:
16 “Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.”
This is the covenant which I will give them after those days, saith the Lord; I will put my law into their minds, and inscribe it on their hearts;
17 O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.”
and their iniquity and their sins, I will not remember against them.
18 Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
Now, where there is a remission of sins, there is no offering for sin demanded.
19 Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,
We have therefore, my brethren, assurance in entering into the sanctuary, by the blood of Jesus, and by a way of life,
20 bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya,
which he hath now consecrated for us, through the veil, that is his flesh.
21 ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,
And we have a high priest over the house of God.
22 ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.
Let us, therefore draw near, with a true heart, and with the confidence of faith, being sprinkled as to our hearts, and pure from an evil conscience, and our body being washed with pure water.
23 Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
And let us persevere in the profession of our hope, and not waver; for he is faithful who hath made the promise to us.
24 Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.
And let us look on each other, for the excitement of love and good works.
25 Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
And let us not forsake our meetings, as is the custom of some; but entreat ye one another; and the more, as ye see that day draw near.
26 Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.
For if a man sin, voluntarily, after he hath received a knowledge of the truth, there is no longer a sacrifice which may be offered for sins:
27 Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
but the fearful judgment impendeth, and the zeal of fire that consumeth the adversaries.
28 Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya.
For if he, who transgressed the law of Moses, died without mercies, at the mouth of two or three witnesses;
29 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?
how much more, think ye, will he receive capital punishment, who hath trodden upon the Son of God, and hath accounted the blood of his covenant, by which he is sanctified, as the blood of all men, and hath treated the Spirit of grace with contumely?
30 Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
For we know him who hath said, Retribution is mine; and I will repay: and again, The Lord will judge his people.
31 Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.
It is very terrible, to fall into the hands of the living God.
32 Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.
Therefore, recollect ye the former days, those in which ye received baptism, and endured a great conflict of sufferings, with reproach and affliction;
33 Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso.
and ye were a gazing stock, and also were the associates of persons who endured these things:
34 Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.
and ye were grieved for those who were imprisoned; and ye cheerfully endured the plundering of your goods, because ye knew that ye had a possession in heaven, superior and not transitory.
35 Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
Therefore cast not away your assurance which is to have a great reward.
36 Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa.
For ye have need of patience; that ye may do the pleasure of God, and may receive the promise.
37 Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.”
Because, yet a little, and it is a very little time, when he that cometh, will come, and will not delay.
38 Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”
Now the just by my faith, will live: but if he draw back, my soul will not have pleasure in him.
39 Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.
But we are not of that drawing-back, which leadeth to perdition; but of that faith, which maketh us possess our soul.