< Jenesis 7 >

1 Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
耶和华对挪亚说:“你和你的全家都要进入方舟;因为在这世代中,我见你在我面前是义人。
2 Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
凡洁净的畜类,你要带七公七母;不洁净的畜类,你要带一公一母;
3 na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
空中的飞鸟也要带七公七母,可以留种,活在全地上;
4 Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
因为再过七天,我要降雨在地上四十昼夜,把我所造的各种活物都从地上除灭。”
5 Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
挪亚就遵着耶和华所吩咐的行了。
6 Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
当洪水泛滥在地上的时候,挪亚整六百岁。
7 Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
挪亚就同他的妻和儿子儿妇都进入方舟,躲避洪水。
8 Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
洁净的畜类和不洁净的畜类,飞鸟并地上一切的昆虫,
9 oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
都是一对一对地,有公有母,到挪亚那里进入方舟,正如 神所吩咐挪亚的。
10 Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
过了那七天,洪水泛滥在地上。
11 Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
当挪亚六百岁,二月十七日那一天,大渊的泉源都裂开了,天上的窗户也敞开了,
12 Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
四十昼夜降大雨在地上。
13 Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
正当那日,挪亚和他三个儿子闪、含、雅弗,并挪亚的妻子和三个儿妇,都进入方舟。
14 Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.
他们和百兽,各从其类,一切牲畜,各从其类,爬在地上的昆虫,各从其类,一切禽鸟,各从其类,都进入方舟。
15 Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
凡有血肉、有气息的活物,都一对一对地到挪亚那里,进入方舟。
16 Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
凡有血肉进入方舟的,都是有公有母,正如 神所吩咐挪亚的。耶和华就把他关在方舟里头。
17 Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
洪水泛滥在地上四十天,水往上长,把方舟从地上漂起。
18 Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
水势浩大,在地上大大地往上长,方舟在水面上漂来漂去。
19 Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
水势在地上极其浩大,天下的高山都淹没了。
20 Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
水势比山高过十五肘,山岭都淹没了。
21 Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
凡在地上有血肉的动物,就是飞鸟、牲畜、走兽,和爬在地上的昆虫,以及所有的人,都死了。
22 Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
凡在旱地上、鼻孔有气息的生灵都死了。
23 Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
凡地上各类的活物,连人带牲畜、昆虫,以及空中的飞鸟,都从地上除灭了,只留下挪亚和那些与他同在方舟里的。
24 Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
水势浩大,在地上共一百五十天。

< Jenesis 7 >

The Great Flood
The Great Flood