< Hegai 2 >
1 nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị:
I KA la iwakaluakumamakahi o ka malama ahiku, hiki mai la ka olelo a Iehova ma o Hagai la ke kaula, i ka i ana mai,
2 “Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị:
E olelo aku oe ia Zerubabela ke keiki a Saletiela, ke kiaaina o Iuda, a ia Iosua ke keiki a Iosedeka, ke kahuna nui, a i ke koena o kanaka, i ka i ana aku,
3 ‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.
Owai o oukou e koe, nana i ike i kela luakini me kona nani mua? pehea oukou i ike ai i keia, ano, aole anei ia ma ko oukou maka me he mea ole la?
4 Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
Aka, i nui hoi ka ikaika ou, e Zerubabela, wahi a Iehova; i nui hoi ka ikaika ou, e Iosua, e ke keiki a Iosedeka, ke kahuna nui; i nui hoi ka ikaika o oukou, e na kanaka a pau o ka aina nei, a e hana hoi, wahi a Iehova; no ka mea, me oukou pu hoi au, wahi a Iehova o na kaua.
5 ‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
E like me ka berita a'u i hoopaa aku ai me oukou, ia oukou i puka ai mai Aigupita mai, pela hoi e noho ai kuu Uhane iwaena o oukou; mai makau oukou.
6 “Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.
No ka mea, penei ka i ana mai a Iehova, ke Akua o na kaua; I kekahi manawa aku, he liuliu iki ia, a e hoonaue au i ka lani a me ka honua, i ke kai a me ka aina maloo;
7 Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
A e hoonaue hoi au i na lahuikanaka a pau, a e hele mai auanei ka mea i makemakeia e na lahuikanaka a pau, a e hoopiha auanei au i keia hale i ka nani, wahi a Iehova o na kaua.
8 ‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
No'u no ke kala, no'u hoi ke gula, wahi a Iehova o na kaua.
9 ‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
E oi auanei ka nani o keia hale hope imua o ko ka mua, wahi a Iehova o na kaua; a ma keia wahi hoi e haawi aku no wau i ka maluhia, wahi a Iehova o na kaua.
10 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai.
I ka la iwakaluakumamaha o ka iwa o ka malama, i ka lua o ka makahiki o Dariu, hiki mai la ka olelo a Iehova ma o Hagai la ke kaula, i ka i ana mai,
11 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
Penei ka Iehova o na kaua e olelo mai nei, E ninau aku oe i na kahuna no ke kanawai, penei,
12 Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”
Ina e lawelawe kekahi i ka io laa ma ke kihi o kona aahu, a hoopa aku kona kihi i ka berena, i ka io hoolapalapa paha, a i ka waina, a i ka aila paha, a i kekahi mea ai e ae, e laa no anei ia? Hoole mai la na kahuna, i mai la, Aole.
13 Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”
Alaila i aku la o Hagai, Ina i haumia kekahi i ke kupapau, a hoopa aku ia i kekahi o keia mau mea, e haumia anei ia mea? Pane mai la na kahuna, i mai la, E haumia no.
14 Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
Olelo aku la o Hagai, i aku la, Pela no keia poe kanaka, a pela keia lahuikanaka imua o'u, wahi a Iehova: a pela hoi ka hana a pau a ko lakou lima; a o ka mea a lakou e mohai mai ai ilaila, he haumia ia.
15 “‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Nolaila hoi, e noonoo pono oukou mai keia la e noho nei a hiki i ka wa mamua, i ka wa i kau ole ia'i ka pohaku maluna o kekahi pohaku ma ka luakini o Iehova.
16 Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.
Mai ia manawa, ina hele aku kekahi i ka puu hua ai he iwakalua na ana ona, a loaa he umi; a i hele aku hoi kekahi i kahi kaomi waina e hookahe ai i na ana he kanalima mailoko mai o ke kaomi waina, a loaa iho he iwakalua wale no.
17 Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
Hahau aku la au ia oukou i ka maloo a me ka popo, a me ka huahekili ma na hana a pau a ko oukou mau lima; aka, aole o oukou i huli mai i o'u nei, wahi a Iehova.
18 ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Chezienụ echiche banyere ya.
E noonoo oukou mai keia la e noho nei a mamua aku, mai ka la iwakaluakumamaha o ka malama aiwa, a hiki i kela la i hookumuia'i ka luakini o Iehova; e noonoo oukou.
19 Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’”
Ua koe anei ka hua ai iloko ka halepapaa? Eia hoi, aole ka waina, a me ka fiku, a me ka pomegerane, a me ka laau oliva i hua mai i ka hua: mai keia la aku nae, e hoomaikai aku no wau ia oukou.
20 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị,
Hiki hou mai la ka olelo a Iehova ia Hagai i ka la iwakaluakumamaha o ua malama la, i ka i ana mai,
21 “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.
E i aku oe ia Zerubabela ke kiaaina o Iuda, penei, E hoonaue ana au i ka lani a me ka honua;
22 Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.
A e hookahuli au i ka nohoalii o na aupuni, a e hoolilo au i ka ikaika o na aupuni kanaka e i mea ole; e hookahuli hoi au i na halekaa a me ka poe holo maloko; a e haule iho auanei na lio a me na hoohololio, o kela mea keia mea o lakou, i ka pahikaua a kona hoahanau.
23 “‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”
Ia la hoi, wahi a Iehova o na kaua, e lawe au ia oe, e Zerubabela ke keiki a Saletiela, o ka'u kauwa, wahi a Iehova, a e hoolike au ia oe me ke komolima hoopili wepa; no ka mea, ua koho au ia oe, wahi a Iehova o na kaua.