< Habakuk 1 >

1 Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.
La carga que vio Habacuc profeta.
2 Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta?
¿Hasta cuándo, oh SEÑOR, clamaré, y no oirás; y daré voces a ti a causa de la violencia, y no salvarás?
3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.
¿Por qué me haces ver iniquidad, y haces que mire molestia, y destrucción y violencia delante de mí, habiendo además quien levante pleito y contienda?
4 Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.
Por lo cual la ley es debilitada, y el juicio no sale verdadero; por cuanto el impío asedia al justo, por eso sale torcido el juicio.
5 “Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
Mirad entre los gentiles, y ved, y maravillaos pasmosamente; porque obra será hecha en vuestros días, que aun cuando se os contare, no la creeréis.
6 Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
Porque he aquí, yo levanto a los caldeos, gente amarga y presurosa, que camina por la anchura de la tierra para poseer las habitaciones ajenas.
7 Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu. Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme. Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
Espantosa es y terrible; de ella misma saldrá su derecho y su grandeza.
8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
Y serán sus caballos más ligeros que tigres, y más agudos que lobos de tarde; y sus jinetes se multiplicarán; vendrán de lejos sus caballeros, y volarán como águilas que se apresuran a la comida.
9 Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
Toda ella vendrá a la presa; delante de sus caras viento solano; y juntará cautivos como arena.
10 Ha na-akwa ndị eze emo, jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị. Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị, na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.
Y él escarnecerá de los reyes, y de los príncipes hará burla; él se reirá de toda fortaleza, y amontonará polvo, y la tomará.
11 Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
Entonces él se ensoberbecerá contra Dios, y pasará adelante, y ofenderá atribuyendo ésta su potencia a su dios.
12 Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
¿No eres tú desde el principio, oh SEÑOR, Dios mío, Santo mío? No moriremos oh SEÑOR, para juicio lo pusiste; y fuerte lo fundaste para castigar.
13 Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
Limpio eres de ojos para no ver el mal, ni puedes ver el agravio; ¿por qué ves a los menospreciadores, y callas cuando destruye el impío al más justo que él.
14 I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
Y haces que sean los hombres como los peces del mar, como reptiles que no tienen señor?
15 Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
Sacará a todos con su anzuelo, los cogerá con su malla, y los juntará en su red; por lo cual se regocijará y hará alegrías.
16 Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma
Por esto hará sacrificios a su malla, y ofrecerá sahumerios a su red; porque con ellos engordó su porción, y engrasó su comida.
17 Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
¿Vaciará por eso su red, o tendrá piedad de matar gentiles continuamente?

< Habakuk 1 >