< Jenesis 8 >

1 Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.
Ọlọ́run sì rántí Noa àti ohun alààyè gbogbo tí ó wà pẹ̀lú rẹ̀, bí àwọn ẹranko igbó àti ohun ọ̀sìn, ó sì mú kí afẹ́fẹ́ fẹ́ sórí ilẹ̀, omi náà sì fà.
2 A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.
Gbogbo ìsun ibú àti fèrèsé ìṣàn ọ̀run tì, òjò pẹ̀lú sì dáwọ́ rírọ̀ dúró.
3 Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.
Omi sì bẹ̀rẹ̀ sí ní gbẹ kúrò lórí ilẹ̀, lẹ́yìn àádọ́jọ ọjọ́, ó sì ti ń fà.
4 Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
Ní ọjọ́ kẹtàdínlógún oṣù kejì ni ọkọ̀ náà gúnlẹ̀ sórí òkè Ararati.
5 Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
Omi náà sì ń gbẹ si títí di oṣù kẹwàá. Ní ọjọ́ kìn-ín-ní oṣù kẹwàá, orí àwọn òkè sì farahàn.
6 Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
Lẹ́yìn ogójì ọjọ́, Noa sí fèrèsé tí ó ṣe sára ọkọ̀.
7 site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
Ó sì rán ẹyẹ ìwò kan jáde, tí ó ń fò káàkiri síwá àti sẹ́yìn títí omi fi gbẹ kúrò ní orí ilẹ̀.
8 Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,
Ó sì rán àdàbà kan jáde láti wò ó bóyá omi ti gbẹ kúrò lórí ilẹ̀.
9 ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ.
Ṣùgbọ́n àdàbà náà kò rí ìyàngbẹ ilẹ̀ bà lé nítorí omi kò tí ì tan lórí ilẹ̀, ó sì padà sọ́dọ̀ Noa. Noa na ọwọ́ rẹ̀ jáde ó sì mú ẹyẹ náà wọlé sọ́dọ̀ ara rẹ̀ nínú ọkọ̀.
10 Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụrụ nduru ahụ ọzọ
Ó sì dúró fún ọjọ́ méje sí i; ó sì tún rán àdàbà náà jáde láti inú ọkọ̀.
11 Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala.
Nígbà tí àdàbà náà padà sọ́dọ̀ rẹ̀ ní àṣálẹ́, ó já ewé igi olifi tútù há ẹnu! Nígbà náà ni Noa mọ̀ pé omi ti ń gbẹ kúrò lórí ilẹ̀.
12 Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ.
Noa tún mú sùúrù fún ọjọ́ méje, ó sì tún rán àdàbà náà jáde, ṣùgbọ́n àdàbà náà kò padà sọ́dọ̀ rẹ̀ mọ́.
13 Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.
Ní ọjọ́ kìn-ín-ní oṣù kìn-ín-ní, ní ọdún kọ́kànlélẹ́gbẹ̀ta ni omi náà gbẹ kúrò lórí ilẹ̀; Noa sì ṣí ọkọ̀, ó sì ri pé ilẹ̀ ti gbẹ.
14 Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.
Ní ọjọ́ kẹtàdínlọ́gbọ̀n oṣù kejì, ilẹ̀ ti gbẹ pátápátá.
15 Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,
Nígbà náà ni Ọlọ́run wí fún Noa pé.
16 “Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
“Jáde kúrò nínú ọkọ̀, ìwọ àti aya rẹ, pẹ̀lú àwọn ọmọ rẹ àti àwọn aya wọn.
17 Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”
Kó gbogbo àwọn ẹ̀dá alààyè tí ó wà pẹ̀lú rẹ jáde: àwọn ẹyẹ, ẹranko àti gbogbo àwọn ẹ̀dá tí ń rìn nílẹ̀, kí wọn lè bí sí i, kí wọn sì pọ̀ sí i, kí wọn sì máa gbá yìn lórí ilẹ̀.”
18 Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya.
Noa, àwọn ọmọ rẹ̀, aya rẹ̀ àti àwọn aya ọmọ rẹ̀ sì jáde.
19 Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.
Gbogbo àwọn ẹranko àti àwọn ẹ̀dá tí ń rìn nílẹ̀ àti gbogbo ẹyẹ pátápátá ni ó jáde kúrò nínú ọkọ̀, ní ọ̀wọ̀ọ̀wọ́ ní irú tiwọn.
20 Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.
Noa sì mọ pẹpẹ fún Olúwa, ó sì mú lára àwọn ẹran tí ó mọ́ àti ẹyẹ tí ó mọ́, ó sì fi rú ẹbọ sísun lórí pẹpẹ.
21 Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.
Olúwa sì gbọ́ òórùn dídùn; ó sì wí ní ọkàn rẹ̀ pé, “Èmi kì yóò tún fi ilẹ̀ ré nítorí ènìyàn mọ, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé gbogbo èrò inú rẹ̀ jẹ́ ibi láti ìgbà èwe rẹ̀ wá, èmi kì yóò pa gbogbo ohun alààyè run mọ́ láé, bí mo ti ṣe.
22 “Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.”
“Níwọ́n ìgbà tí ayé bá sì wà, ìgbà ọ̀gbìn àti ìgbà ìkórè ìgbà òtútù àti ìgbà ooru, ìgbà ẹ̀ẹ̀rùn àti ìgbà òjò, ìgbà ọ̀sán àti ìgbà òru, yóò wà títí láé.”

< Jenesis 8 >

A Dove is Sent Forth from the Ark
A Dove is Sent Forth from the Ark