< Jenesis 5 >

1 Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
Hii ni orodha ya vizazi vya Adamu. Katika siku ambayo Mungu alimuumba mtu, aliwaumba katika mfano wake mwenyewe.
2 O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
Mwanaume na mwanamke aliwaumba. Akawabariki na akawaita Adam wakati walipoumbwa.
3 Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
Wakati Adamu alipokuwa ameishi miaka 130, akamzaa mwana katika sura yake mwenyewe, kwa mfano wake, na akamuita jina lake Sethi.
4 Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya Adamu kumzaa Sethi, aliishi miaka mia nane. Akawazaa wana wengi waume na wake.
5 Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
Adamu akaishi miaka 930 kisha akafariki.
6 Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
Wakati Sethi alipokuwa ameishi miaka 105, akamzaa Enoshi.
7 Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Enoshi, akaishi miaka 807 na akawazaa wana wengi waume na wake.
8 Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
Sethi akaishi miaka 912 kisha akafariki.
9 Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
Wakati Enoshi alipokuwa ameishi miaka tisini, akamzaa Kenani.
10 Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Kenani, Enoshi aliishi miaka 815. Akazaa wana wengi wa ume na wake.
11 Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
Enoshi aliishi miaka 905 na kisha akafariki.
12 Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
Wakati Kanani alipokuwa ameishi miaka sabini, akamzaa Mahalaleli.
13 Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Mahalaleli, Kenani aliishi miaka 840. Akawazaa wana wengi wa ume na wake.
14 Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
Kenani aliishi miaka 910, na kisha akafariki.
15 Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
Mahalaleli alipokuwa ameishi miaka sitini na tano, alimzaa Yaredi.
16 Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Yaredi, Mahalaleli aliishi miaka 830. Akazaa wana wengi wa ume na wake.
17 Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
Mahalaleli aliishi miaka 895 na kisha akafariki.
18 Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
Yaredi alipokuwa ameishi miaka 162, alimzaa Henoko.
19 Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Henoko, Yaredi aliishi miaka mianane. Akazaa wana wengi waume na wake.
20 Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
Yaredi aliishi miaka 962 na kisha akafariki.
21 Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
Henoko alipokuwa ameishi miaka sitini na tano, akamzaa Methusela.
22 Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Henoko akaenenda na Mungu miaka miatatu baada ya kumzaa Methusela. Aliwazaa wana wengi wa ume na wake.
23 Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
Henoko aliishi miaka 365.
24 Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
Henoko alienenda na Mungu, na kisha alitoweka, kwa kuwa Mungu alimtwaa.
25 Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
Wakati Methusela alipokuwa ameishi miaka 187, alimzaa Lameki.
26 Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Baada ya kumzaa Lameki, Methusela aliishi miaka 782. Akawazaa wana wengi wa ume na wake.
27 Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
Methusela aliishi miaka 969. Kisha akafariki.
28 Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
Wakati Lameki alipokuwa ameishi miaka 182, alimzaa mwana.
29 Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
Akamuita jina lake Nuhu, akisema, “Huyu ndiye atatupatia pumziko kutoka katika kazi yetu na kutoka katika kazi ya taabu ya mikono yetu, ambayo lazima tuifanye kwa sababu ya ardhi ambayo Yahwe ameilaani.”
30 Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Lameki aliishi miaka 595 baada ya kumzaa baba wa Nuhu. Akazaa wanawengi wa ume na wake.
31 Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
Lameki aliishi miaka 777. Kisha akafariki.
32 Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
Baada ya Nuhu kuishi miaka miatano, akamzaa Shemu, Hamu, na Yafethi.

< Jenesis 5 >