< Jenesis 7 >
1 Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
Ndipo Yehova anati kwa Nowa, “Lowa mu chombo iwe ndi banja lako lonse, chifukwa ndaona kuti ndiwe wolungama mu mʼbado uwu.
2 Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
Pa mtundu uliwonse wa nyama zoti nʼkudya utengepo zazimuna zisanu ndi ziwiri ndi zazikazi zisanu ndi ziwirinso. Koma pa mtundu wa nyama iliyonse yosati nʼkudya utengepo zazimuna ziwiri ndi zazikazi ziwirinso.
3 na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
Chimodzimodzinso mbalame, utenge zisanu ndi ziwiri zazimuna ndi zisanu ndi ziwiri zazikazi za mtundu uliwonse kuti mitundu yawo isungike ndi moyo pa dziko lonse lapansi.
4 Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
Pakapita masiku asanu ndi awiri ndidzagwetsa mvula pa dziko lapansi kwa masiku makumi anayi usana ndi usiku ndipo ndidzawononga cha moyo chilichonse chimene ndinachipanga pa dziko lapansi.”
5 Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Ndipo Nowa anachita zonse zimene Yehova anamulamulira.
6 Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
Pamene chigumula chinabwera pa dziko lapansi Nowa anali ndi zaka 600.
7 Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
Ndipo Nowa, ana ake aamuna, mkazi wake, pamodzi ndi ana ake aakazi analowa mu chombo chija kuthawa madzi a chigumula.
8 Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
Nyama zoti nʼkudya ndi nyama zosadyedwa, mbalame, pamodzi ndi nyama zokwawa zonse zinadza kwa Nowa ziwiriziwiri ndi kulowa mʼchombomo.
9 oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
Ndipo Nowa anatenga ziwiriziwiri, yayimuna ndi yayikazi monga anamulamulira Mulungu.
10 Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
Patapita masiku asanu ndi awiri chigumula chinabwera pa dziko lapansi.
11 Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
Pa tsiku la 17 la mwezi wachiwiri, Nowa ali ndi zaka 600, akasupe onse akuya kwambiri anasefuka ndiponso zitseko za madzi akumwamba zinatsekuka.
12 Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Ndipo mvula inagwa pa dziko lapansi masiku makumi anayi usana ndi usiku.
13 Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
Linali tsiku lomwelo pamene Nowa ndi ana ake aamuna, Semu, Hamu ndi Yafeti, pamodzi ndi mkazi wake ndi akazi a ana ake atatu aja analowa mu chombo.
14 Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.
Iwowa analowa mʼchombomo pamodzi ndi nyama iliyonse ya kutchire monga mwa mtundu wake, ziweto zonse monga mwa mitundu yawo, nyama yokwawa iliyonse monga mwa mtundu wake ndi mbalame iliyonse monga mwa mtundu wake.
15 Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
Nowa analowa mu chombo muja pamodzi ndi zamoyo zonse.
16 Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
Iye analowa nazo zazimuna ndi zazikazi monga mmene Mulungu anamulamulira. Kenaka Yehova anatseka pa khomo.
17 Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
Chigumula chinagwa pa dziko la pansi kwa masiku makumi anayi. Madzi anayamba kuchuluka ndipo ananyamula chombo chija ndi kuchiyandamitsa pamwamba pa dziko.
18 Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
Madzi anafika mwamphamvu ndipo anachulukirachulukira pa dziko lapansi moti chombo chinayandama pamwamba pa madziwo.
19 Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
Madzi a chigumula anabwerabe molimbika motero kuti mapiri ataliatali onse a pa dziko anamizidwa.
20 Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
Madzi anakwera namiza mapiri kwa mamita pafupifupi asanu ndi awiri.
21 Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
Chamoyo chilichonse choyenda pa dziko lapansi chinafa: mbalame, ziweto, nyama zakuthengo, miyandamiyanda ya zonse zolengedwa za pa dziko lapansi pamodzi ndi anthu.
22 Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
Chilichonse chamoyo, chokhala pa mtunda chinafa.
23 Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
Chamoyo chilichonse pa dziko lapansi chinawonongedwa, kuyambira munthu, nyama, zokwawa ndi mbalame. Nowa yekha ndiye anatsala pamodzi ndi onse amene anali naye.
24 Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
Madziwo anadzaza dziko lonse lapansi kwa masiku 150.