< Habakuk 3 >

1 Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
Pemphero la mneneri Habakuku potsata mayimbidwe a Sigionoti.
2 Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
Inu Yehova, ndamva za kutchuka kwanu; Inu Yehova, ntchito zanu zandiopsa. Muzichitenso masiku athu ano, masiku athu ano zidziwike; mu ukali wanu mukumbukire kuchita chifundo.
3 Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. (Sela) Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
Mulungu anabwera kuchokera ku Temani, Woyerayo kuchokera ku Phiri la Parani. (Sela) Ulemerero wake unaphimba mlengalenga ndipo dziko lapansi linadzaza ndi matamando ake.
4 Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
Kuwala kwa ulemerero wake kunali ngati kutuluka kwa dzuwa; kunyezimira kunkatuluka mʼdzanja lake, mʼmene anabisamo mphamvu zake.
5 Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
Patsogolo pake pankagwa mliri; nthenda yoopsa inkagwa kumbuyo kwake.
6 O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
Iye anayimirira ndi kugwedeza dziko lapansi; anayangʼana ndipo mitundu ya anthu inanjenjemera. Mapiri okhazikika anagumuka ndipo zitunda zakalekale zinatitimira. Njira zake ndi zachikhalire.
7 Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
Ndinaona matenti a ku Kusani ali pa mavuto, mokhala a ku Midiyani muli ululu waukulu.
8 Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
Inu Yehova, kodi munakwiyira mitsinje? Kodi munakalipira timitsinje? Kodi munapsera mtima nyanja pamene munakwera pa akavalo anu ndiponso magaleta anu achipulumutso?
9 I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. (Sela) I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
Munasolola uta wanu mʼchimake, munayitanitsa mivi yambiri. (Sela) Munagawa dziko lapansi ndi mitsinje;
10 Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
mapiri anakuonani ndipo anagwedezeka. Madzi amphamvu anasefukira; nyanja yozama inakokoma ndipo mafunde ake anakwera kwambiri.
11 Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
Dzuwa ndi mwezi zinayima chilili mlengalenga, pa kungʼanima kwa mivi yanu yowulukayo, pa kunyezimira kwa mkondo wanu.
12 I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
Munayendayenda mʼdziko lapansi muli ndi ukali, ndipo munapondereza mitundu ya anthu muli ndi mkwiyo.
13 Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
Munapita kukalanditsa anthu anu, kukapulumutsa wodzozedwa wanu. Munakantha mtsogoleri wa dziko la anthu oyipa, munawononga anthu ake onse. (Sela)
14 Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
Ndi mkondo wake womwe munalasa mtsogoleri wake pamene ankhondo ake anabwera mwamphamvu kudzatibalalitsa, ankasangalala ngati kuti akudzawononga osauka amene akubisala.
15 Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
Munapondaponda pa nyanja ndi akavalo anu, kuvundula madzi amphamvu.
16 Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
Ndinamva ndipo mtima wanga unagunda kwambiri, milomo yanga inanjenjemera pakumva phokosolo; mafupa anga anaguluka, ndipo mawondo anga anawombana. Komabe ndikuyembekezera mofatsa, tsiku la masautso limene lidzafike pa mtundu wa anthu umene ukutithira nkhondo.
17 A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
Ngakhale mtengo wa mkuyu usachite maluwa, ndipo mipesa ikhale yopanda mphesa. Ngakhale mitengo ya olivi isabereke zipatso, ndipo mʼminda musatuluke kanthu. Ngakhale nkhosa ndi ngʼombe zithe mʼkhola,
18 mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
komabe ine ndidzakondwera mwa Yehova, ndidzasangalala mwa Mulungu Mpulumutsi wanga.
19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.
Ambuye Yehova ndiye mphamvu yanga; amalimbitsa miyendo yanga ngati ya mbawala yayikazi, amandithandiza kukafika pamwamba pa phiri. Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Pa zoyimbira za nsambo.

< Habakuk 3 >