< Jenesis 37 >

1 Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.
Вселися же Иаков в земли, идеже обита Исаак, отец его, в земли Ханаани.
2 Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
Сии же роди Иаковли. Иосиф же бяше седминадесяти лет, пасый овцы отца своего с братиею своею, юн сый, с сынми Валлы и с сынми Зелфы, жен отца своего: нанесоша же на Иосифа злу клевету ко Израилю отцу своему.
3 Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.
Иаков же любляше Иосифа паче всех сынов своих, яко сын в старости ему бысть: и сотвори ему ризу пестру.
4 Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma.
Видевше же братия его, яко любит его отец паче всех сынов своих, возненавидеша его и не можаху глаголати к нему ничтоже мирно.
5 Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa.
Видев же Иосиф сон, поведа и братии своей
6 Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
и рече им: послушайте сна сего, егоже видех:
7 Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”
мнех вас вяжущих снопы среде поля: и воста мой сноп и ста прямо, ваши же снопы обратившеся поклонишася моему снопу.
8 Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile.
Реша же ему братия его: еда царствуя царствовати будеши над нами, или господствуя господствовати будеши над нами? И приложиша еще ненавидети его снов ради его и ради словес его.
9 Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”
Виде же сон другий и поведа его отцу своему и братии своей, и рече: се, видех другий сон: аки бы солнце и луна и единонадесять звезд покланяхуся мне.
10 Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?”
И запрети ему отец его и рече ему: что сон сей, егоже еси видел? Еда пришедше приидем аз и мати твоя и братия твоя поклонитися тебе до земли?
11 Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.
Позавидеша же ему братия его: отец же его соблюде слово сие.
12 Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.
Отидоша же братия его пасти овцы отца своего в Сихем.
13 Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
И рече Израиль ко Иосифу: еда братия твоя не пасут в Сихеме? Гряди да послю тя к ним. Рече же ему: се, аз.
14 Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem,
Рече же ему Израиль: шед, виждь, аще здравствуют братия твоя и овцы, и повеждь ми. И посла его от юдоли Хеврони. И прииде в Сихем:
15 ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
и обрете его человек заблуждающа на поли: вопроси же его человек глаголя: чесого ищеши?
16 Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”
Он же рече: братии моея ищу: повеждь ми, где пасут.
17 Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan.
Рече же ему человек: отидоша отсюду: слышах бо их глаголющих: пойдем в Дофаим. И иде Иосиф вслед братии своея и обрете я в Дофаиме.
18 Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
Предузреша же его издалече, прежде приближения его к ним, и зле умыслиша убити его:
19 Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa!
рече же кийждо к брату своему: се, сновидец оный идет:
20 Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”
ныне убо приидите, убием его и ввержим его во един от рвов, и речем: зверь лют снеде его: и узрим, что будут сония его.
21 Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
Слышав же Рувим, отя его из рук их и рече: не убием его на души.
22 Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.
Рече же им Рувим: не пролийте крове, вверзите его во един от рвов сих, иже в пустыни, руки же не возложите на него: (тщашеся бо) яко да изымет его от рук их и отдаст его отцу своему.
23 Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
Бысть же егда прииде Иосиф к братии своей, совлекоша со Иосифа ризу пеструю, яже на нем,
24 Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.
и поемше его ввергоша в ров: ров же тощь, воды не имяше.
25 Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
И седоша ясти хлеб, и воззревше очима видеша, и се, путницы Исмаилтяне идяху от Галаада, и велблюды их полны фимиама и ритины и стакти: идяху же везуще во Египет.
26 Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya?
Рече же Иуда ко братии своей: кая польза, аще убием брата нашего и скрыем кровь его?
27 Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị.
Грядите продадим его Исмаилтяном сим: руце же наши да не будут на нем, яко брат наш и плоть наша есть. Послушаша же братия его.
28 Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
И мимоидоша человецы Мадиамстии купцы: и извлекоша и возведоша Иосифа из рова, и продаша Иосифа Исмаилтяном на двадесять златниц. И поведоша Иосифа во Египет.
29 Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.
Возвратися же Рувим к рову и не узре Иосифа в рове: и растерза ризы своя,
30 O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?”
и прииде ко братии своей и рече: отрочища несть, аз же камо иду ктому?
31 Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
Вземше же ризу Иосифову, заклаша козлище от коз и помазаша ризу кровию:
32 Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”
и послаша ризу пеструю, и принесоша ко отцу своему и рекоша: сию обретохом: познавай, аще риза сына твоего есть, или ни?
33 Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
И позна ю и рече: риза сына моего есть: зверь лют снеде его: зверь восхити Иосифа.
34 Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
И растерза Иаков ризы своя, и возложи вретище на чресла своя, и плакашеся сына своего дни многи.
35 Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. (Sheol h7585)
Собрашася же вси сынове его и дщери и приидоша утешити его: и не хотяше утешитися, глаголя: яко сниду к сыну моему сетуя во ад. И плакася о нем отец его. (Sheol h7585)
36 Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
Мадиане же продаша Иосифа во Египет Пентефрию евнуху фараонову, архимагиру.

< Jenesis 37 >