< Jenesis 50 >

1 Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ.
And Joseph fell upon the face of his father, and wept upon him and kissed him.
2 Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
Then Joseph commanded his servants the physicians, to embalm his father, —so the physicians embalmed Israel.
3 O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
And they fulfilled for him forty days, for so, are they wont to fulfil the days of the embalmed, —and the Egyptians wept for him seventy days.
4 Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya,
And, when the days of weeping for him were passed, Joseph spake unto the house of Pharaoh saying, —If I pray you, I have found favour in your eyes, speak ye I pray you in the ears of Pharaoh saying:
5 ‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’”
My father, made me swear saying, —Lo! I, am about to die, —in my grave which I digged for myself in the land of Canaan, there, shalt thou bury me. Now, therefore, let me go up, I pray thee and bury my father, and return.
6 Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.”
And Pharaoh said, —Go up., and bury thy father according as he made thee swear.
7 Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt.
So Joseph went up. to bury his father, —and there went up with him all the servants of Pharaoh the elders of his house, and all the elders of the land of Egypt;
8 Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.
and all the house of Joseph, and his brethren, and the house of his father, —only their little ones and their flocks and their herds, left they. in the land of Goshen.
9 Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.
And there went up with him, both chariots and horsemen, —so it came to pass that, the company, was exceeding great,
10 Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.
And they came in, as far as the threshing-floor of the Buckthorn, which is beyond the Jordan, then wailed they there—an exceeding great and grievous wailing, —and he made for his father a mourning, of seven days.
11 Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim.
And when the dwellers in the land—the Canaanites—saw the mourning in the threshing-floor of the Buckthorn, they said, —A grievous mourning, this! for the Egyptians. For this cause, was the name thereof called Abel Mizraim, which is beyond the Jordan.
12 Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha.
And his sons did for him thus as he had commanded them;
13 Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre.
so his sons carried him to the land of Canaan, and buried him in the cave of the field of Machpelah, —which Abraham bought—with the field—for a possession of a buryingplace from Ephron the Hittite over against Mamre.
14 Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya.
Then Joseph returned to Egypt he and his brethren and all who had been up with him to bury his father, —after he had buried his father.
15 Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?”
Now when the brethren of Joseph saw that their father was dead, they said—Oh! if Joseph should lie in wait for us, —and should return, to us, all the evil wherewith we requited him!
16 Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ.
So they sent in charge unto Joseph saying, —Thy father, gave command before he died saying:
17 ‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa.
Thus, shall ye say to Joseph—Ah now! do forgive we pray thee the transgression of thy brethren and their sin in that with evil, they requited thee. Now, therefore grant forgiveness we pray thee, for the transgression of the servants of the God of thy father! And Joseph wept when they spake unto him.
18 Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.”
Then went his brethren also, and fell down before him, —and said, Behold us! thine for servants.
19 Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ?
And Joseph said unto them—Do not fear, —although in place of God, I am.
20 Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
Ye, indeed, planned against me, evil, —God, planned it, for good, for the sake of doing, as at this day, to save alive much people.
21 Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.
Now, therefore do not fear! I will nourish you and your little ones. Thus he consoled them, and spake unto their heart.
22 Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri.
And Joseph abode in Egypt, he, and his father’s house, —and Joseph lived a hundred and ten years.
23 Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.
And Joseph saw Ephraim’s, sons of three generations—moreover the sons of Machir, son of Manasseh, were born upon Joseph’s knees.
24 Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.”
Then said Joseph unto his brethren, I, am about to die, —but God will surely concern, himself for you, so will he take you up out of this land, into the land which he sware to Abraham to Isaac and to Jacob.
25 Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.”
Then Joseph made the sons of Israel swear saying, —God will, surely concern, himself for you, So shall ye carry up my bones, from hence.
26 Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.
So Joseph died, being a hundred and ten years old, —and they embalmed him, and put him in a coffin in Egypt.

< Jenesis 50 >