< Ndị Hibru 1 >

1 Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
Nyakati syasilotili K'yara alongelili ni bhakhoko bhitu kupetela manabii mara simehele ni kwa njela simehele.
2 Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. (aiōn g165)
Lakini kwa magono agha ghatujhe nakhu agha, K'yara alongili natu kup'etela Mwana, ambajhe ambekhili kujha mrithi ghwa fenu fyoha ni ambajhe kup'etela muene kabhele abhombili bhulimwengu. (aiōn g165)
3 Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
Mwanamunu ndo nuru jha bhutukufu bhwa muene, tabia jhiene jha asili jha muene, na jhaijhendelesya fenu fyoha kwa lilobhi lya nghofu sya muene. Baada jha kukamilisya bhutakasu bhwa dhambi, atamili pasi kibhoko kya kulia kya enzi okhu kunani.
4 Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
Ajhele bora kuliko malaika, kama vile lihina lyaalirithili lyalijhele linofu nesu kuliko lihina lya bhebhe.
5 Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
Kwa ndabha ni kwa malaika bhalokhi bhabhabhwajhili kujobha, “Bhebhe ndo mwanabhangu?” Ni kabhele, “Nibetakujha dadi kabhele kwa muene, ni muene ibetakujha muana kwa nene?”
6 Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
Kabhele, wakati K'yara andetili mzalibhwa bhwa kubhwandelu paulimwengu, wijobha, “Malaika bhoha bha K'yara lazima bhamwabuduajhi.”
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
Kuhusu malaika ijobha, “Muene jha ibhomba malaika bha muene kujha roho, ni bhatumishi bha muene kujha ndimisya muoto.”
8 Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. (aiōn g165)
Lakini kuhusu Mwana ijobha, “Kiti kya jhobhi kya enzi, K'yara, ndo kya milele ni milele. Ndonga jha ufalme bhwa jhobhi ndo ndonga jha haki. (aiōn g165)
9 Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
Uganili haki ni kujhidadila uvunjaji bhwa sheria, henu K'yara, K'yara ghwa jhobhi, akubakili mafuta gha furaha kuliko bhajhinu.”
10 Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
Kubhwandelu okhu, Bwana, abhekhili misingi ghya dunia. Mbingu ndo mahengu gha mabhokho gha jhobhi.
11 Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
Sibetakubhoka, lakini bhebhe wibetakujhendelela. Syoha sibetakufubha kama liguanda.
12 Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Wibetakusikunjakunja kama likoti, nisyene sibetakubadilika kama liguanda. Lakini bhebhe ndo jhola jhola, ni miaka ghya bhebhe ghibetalepi kujha ni mwishu.”
13 O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
Lakini kwa malaika jholekhu K'yara ajobhili wakati bhubhuoha, “Tamayi kibhoko kya nene kya kulia mpaka panibeta kubhabhomba adui bha jhobhi kujha kiti kya magolo gha jhobhi”?
14 Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?
Je, malaika bhoha roho lepi syasilaghisibhu kubhahudumila ni kubhatunza bhala bhabhibeta kubhurithi bhwokovu?

< Ndị Hibru 1 >