< Jenesis 6 >
1 Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom,
People started to increase in number and spread out across the earth. Daughters were born to them,
2 ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.
and the sons of God saw that these women were beautiful, and they took whichever ones they wanted.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”
Then the Lord said, “My life-giving Spirit will not remain in these people forever, because they are only mortal. The time they have left will be 120 years.”
4 Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.
There were giants on earth in those days, and also later on. They were born after the sons of God slept with the daughters of these people. Their sons became the great warriors and famous men of ancient times.
5 Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.
The Lord saw how terribly evil people on earth had become—every single thought in their minds was evil all the time!
6 O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.
The Lord was sorry he'd made human beings to live on the earth; it made him very sad to think about it.
7 Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.”
So the Lord said, “I'm going to wipe out these people I created from the earth, and not only them but also the animals, the creatures that run along the ground, and the birds, because I'm sorry I made them.”
8 Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.
But the Lord was pleased with Noah.
9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
This is the story of Noah and his family. Noah was a man of integrity, living a moral life among the people of his time. He had a close relationship with God.
10 Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet.
Noah had three sons: Shem, Ham, and Japheth.
11 Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
God saw how corrupt the whole world had become, full of violent and lawless people.
12 Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.
God recognized that the corruption in the world was due to everyone on earth living corrupt lives.
13 Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
So God told Noah, “I have decided to put an end to all people on earth because they are all violent and lawless. I myself am going to destroy all of them, along with the earth.
14 Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
Build an ark out of cypress wood. Make rooms inside the ark, and coat it with tar, both inside and out.
15 Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.
This is how to build it: the ark is to measure 300 cubits long, 50 cubits wide, and 30 cubits high.
16 Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.
Make a roof for the ark, leaving a cubit-wide opening between the roof and the top of the sides. Put a door in the side of the ark, and construct three decks inside.
17 Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
I myself am going to flood the earth with water that will destroy everything that breathes, Every living thing everywhere on earth will die.
18 Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
But I will keep my agreement with you. You are to go into the ark, taking with you your wife and your sons and their wives.
19 Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.
Take a pair, male and female, of every kind of animal into the ark and make sure you keep them alive.
20 Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.
The same applies to every kind of bird, livestock, and the creatures that run along the ground—a pair of every kind will come to you so they can be kept alive.
21 Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”
Take all kinds of food with you too. Store it so you and the animals will have enough to eat.”
22 Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
Noah did exactly what God ordered him to do.