< Jenesis 38 >

1 Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.
Un notikās tanī laikā, ka Jūda no saviem brāļiem nogāja un apmetās pie kāda Adulamnieku vīra, Hīras vārdā.
2 Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya.
Un Jūda redzēja tur kāda Kanaāniešu vīra meitu, un viņa vārds bija Šua, un viņš to ņēma un gāja pie tās.
3 Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa
Un tā tapa grūta un dzemdēja dēlu un nosauca viņa vārdu Ģeru.
4 Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan.
Un tā tapa atkal grūta un dzemdēja dēlu un nosauca viņa vārdu Onanu.
5 Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.
Un tā dzemdēja vēl vienu dēlu un nosauca viņa vārdu Šelu, un viņš bija Ķezibā, kad tā to dzemdēja.
6 Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.
Un Jūda ņēma sievu priekš Ģera, sava pirmdzimtā, un viņas vārds bija Tamāre.
7 Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
Bet Ģers, Jūdas pirmdzimtais, bija ļauns Tā Kunga priekšā, tāpēc Tas Kungs to nokāva.
8 Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
Tad Jūda sacīja Onanam: ej pie sava brāļa sievas un ņem to sava brāļa vietā un cel dzimumu savam brālim.
9 Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
Bet Onans zinādams, ka tas dzimums viņam nepiederēs, pie sava brāļa sievas iedams, tam lika izgaist zemē, lai savam brālim nedotu dzimuma.
10 Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
Un Tam Kungam nepatika, ko viņš darīja, un viņš to arīdzan nokāva.
11 Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.
Tad Jūda sacīja uz savu vedeklu Tamāri: paliec atraitne sava tēva namā, tiekams Šelus, mans dēls, pieaug; jo viņš domāja: vai viņam arī nebūs jāmirst, kā viņa brāļiem. Un Tamāre nogāja un dzīvoja sava tēva namā.
12 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
Kad nu labs laiks bija pagājis, tad Šuas meita, Jūda sieva, nomira; pēc tam Jūda iepriecinājās un gāja pie saviem avju cirpējiem uz Timnu, viņš un Hīra, viņa draugs, tas Adulamnieks.
13 A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”
Un Tamārei tapa vēstīts un sacīts: redzi, tavs tēvocis iet uz Timnu, savas avis cirpt.
14 O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
Tad viņa novilka savas atraitņu drēbes un apsedzās ar vaiga apsegu un aptinās un apsēdās priekš Enaima vārtiem, kas ir uz Timnas ceļa; jo tā bija redzējusi, ka Šelus bija pieaudzis un ka viņa tam nebija dota par sievu.
15 Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
Un Jūda to redzēja un šķita, to esam mauku, tāpēc ka tā savu vaigu bija apsegusi.
16 Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
Un noklīda pie tās ceļmalā un sacīja: nāc jel, laid man pie tevis ieiet; jo viņš nezināja, to savu vedeklu esam. Un tā sacīja: ko tu man dosi, ja tu pie manis ieiesi?
17 Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
Un tas sacīja: es tev sūtīšu vienu āzi no ganāmpulka. Un tā sacīja: tad dod man ķīlas, tiekams tu to sūti.
18 Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
Tad tas sacīja: kas tās tādas ķīlas, ko man tev būs dot? Un tā atbildēja: tavs aizspiežamais gredzens un tava virkne un tava niedre, kas tavā rokā. Un tas viņai to deva un iegāja pie tās; un tā tapa grūta no viņa.
19 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
Un tā cēlās un aizgāja un nolika to apsegu un apvilka savas atraitņu drēbes.
20 Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
Un Jūda sūtīja to āzi caur savu draugu, to Adulamnieku, atņemt tās ķīlas no tās sievas rokas; bet tas to neatrada.
21 Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
Tad tas vaicāja tās vietas ļaudis sacīdams: kur ir tā mauka, kas Enaimā uz ceļa sēdējusi? Un tie sacīja: še maukas nav bijis.
22 Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’”
Un tas atgriezās pie Jūdas un sacīja: es to neesmu atradis, un tās vietas ļaudis arīdzan saka: še maukas nav bijis.
23 Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”
Tad Jūda sacīja: lai tā to sev patur, ka netopam kaunā; redzi, es šo āzi esmu sūtījis, un tu viņas neesi atradis.
24 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”
Un notikās pēc kādiem trim mēnešiem, tad Jūdam tapa vēstīts un sacīts: Tamāre, tava vedekla, maucību dzinusi, un redzi, tā ir arī grūta no maukošanas. Tad Jūda sacīja: izvediet to ārā, ka tā top sadedzināta.
25 Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
Kad nu tā tapa izvesta, tad tā sūtīja pie sava tēvoča un sacīja: no tā vīra, kam šās lietas pieder, es esmu grūta; un tā sacīja: vai pazīsti jel, - kam tas aizspiežamais gredzens un šī virkne un šī niedre pieder?
26 Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
Un Jūda tās pazina un sacīja: tā sieva ir taisnāka nekā es, tāpēc ka es viņu savam dēlam Šelum neesmu devis. Un viņš to vairs neatzina.
27 Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
Un tai dzemdējot, redzi, tai bija dvīņi viņas miesās.
28 Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
Un kad tā dzemdēja, tad viens roku izbāza, un bērnu saņēmēja to ņēma un apsēja sarkanu pavedienu ap to roku un sacīja: šis nāks pirmais ārā.
29 Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
Un kad tas to roku ievilka, redzi, tad nāca viņa brālis ārā; un tā sacīja: kāpēc tu sev plēsumu esi plēsis? Un tā viņa vārdu nosauca Perec (plēsis).
30 Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.
Un pēc tam viņa brālis nāca ārā, ap kā roku tas sarkanais pavediens bija, un tā viņa vārdu nosauca Zerus (atspīdums).

< Jenesis 38 >