< Ndị Hibru 1 >
1 Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
天主在古時,曾多次並以多種方式,藉著先知對我們的祖先說過話;
2 Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. (aiōn )
但在這末期內,衪藉著自己的兒子對我們說了話。天主立了衪為萬有的承繼者,並藉著衪造成了宇宙。 (aiōn )
3 Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
衪是天主光榮的反映,是天主本體的真像,以自己大能的話支撐萬有;當衪滌除了罪惡之後,便在高天上坐於「尊威」的右邊。
4 Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
衪所承受的名字既然超越眾天使的名字,所以衪遠超過眾天使之上。
5 Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
天主曾向那一位天使說過:『你是我的兒子,我今日生了你﹖』或說過:『我要作衪的父親,衪要作我的兒子﹖』
6 Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
再者,當天主引領首生子進入世界的時候,又說:『天主的眾天使都要崇拜衪。』
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
論到天使固然說過:『天主使自己的天使為風,使自己的僕役為火燄。』
8 Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. (aiōn )
可是,論到自己的兒子卻說:『天主,你的御座,永遠常存,你治國的權杖,是公正的權杖。 (aiōn )
9 Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
你愛護正義,憎恨不法;為此天主,你的天主,用歡愉的油傅了你,勝過你的伴侶。』
10 Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
又說:『上主,你在起初但但奠定了下地上天是你手的功績;
11 Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
諸天必要毀滅,而你永遠存在;萬物必要如同衣裳一樣破壞。
12 Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
你將它們捲起好似外套,它門必如衣服,都要變換更新;但是你卻永存不變,你的壽命無盡無限。』
13 O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
又向那一位天使說過:『你坐在我右邊,等我使你的仇敵,變作你腳下的踏板﹖』
14 Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?
眾天使豈不都是奉職的神被派遣給那些要承受救恩的人服務嗎﹖