< Jenesis 5 >
1 Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
亞當的後代記在下面。(當上帝造人的日子,是照着自己的樣式造的,
2 O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
並且造男造女。在他們被造的日子,上帝賜福給他們,稱他們為「人」。)
3 Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
亞當活到一百三十歲,生了一個兒子,形像樣式和自己相似,就給他起名叫塞特。
4 Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
亞當生塞特之後,又在世八百年,並且生兒養女。
5 Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
亞當共活了九百三十歲就死了。
6 Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
塞特活到一百零五歲,生了以挪士。
7 Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
塞特生以挪士之後,又活了八百零七年,並且生兒養女。
8 Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
塞特共活了九百一十二歲就死了。
9 Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
以挪士活到九十歲,生了該南。
10 Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
以挪士生該南之後,又活了八百一十五年,並且生兒養女。
11 Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
以挪士共活了九百零五歲就死了。
12 Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
該南活到七十歲,生了瑪勒列。
13 Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
該南生瑪勒列之後,又活了八百四十年,並且生兒養女。
14 Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
該南共活了九百一十歲就死了。
15 Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
瑪勒列活到六十五歲,生了雅列。
16 Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
瑪勒列生雅列之後,又活了八百三十年,並且生兒養女。
17 Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
瑪勒列共活了八百九十五歲就死了。
18 Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
雅列活到一百六十二歲,生了以諾。
19 Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
雅列生以諾之後,又活了八百年,並且生兒養女。
20 Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
雅列共活了九百六十二歲就死了。
21 Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
以諾活到六十五歲,生了瑪土撒拉。
22 Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
以諾生瑪土撒拉之後,與上帝同行三百年,並且生兒養女。
23 Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
以諾共活了三百六十五歲。
24 Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
以諾與上帝同行,上帝將他取去,他就不在世了。
25 Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
瑪土撒拉活到一百八十七歲,生了拉麥。
26 Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
瑪土撒拉生拉麥之後,又活了七百八十二年,並且生兒養女。
27 Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
瑪土撒拉共活了九百六十九歲就死了。
28 Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
拉麥活到一百八十二歲,生了一個兒子,
29 Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
給他起名叫挪亞,說:「這個兒子必為我們的操作和手中的勞苦安慰我們;這操作勞苦是因為耶和華咒詛地。」
30 Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
拉麥生挪亞之後,又活了五百九十五年,並且生兒養女。
31 Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
拉麥共活了七百七十七歲就死了。
32 Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
挪亞五百歲生了閃、含、雅弗。