< Jenesis 40 >

1 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.
Some time later, the king’s cupbearer and baker offended their master, the king of Egypt.
2 Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
Pharaoh was angry with his two officers, the chief cupbearer and the chief baker,
3 O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
and imprisoned them in the house of the captain of the guard, the same prison where Joseph was confined.
4 Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
The captain of the guard assigned them to Joseph, and he became their personal attendant. After they had been in custody for some time,
5 Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
both of these men—the Egyptian king’s cupbearer and baker, who were being held in the prison—had a dream on the same night, and each dream had its own meaning.
6 Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.
When Joseph came to them in the morning, he saw that they were distraught.
7 Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”
So he asked the officials of Pharaoh who were in custody with him in his master’s house, “Why are your faces so downcast today?”
8 Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”
“We both had dreams,” they replied, “but there is no one to interpret them.” Then Joseph said to them, “Don’t interpretations belong to God? Tell me your dreams.”
9 Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.
So the chief cupbearer told Joseph his dream: “In my dream there was a vine before me,
10 Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa.
and on the vine were three branches. As it budded, its blossoms opened and its clusters ripened into grapes.
11 Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.”
Pharaoh’s cup was in my hand, and I took the grapes, squeezed them into his cup, and placed the cup in his hand.”
12 Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ.
Joseph replied, “This is the interpretation: The three branches are three days.
13 Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya.
Within three days Pharaoh will lift up your head and restore your position. You will put Pharaoh’s cup in his hand, just as you did when you were his cupbearer.
14 Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.
But when it goes well for you, please remember me and show me kindness by mentioning me to Pharaoh, that he might bring me out of this prison.
15 Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
For I was kidnapped from the land of the Hebrews, and even here I have done nothing for which they should have put me in this dungeon.”
16 Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
When the chief baker saw that the interpretation was favorable, he said to Joseph, “I too had a dream: There were three baskets of white bread on my head.
17 Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
In the top basket were all sorts of baked goods for Pharaoh, but the birds were eating them out of the basket on my head.”
18 Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ.
Joseph replied, “This is the interpretation: The three baskets are three days.
19 Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”
Within three days Pharaoh will lift off your head and hang you on a tree. Then the birds will eat the flesh of your body.”
20 Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
On the third day, which was Pharaoh’s birthday, he held a feast for all his officials, and in their presence he lifted up the heads of the chief cupbearer and the chief baker.
21 O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ.
Pharaoh restored the chief cupbearer to his position, so that he once again placed the cup in Pharaoh’s hand.
22 Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
But Pharaoh hanged the chief baker, just as Joseph had described to them in his interpretation.
23 Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.
The chief cupbearer, however, did not remember Joseph; he forgot all about him.

< Jenesis 40 >