< Jenesis 32 >

1 Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
Wana Jakobi azalaki kokoba mobembo na ye, ba-anjelu ya Nzambe bayaki kokutana na ye.
2 Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
Tango Jakobi amonaki bango, alobaki: « Oyo ezali molako ya Nzambe! » Mpe abengaki esika yango: Maanayimi.
3 Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
Jakobi atindaki bantoma liboso na ye epai ya Ezawu, ndeko na ye, na mokili ya Seiri, kati na zamba ya Edomi.
4 O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
Apesaki bango malako oyo: « Tala makambo oyo bokoloba epai ya nkolo na ngai Ezawu: ‹ Mosali na yo Jakobi alobi: ‘Navandaki epai ya Labani mpe natikalaki kuna kino sik’oyo.
5 Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’”
Nazali na bangombe, ba-ane, bameme, bantaba, basali ya mibali mpe ya basi; natindi sango oyo epai ya nkolo na ngai mpo ete nazwa ngolu na miso na ye.’ › »
6 Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
Tango bantoma bazongaki epai ya Jakobi, balobaki: « Tokendeki epai ya Ezawu, ndeko na yo, mpe sik’oyo azali koya elongo na bato nkama minei mpo na kokutana na yo. »
7 Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
Na kobanga makasi mpe na komitungisa, Jakobi akabolaki bato oyo bazalaki elongo na ye na masanga mibale; ndenge moko mpe mpo na bameme, bantaba mpe bashamo.
8 O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
Azalaki komilobela: « Soki Ezawu abundisi lisanga moko, lisanga oyo etikali ekoki kokima. »
9 Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
Sima, Jakobi abondelaki: « Oh Nzambe ya Abrayami, tata na ngai! Nzambe ya Izaki, tata na ngai! Oh Yawe, Yo oyo olobaki na ngai: ‹ Zonga na mokili na yo, na libota na yo, mpe Ngai nakosalela yo bolamu. ›
10 Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
Nazali nani mpo ete otalisa ngai mosali na Yo bolamu mpe bosembo nyonso oyo! Nazalaki kaka na lingenda tango nakatisaki Yordani, kasi sik’oyo nazali na masanga mibale.
11 Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
Nabondeli Yo, kangola ngai na maboko ya ndeko na ngai, Ezawu, pamba te nazali kobanga ete aya kobundisa ngai elongo na bamama mpe bana na bango.
12 Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
Nzokande, Yo olobaki na ngai: ‹ Ya solo nakosalela yo bolamu mpe nakokomisa bakitani na yo ebele lokola zelo ya ebale monene, oyo moto moko te akoki kotanga. › »
13 Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
Jakobi alekisaki butu na esika wana. Kati na biloko oyo azalaki na yango, aponaki kado mpo na Ezawu, ndeko na ye:
14 Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ, iri mkpi abụọ, narị nne atụrụ abụọ, iri ebule abụọ
bantaba ya basi nkama mibale mpe bantaba ya mibali tuku mibale, bameme ya basi nkama mibale mpe bameme ya mibali tuku mibale,
15 Iri nne ịnyịnya kamel atọ na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ, oke ehi iri, iri nne ịnyịnya ibu abụọ, oke ịnyịnya ibu iri.
shamo ya basi tuku misato elongo na bana na yango, bangombe ya basi tuku minei mpe bangombe ya mibali zomi, ba-ane ya basi tuku mibale mpe ya mibali zomi.
16 O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
Akabolaki yango na bitonga mpe apesaki yango epai ya basali na ye. Alobaki na bango: « Boleka liboso na ngai mpe botia etonga moko mosika na mosusu. »
17 O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
Jakobi apesaki mitindo oyo epai ya mosali na ye ya liboso: « Tango Ezawu, ndeko na ngai, akokutana na yo mpe akotuna yo: ‹ Yo ozali mosali ya nani, ozali kokende wapi mpe nani nkolo ya banyama nyonso oyo ezali liboso na yo? ›
18 Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’”
Okozongisa: ‹ Ezali ya Jakobi, mosali na yo, ezali kado oyo atindeli nkolo na ngai Ezawu. Mpe tala ye moko azali koya sima na biso. › »
19 Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
Apesaki lisusu mitindo wana epai ya mosali ya mibale, ya misato mpe epai ya basali nyonso oyo bazalaki kolanda bibwele: « Bokoloba kaka maloba moko tango bokokutana na Ezawu.
20 Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
Bokoyebisa ye lisusu: ‹ Tala ye moko Jakobi, mosali na yo, azali koya na sima na biso! › » Pamba te azalaki komilobela: « Nakokitisa kanda na ye na kado oyo natindi liboso na ngai; sima tango nakokutana na ye, mbala mosusu akoyamba ngai malamu. »
21 Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
Boye kado ya Jakobi ekendeki liboso, kasi ye moko alekisaki butu kati na Molako.
22 Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
Na butu wana, Jakobi alamukaki, azwaki basi na ye mibale, basali na ye mibale ya basi, bana na ye zomi na moko mpe akatisaki mayi ya Yaboki.
23 Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
Sima na kokatisa bango mayi, akatisaki mpe biloko na ye nyonso.
24 Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
Jakobi atikalaki kaka ye moko. Bongo moto moko abundaki na ye kino tango tongo elingaki kotana.
25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
Wana moto yango amonaki ete akoki kolonga Jakobi te, abetaki Jakobi na loketo mpe mokuwa ya loketo na ye ebukanaki tango bazalaki kobunda.
26 Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
Sima, moto yango alobaki: — Tika ngai nakende, pamba te tongo elingi kotana. Kasi Jakobi azongisaki: — Nakotika yo te kokende soki opamboli ngai te.
27 Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
Moto yango atunaki Jakobi: — Kombo na yo nani? Jakobi azongisaki: — Kombo na ngai ezali Jakobi.
28 Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
Moto yango alobaki lisusu: — Kobanda lelo, kombo na yo ekozala lisusu Jakobi te, kasi Isalaele, pamba te obundi na Nzambe mpe na bato, bongo olongi.
29 Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
Jakobi alobaki: — Nabondeli yo, yebisa ngai kombo na yo. Azongiselaki ye: — Mpo na nini ozali kotuna kombo na ngai? Boye apambolaki ye na esika wana.
30 Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
Jakobi abengaki esika yango « Penieli, » pamba te alobaki: « Namoni Nzambe na miso na ngai, mpe bomoi na ngai ebiki. »
31 Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
Tango moyi ebimaki, Jakobi alekaki Penueli. Azalaki kotambola tengu-tengu mpo na loketo na ye.
32 Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.
Yango wana kino lelo, bana ya Isalaele baliaka mosuni ya mopende te, pamba te Nzambe abetaki Jakobi na mosuni oyo ekangami na mokuwa ya loketo.

< Jenesis 32 >