< Jenesis 36 >

1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.
Hivi ndivyo vizazi vya Esau (aliyeitwa pia Edom).
2 Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.
Esau akachukua wakeze kutoka kwa Wakanaani. Hawa walikuwa wake zake: Ada binti Eloni Mhiti; Oholibama binti Ana, mjukuu wa Zibeoni Mhivi; na
3 Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.
Basemathi, binti Ishmaeli, dada wa Nebayothi.
4 Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.
Ada akamzaa Elifazi kwa Esau, na Basemathi akamzaa Reueli.
5 Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.
Oholibama akamzaa Yeushi, Yalamu, na Kora. Hawa walikuwa wana wa Esau waliozaliwa kwake katika nchi ya Kananaani.
6 Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
Esau akawachukua wakeze, wanawe, binti zake, na watu wote wa nyumba yake, mifugo wake - wanyama wake wote, na mali yake yote, aliyokuwa amekusanya katika nchi ya Kanaani, na akaenda katika nchi iliyoko mbali kutoka kwa Yakobo nduguye.
7 Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
Alifanya hivi kwa sababu mali zao zilikuwa nyingi sana kwa wao kuishi pamoja. Nchi waliyokuwa wamekaa isingeweza kuwafaa kwa mifugo yao.
8 Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
Hivyo Esau, aliyejulikana pia kama Edomu, akakaa katika nchi ya kilima Seiri.
9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
Hivi ndivyo vizazi vya Esau, babu wa Waedomu katika nchi ya mlima Seiri.
10 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
Haya yalikuwa majina ya wana wa Esau: Elifazi mwana wa Ada, mkewe Esau; Reueli mwana wa Basemathi, mkewe Esau.
11 Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
Wana wa Elifazi walikuwa Temani, Omari, Zefo, Gatamu, na Kenazi.
12 Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
Timna, suria wa Elifazi, mwana wa Esau, akamzaa Amaleki. Hawa walikuwa wajukuu wa Ada, mkewe Esau.
13 Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
Hawa walikuwa wana wa Reueli: Nahathi, Zera, Shama, na Miza. Hawa walikuwa wajukuu wa Basemathi, mkewe Esau.
14 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
Hawa walikuwa wana wa Oholibama, mkewe Esau, aliyekuwa binti Ana na mjukuu wa Zibeoni. Alimzalia Esau Yeushi, Yalamu, na Kora.
15 Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
Hizi zilikuwa koo kati ya vizazi vya Esau: uzao wa Elifazi, mzaliwa wa kwanza wa Esau: Temani, Omari, Zefo, Kenazi, Kora,
16 Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
Gatamu, na Amaleki. Hivi vilikuwa vizazi vya koo kutoka kwa Elifazi katika nchi ya Edomu. Walikuwa wajukuu wa Ada.
17 Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
Hizi zilikuwa koo kutoka kwa Reueli, mwana wa Esau: Nahathi, Zera, Shama, Miza. Hizi zilikuwa koo kutoka kwa Reueli katika nchi ya Edomu. Walikuwa wajukuu wa Basemathi, mkewe Esau.
18 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
Hizi zilikuwa koo za Oholibama, mkewe Esau: Yeushi, Yalamu, Kora. Hizi ni koo zilizotoka kwa Oholibama mkewe Esau, binti Ana.
19 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
Hawa walikuwa wana wa Esau na koo zao.
20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
Hawa walikuwa wana wa Seiri Mhori, wenyeji wa nchi hiyo: Lotani, Shobali, Zibeoni, Ana,
21 Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
Dishoni, Ezeri, na Dishani. Hizi zilikuwa koo the Wahori, wenyeji wa Seiri katika nchi ya Edomu.
22 Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
Wana wa Lotani walikuwa Hori na Hemani, na Timna alikuwa dada wa Lotani.
23 Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam.
Hawa walikuwa wana wa Shobali: Alvani, Manahathi, Ebali, Shefo, na Onamu.
24 Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn.
Hawa walikuwa wana wa Zibeoni: Aia na Ana. Huyu ndiye Ana aliyeona chemichemi za moto nyikani, alipokuwa akichunga punda wa Zibeoni babaye.
25 Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana.
Hawa walikuwa watoto wa Ana: Dishoni na Oholibama, binti Ana.
26 Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran.
Hawa walikuwa wana wa Dishoni: Hemdani, Eshbani, Ithrani, na Kerani.
27 Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan.
Hawa walikuwa wana wa Ezeri: Bilhani, Zaavani, na Akani.
28 Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran.
Hawa walikuwa wana wa Dishani: Uzi na Arani.
29 Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana,
Hizi zilikuwa koo za Wahori: Lotani, Shobali, Zibeoni, na Ana,
30 ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
Dishoni, Ezeri, Dishani: hizi zilikuwa koo za Wahori, kulingana na ukoo ulivyoorodheshwa katika nchi ya Seiri.
31 Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
Hawa walikuwa wafalme waliomiliki katika nchi ya Edomu kabla ya mfalme yeyote kumilika juu ya Waisraeli:
32 Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
Bela mwana wa Beori, alitawala huko Edomu, na jina la mji wake lilikuwa Dinhaba.
33 Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
Bela alipofariki, kisha Yobabu mwana wa Zera kutoka Bozra, akatawala mahali pake.
34 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
Yobabu alipofariki, Hushamu aliyekuwa wa nchi ya Watemani, akatawala mahali pake.
35 Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit.
Hushamu alipofariki, Hadadi mwana wa Bedadi aliyewashinda Wamidiani katika nchi ya Moabu, akatawala mahali pake. Jina la mji wake lilikuwa Avithi.
36 Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
Hadadi alipofariki, kisha Samla wa Masreka akatawala mahali pake.
37 Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
Samla alipofariki, kisha Shauli wa Rehobothi kando ya mto alitawala mahali pake.
38 Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
Shauli alipofariki, kisha Baali Hanani mwana wa Akbori akatawala mahali pake.
39 Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
Baali Hanani mwana wa Akbori, alipokufa, kisha Hadari akatawala mahali pake. Jina la mji wake lilikuwa Pau. Jina la mkewe lilikuwa Mehetabeli, binti Matredi, mjukuu wa Me Zahabu.
40 Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
Haya ndiyo yalikuwa majina ya wakuu wa koo kutoka uzao wa Esau, kwa kufuata koo zao na maeneo yao, kwa majina yao: Timna, Alva, Yethethi,
41 Oholibama, Elaa, Pinon,
Oholibama, Ela, Pinoni,
42 Kenaz, Teman, Mibza,
Kenazi, Temani, Mbza,
43 Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị. Nke a bụ ezinaụlọ Ịsọ bụkwa nna ndị Edọm.
Magdieli, na Iramu. Hawa walikuwa wakuu wa ukoo wa Edomu, kwa kufuata makao yao katika nchi waliyomiliki. Nao ni Esau, baba wa Waedomu.

< Jenesis 36 >