< Jenesis 34 >
1 Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ.
Basi Dina, binti wa Yakobo aliyezaliwa na Lea, akatoka nje kuwatembelea wanawake wa nchi ile.
2 Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.
Ikawa Shekemu mwana wa Hamori Mhivi, mtawala wa eneo lile alipomwona, akamchukua na kumnajisi.
3 Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
Moyo wake ukavutwa sana kwa Dina binti Yakobo, akampenda huyu msichana na akazungumza naye kwa kumbembeleza.
4 Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
Shekemu akamwambia baba yake Hamori, “Nipatie msichana huyu awe mke wangu.”
5 Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.
Yakobo aliposikia kwamba binti yake Dina amenajisiwa, wanawe walikuwa mashambani wakichunga mifugo yake, kwa hiyo akalinyamazia jambo hilo mpaka waliporudi nyumbani.
6 Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
Kisha Hamori baba yake Shekemu akaenda kuzungumza na Yakobo.
7 Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.
Basi wana wa Yakobo walikuwa wamerudi kutoka mashambani mara tu waliposikia kilichotokea. Walikuwa wamejawa na huzuni na ghadhabu, kwa sababu Shekemu alikuwa amefanya jambo la aibu katika Israeli kwa kukutana kimwili na binti wa Yakobo, kitu ambacho hakingepasa kufanyika.
8 Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
Lakini Hamori akawaambia, “Moyo wa mwanangu Shekemu umeelekea kwa binti yenu. Tafadhali mpeni awe mke wake.
9 Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.
Oaneni na sisi, tupeni binti zenu, nanyi mchukue binti zetu.
10 Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.”
Mwaweza kuishi katikati yetu, nchi ni wazi kwenu. Ishini ndani yake, fanyeni biashara humu na mjipatie mali.”
11 Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.
Kisha Shekemu akamwambia baba yake Dina pamoja na ndugu zake, “Na nipate kibali machoni penu, nami nitawapa chochote mtakachosema.
12 Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.”
Niambieni kiasi cha mahari na zawadi nitakayoileta, hata iwe kubwa kiasi gani, nami nitawalipa chochote mtakachodai. Nipeni tu huyu msichana awe mke wangu.”
13 Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
Kwa sababu ndugu yao Dina alikuwa amenajisiwa, wana wa Yakobo wakajibu kwa udanganyifu walipozungumza na Shekemu pamoja na baba yake Hamori.
14 Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
Wakawaambia, “Hatuwezi kufanya jambo kama hili, hatuwezi kumtoa dada yetu kwa mtu ambaye hakutahiriwa. Hiyo itakuwa aibu kwetu.
15 Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
Tutakuruhusu kwa sharti moja tu, kwamba mtakuwa kama sisi kwa kuwatahiri wanaume wenu wote.
16 Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.
Kisha tutawapa binti zetu na sisi tutawachukua binti zenu. Tutaishi kwenu na tutakuwa watu wamoja nanyi.
17 Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
Lakini mkikataa kutahiriwa, tutamchukua ndugu yetu na kuondoka.”
18 Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.
Pendekezo lao likawa jema kwa Hamori na Shekemu mwanawe.
19 Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.
Kijana mdogo, ambaye alikuwa ameheshimiwa kati ya wote walioishi nyumbani mwa baba yake, hakupoteza muda kufanya waliyoyasema, kwa sababu alikuwa amependezwa sana na binti Yakobo.
20 Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.
Kwa hiyo Hamori na Shekemu mwanawe walikwenda kwenye lango la mji kuzungumza na wenzao wa mjini.
21 “Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha.
Wakasema, “Hawa watu ni marafiki kwetu, tuwaruhusu waishi katika nchi yetu na kufanya biashara ndani yake, nchi ina nafasi tele kwa ajili yao. Tunaweza kuoa binti zao. Nao wanaweza kuoa binti zetu.
22 Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.
Lakini watu hao watakuwa tayari kukubali kuishi nasi kama watu wamoja nao kwa sharti kwamba wanaume wetu watahiriwe, kama wao.
23 Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.”
Je, si mifugo yao, mali zao na wanyama wao wengine wote watakuwa wetu? Basi na tuwape kibali, nao wataishi miongoni mwetu.”
24 Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.
Wanaume wote waliotoka nje ya lango la mji walikubaliana na Hamori na Shekemu mwanawe na kila mwanaume katika mji ule akatahiriwa.
25 O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
Baada ya siku tatu, wakati wote wakiwa wangali katika maumivu, wana wawili wa Yakobo, yaani Simeoni na Lawi, ndugu zake Dina, wakachukua panga zao na kuvamia mji ambao haukutazamia vita, wakaua kila mwanaume.
26 Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.
Wakawaua Hamori na Shekemu mwanawe kwa upanga kisha wakamchukua Dina kutoka nyumba ya Shekemu na kuondoka.
27 Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.
Wana wa Yakobo walipita juu ya maiti katika kuteka nyara mji ule ambamo dada yao alikuwa amenajisiwa.
28 Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.
Wakachukua kondoo na mbuzi, ngʼombe, punda na kila kitu kilichokuwa chao ndani ya mji ule na mashambani.
29 Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.
Walichukua utajiri wao wote pamoja na wanawake na watoto wao, wakachukua nyara kila kitu ndani ya nyumba zao.
30 Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.”
Kisha Yakobo akawaambia Simeoni na Lawi, “Mmeleta taabu kwangu kwa kunifanya ninuke kama uvundo kwa Wakanaani na Waperizi, watu waishio katika nchi hii. Sisi ni wachache, kama wakiunganisha nguvu zao dhidi yangu na kunishambulia, mimi na nyumba yangu tutaangamizwa.”
31 Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”
Lakini wakamjibu, “Je, ilikuwa vyema kumtendea dada yetu kama kahaba?”