< Jenesis 38 >
1 Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira.
Pa nthawi imeneyi, Yuda anasiyana ndi abale ake napita kukakhala ndi munthu wina wa ku Adulamu wotchedwa Hira.
2 Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya.
Kumeneko, Yuda anaona mwana wamkazi wa munthu wina wa Chikanaani wotchedwa Suwa. Anamukwatira nagona naye malo amodzi.
3 Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa
Iye anatenga pathupi, nabala mwana wamwamuna amene anamutcha Eri.
4 Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan.
Anatenganso pathupi nabala mwana wa mwamuna ndipo anamutcha Onani.
5 Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.
Anaberekanso mwana wina wamwamuna ndipo anamutcha Sela. Ameneyu anabadwa Yuda ali ku Kezibi.
6 Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.
Yuda anamupezera mkazi mwana wake woyamba uja Eri, ndipo dzina la mkaziyo linali Tamara.
7 Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
Koma ntchito zoyipa za Eri, mwana wachisamba wa Yuda zinayipira Yehova. Choncho Mulungu anamulanga ndi imfa.
8 Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
Pamenepo Yuda anati kwa Onani, “Kwatira mkazi wamasiye wa mʼbale wako. Ulowe chokolo kuti mʼbale wako akhale ndi mwana.”
9 Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
Koma Onani anadziwa kuti mwanayo sadzakhala wake. Choncho nthawi zonse pamene amagona naye mkaziyo, ankatayira umuna pansi kuti asamuberekere mwana mʼbale wake.
10 Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
Zimene ankachitazi zinayipira Yehova. Choncho anamulanganso ndi imfa.
11 Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.
Kenaka Yuda anati kwa mpongozi wake Tamara, “Bwererani ku nyumba ya abambo anu ndi kukhala kumeneko ngati wamasiye mpaka mwana wanga Sela atakula.” Ananena izi chifukwa ankaopa kuti Sela angafenso ngati abale ake aja. Choncho Tamara anapita kukakhala ku nyumba ya abambo ake.
12 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
Patapita nthawi yayitali, Batishua, mkazi wa Yuda anamwalira. Yuda atatha kulira maliro a mkazi wake, anapita, iyeyu pamodzi ndi bwenzi lake Hira, Mwadulamu uja, ku Timna kumene ankameta nkhosa zawo.
13 A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”
Tamara atamva kuti apongozi ake akupita ku Timna kukameta nkhosa,
14 O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
iye anavula zovala zake za umasiye, nadziphimba nkhope ndi nsalu kuti asadziwike, ndipo anakhala pansi pa chipata cha ku Enaimu popita ku Timna. Tamara anachita izi chifukwa anaona kuti ngakhale Selayo anali atakula tsopano, iye sanaperekedwe kuti amulowe chokolo.
15 Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya.
Yuda atamuona anangomuyesa mkazi wadama chabe, chifukwa anadziphimba nkhope.
16 Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
Tsono anapita kwa mkaziyo pamphepete pa msewu paja nati, “Tabwera ndigone nawe.” Apa Yuda sankadziwa kuti mkazi uja anali mpongozi wake. Ndiye mkazi uja anamufunsa Yuda nati, “Mudzandipatsa chiyani kuti ndigone nanu?”
17 Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
Iye anati, “Ndidzakutumizira kamwana kambuzi ka mʼkhola mwanga.” Mkaziyo anayankha kuti, “Chabwino, ndavomera, koma mungandipatse chikole mpaka mutanditumizira mbuziyo?”
18 Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
Iye anati, “Ndikupatse chikole chanji?” Mkaziyo anayankha, “Mundipatse mphete yanuyo, chingwe chanucho pamodzi ndi ndodo imene ili mʼdzanja lanulo.” Choncho anazipereka kwa iye nagona naye ndipo anatenga pathupi.
19 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
Kenaka Tamara anachoka, navula nsalu anadziphimba nayo ija, navalanso zovala zake za umasiye zija.
20 Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
Tsono Yuda anatuma bwenzi lake Mwadulamu uja ndi kamwana kambuzi kaja kuti akapereke kwa mkazi wadama uja, ndi kuti akatero amubwezere chikole chake chija. Koma atafika sanamupezepo.
21 Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
Anawafunsa anthu a komweko, “Kodi mkazi wadama uja amene ankakhala pambali pa msewu wa ku Enaimu, ali kuti?” Iwo anayankha, “Sipanakhalepo mkazi wa dama aliyense pano.”
22 Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’”
Choncho anabwerera kwa Yuda nati, “Sindinamupeze mkazi uja. Kuwonjeza apo, anthu a kumeneko amati, ‘Sipanakhalepo mkazi wadama pano.’”
23 Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”
Pamenepo Yuda anati, “Mulekeni atenge zinthuzo zikhale zake, kuopa kuti anthu angatiseke. Ine sindinalakwe, ndinamutumizira kamwana kambuzika, koma simunamupeze.”
24 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”
Patapita miyezi itatu, Yuda anawuzidwa kuti, “Mpongozi wanu Tamara anachita zadama, ndipo zotsatira zake nʼzakuti ali ndi pathupi.” Yuda anati, “Kamutulutseni ndipo mukamutenthe kuti afe!”
25 Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”
Akumutulutsa, iye anatuma mawu kwa apongozi ake. Anati, “Ndili ndi pathupi pa munthu amene ndi mwini wake wa zinthu izi. Taziyangʼanitsitsani, kodi mwini wa khoza, chingwe ndi ndodo yoyenderayi ndi yani?”
26 Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
Yuda anazizindikira zinthuzo ndipo anati, “Uyu ndi wolungama kuposa ine, chifukwa sindinamupereke kwa mwana wanga Sela.” Ndipo Yuda sanagone nayenso.
27 Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
Pamene Tamara nthawi inamukwanira yoti abeleke, mʼmimbamo munali mapasa.
28 Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
Pamene ankabereka, mmodzi wa iwo anatulutsa dzanja lake. Choncho mzamba anatenga kawulusi kofiira nakamangirira pa mkono pa mwanayo nati, “Uyu ndiye anayamba kubadwa.”
29 Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
Koma pamene anabweza mkonowo, mʼbale wake anabadwa ndipo mzamba anati, “Wachita kudziphotcholera wekha njira chonchi!” Ndipo anamutcha Perezi.
30 Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.
Pambuyo pake mʼbale wake amene anali ndi ulusi wofiira pa mkono wake uja anabadwa ndipo anapatsidwa dzina lakuti Zera.