< Jenesis 36 >

1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.
에서 곧 에돔의 대략이 이러하니라
2 Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.
에서가 가나안 여인 중 헷 족속 중 엘론의 딸 아다와 히위 족속 중 시브온의 딸 아나의 소생 오홀리바마를 자기 아내로 취하고
3 Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.
또 이스마엘의 딸 느바욧의 누이 바스맛을 취하였더니
4 Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.
아다는 엘리바스를 에서에게 낳았고 바스맛은 르우엘을 낳았고
5 Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.
오홀리바마는 여우스와 얄람과 고라를 낳았으니 이들은 에서의 아들이요 가나안 땅에서 그에게 낳은 자더라
6 Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
에서가 자기 아내들과 자기 자녀들과 자기 집의 모든 사람과 자기의 가축과 자기 모든 짐승과 자기가 가나안 땅에서 얻은 모든 재물을 이끌고 그 동생 야곱을 떠나 타처로 갔으니
7 Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
두 사람의 소유가 풍부하여 함께 거할 수 없음이러라 그들의 우거한 땅이 그들의 가축으로 인하여 그들을 용납할 수 없었더라
8 Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
이에 에서 곧 에돔이 세일 산에 거하니라
9 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
세일 산에 거한 에돔 족속의 조상 에서의 대략이 이러하고
10 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
그 자손의 이름은 이러하니라 에서의 아내 아다의 아들은 엘리바스요 에서의 아내 바스맛의 아들은 르우엘이며
11 Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
엘리바스의 아들들은 데만과 오말과 스보와 가담과 그나스요
12 Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
에서의 아들 엘리바스의 첩 딤나는 아말렉을 엘리바스에게 낳았으니 이들은 에서의 아내 아다의 자손이며
13 Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
르우엘의 아들들은 나핫과 세라와 삼마와 미사니 이들은 에서의 아내 바스맛의 자손이며
14 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
시브온의 손녀 아나의 딸 에서의 아내 오홀리바마의 아들들은 이러하니 그가 여우스와 얄람과 고라를 에서에게 낳았더라
15 Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
에서 자손 중 족장은 이러하니라 에서의 장자 엘리바스의 자손에는 데만 족장, 오말 족장, 스보 족장, 그나스 족장과
16 Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
고라 족장, 가담 족장, 아말렉 족장이니 이들은 에돔 땅에 있는 엘리바스로 말미암아 나온 족장들이요 이들은 아다의 자손이며
17 Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
에서의 아들 르우엘의 자손에는 나핫 족장, 세라 족장, 삼마 족장, 미사 족장이니 이들은 에돔 땅에 있는 르우엘로 말미암아 나온 족장들이요 이들은 에서의 아내 바스맛의 자손이며
18 Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
에서의 아내 오홀리바마의 아들들은 여우스 족장, 얄람 족장, 고라 족장이니 이들은 아나의 딸이요 에서의 아내인 오홀리바마로 말미암아 나온 족장들이라
19 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
에서 곧 에돔의 자손으로서 족장 된 자들이 이러하였더라
20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
그 땅의 원거인 호리 족속 세일의 자손은 로단과 소발과 시브온과 아나와
21 Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
디손과 에셀과 디산이니 이들은 에돔 땅에 있는 세일의 자손 중 호리 족속으로 말미암아 나온 족장들이요
22 Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
로단의 자녀는 호리와 헤맘과 로단의 누이 딤나요
23 Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam.
소발의 자녀는 알완과 마나핫과 에발과 스보와 오남이요
24 Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn.
시브온의 자녀는 아야와 아나며 이 아나는 그 아비 시브온의 나귀를 칠 때에 광야에서 온천을 발견하였고
25 Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana.
아나의 자녀는 디손과 오홀리바마니 오홀리바마는 아나의 딸이며
26 Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran.
디손의 자녀는 헴단과 에스반과 이드란과 그란이요
27 Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan.
에셀의 자녀는 빌한과 사아완과 아간이요
28 Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran.
디산의 자녀는 우스와 아란이니
29 Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana,
호리 족속의 족장들은 곧 로단 족장, 소발 족장, 시브온 족장, 아나 족장,
30 ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
디손 족장, 에셀 족장, 디산 족장이라 이들은 그 구역을 따라 세일 땅에 있는 호리 족속으로 말미암아 나온 족장들이었더라
31 Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
이스라엘 자손을 다스리는 왕이 있기 전에 에돔 땅을 다스리는 왕이 이러하니라
32 Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
브올의 아들 벨라가 에돔의 왕이 되었으니 그 도성의 이름은 딘하바며
33 Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
벨라가 죽고 보스라 사람 세라의 아들 요밥이 그를 대신하여 왕이 되고
34 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
요밥이 죽고 데만 족속의 땅의 후삼이 그를 대신하여 왕이 되고
35 Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit.
후삼이 죽고 브닷의 아들 곧 모압 들에서 미디안 족속을 친 하닷이 그를 대신하여 왕이 되니 그 도성 이름은 아윗이며
36 Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
하닷이 죽고 마스레가의 삼라가 그를 대신하여 왕이 되고
37 Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
삼라가 죽고 유브라데 하숫가 르호봇의 사울이 그를 대신하여 왕이 되고
38 Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
사울이 죽고 악볼의 아들 바알하난이 그를 대신하여 왕이 되고
39 Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
악볼의 아들 바알하난이 죽고 하달이 그를 대신하여 왕이 되니 그 도성 이름은 바우며 그 처의 이름은 므헤다벨이니 마드렛의 딸이요 메사합의 손녀더라
40 Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
에서에게서 나온 족장들의 이름은 그 종족과 거처와 이름대로 이러하니 딤나 족장, 알와 족장, 여뎃 족장,
41 Oholibama, Elaa, Pinon,
오홀리바마 족장, 엘라 족장, 비논 족장,
42 Kenaz, Teman, Mibza,
그나스 족장, 데만 족장, 밉살 족장,
43 Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị. Nke a bụ ezinaụlọ Ịsọ bụkwa nna ndị Edọm.
막디엘 족장, 이람 족장이라 이들은 그 구역과 거처를 따른 에돔 족장들이며 에돔 족속의 조상은 에서더라

< Jenesis 36 >