< Jenesis 31 >

1 Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.”
He heard the words of Laban's sons, saying, "Jacob has taken away all that was our father's. From that which was our father's he has gained all this wealth."
2 Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ.
Jacob saw the expression on Laban's face, and look, it was not as it had been.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.”
Then God said to Jacob, "Return to the land of your fathers, and to your relatives, and I will be with you."
4 Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya.
Jacob sent and called Rachel and Leah to the field where his flock was,
5 Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m.
and said to them, "I see the expression on your father's face, that it is not what it was before. But the God of my father has been with me.
6 Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ.
You know that I have served your father with all of my strength.
7 Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ.
Yet your father has cheated me and changed my wages ten times, but God did not allow him to hurt me.
8 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
If he said this, 'The speckled will be your wages,' then all the flock bore speckled. If he said this, 'The streaked will be your wages,' then all the flock bore streaked.
9 Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha.
Thus God has taken away your father's livestock and given them to me.
10 “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
And it came about at the time when the flocks were breeding I looked up and saw in a dream, and look, the male goats which leaped on the flock were streaked, speckled, and spotted.
11 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
The angel of God said to me in the dream, 'Jacob,' and I said, 'Here I am.'
12 Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị.
He said, 'Now lift up your eyes, and look, all the male goats which leap on the flock are streaked, speckled, and spotted, for I have seen all that Laban has done to you.
13 Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’”
I am the God of Bethel, where you anointed a standing-stone, where you made a vow to me. Now arise, go out from this land and return to the land of your birth.'"
14 Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
Rachel and Leah answered him, "Is there yet any portion or inheritance for us in our father's house?
15 Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị.
Aren't we regarded by him as foreigners? For he has sold us, and he has used up what was paid for us.
16 Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”
For all the wealth which God has taken away from our father, that is ours and our children's. Now then, whatever God has said to you, do."
17 Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel,
Then Jacob got up and put his sons and his wives on the camels,
18 duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan.
and he took away all his livestock and all his property which he had acquired, including the livestock which he had gained in Paddan Aram, to go to Isaac his father in the land of Canaan.
19 Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya.
Now Laban had gone to shear his sheep, and Rachel stole the idols that belonged to her father.
20 Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ.
Jacob outwitted Laban the Aramean by not telling him that he intended to flee.
21 Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead.
So he fled with everything that he had, and he arose and crossed the River, and set out toward the hill country of Gilead.
22 Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala.
Laban was told on the third day that Jacob had fled.
23 O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.
He took his relatives with him, and pursued after him for seven days, and caught up with him in the hill country of Gilead.
24 Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.”
God came to Laban the Aramean in a dream at night, and said to him, "Be careful that you do not speak to Jacob either good or bad."
25 Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.
Laban caught up with Jacob. Now Jacob had pitched his tent in the hill country, and Laban with his relatives camped in the hill country of Gilead.
26 Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?
Laban said to Jacob, "What have you done? You have deceived me, and carried away my daughters like captives taken in war?
27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?
Why did you flee in secret and deceive me, and not tell me, so that I might have sent you away with joy and singing, with a tambourine and with a lyre.
28 Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.
And you did not allow me to kiss my sons and my daughters? Now you have done foolishly.
29 Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’
It is in my power to do you harm, but the God of your father spoke to me last night, saying, 'Be careful that you do not speak to Jacob either good or bad.'
30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”
Now you have indeed gone away, because you longed greatly for your father's house. But why have you stolen my gods?"
31 Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a.
Jacob answered Laban, "Because I was afraid, for I thought that you would take your daughters from me by force.'
32 Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.
Anyone you find your gods with shall not live. In the presence of our relatives, identify what I have that is yours, and take it with you." For Jacob did not know that Rachel had stolen them.
33 Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.
Laban went into Jacob's tent, into Leah's tent, and into the tent of the two female servants; but he did not find them. He went out of Leah's tent, and entered into Rachel's tent.
34 Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
Now Rachel had taken the idols, put them in the camel's saddle, and sat on them. Laban searched the whole tent, but did not find them.
35 Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
She said to her father, "Do not let my lord be angry that I can't rise up before you; for the manner of women is on me." He searched, but did not find the teraphim.
36 Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?
Jacob was angry, and argued with Laban. Jacob answered Laban, "What is my trespass? What is my sin, that you have hotly pursued after me?
37 Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.
Now that you have searched around in all my stuff, did you find anything from all of your household's belongings? Put it here before my relatives and your relatives, that they may judge between the two of us.
38 “Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị.
These twenty years I have been with you. Your ewes and your female goats have not miscarried their young, and I haven't eaten the rams of your flocks.
39 O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị.
That which was torn by animals I did not bring to you. I bore its loss. You demanded payment from me whether stolen by day or stolen by night.
40 Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.
I was consumed by the heat during the day and by the frost at night, and sleepless nights.
41 Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri.
These twenty years I have been in your house. I served you fourteen years for your two daughters, and six years for your flock, and you have changed my wages ten times.
42 A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.”
Unless the God of my father, the God of Abraham, and the one whom Isaac fears, had been with me, surely now you would have sent me away empty-handed. God has seen my harsh treatment and my hard work, and rebuked you last night."
43 Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ?
Laban answered Jacob, "The daughters are my daughters, the children are my children, the flocks are my flocks, and all that you see is mine: and what can I do this day to these my daughters, or to their children whom they have borne?
44 Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.”
So now, come, let us make a covenant, you and I, and let it be a witness between the two of us." And he said to him, "Look, there is no one with us; see, God is witness between me and you."
45 Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
Jacob took a stone and set it up as a standing-stone.
46 Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.
Jacob said to his relatives, "Gather stones." So they took stones and made a mound. They ate there by the mound.
47 Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya.
Laban called it Jegar Sahadutha, but Jacob called it Galeed.
48 Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.
Laban said, "This mound is a witness between me and you today." Therefore it was named Galeed
49 A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso.
and Mizpah, for he said, "God watch between me and you, when we are absent one from another.
50 Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.”
If you mistreat my daughters, or if you take wives besides my daughters, although no one is with us; see, God is witness between me and you."
51 Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.
Laban said to Jacob, "See this mound, and see the standing-stone, which I have set between me and you.
52 Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ.
May this mound be a witness, and the standing-stone be a witness, that I will not pass over this mound to you, and that you will not pass over this mound and this standing-stone to me, to do harm.
53 Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi.
The God of Abraham, and the God of Nahor, the God of their father, judge between us." Then Jacob swore by the fear of his father Isaac.
54 Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ.
Jacob offered a sacrifice on the mountain, and called his relatives to eat the meal. They ate the meal and stayed all night on the mountain.
55 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha.
Early in the morning, Laban rose up, and kissed his sons and his daughters, and blessed them. Laban departed and returned to his place.

< Jenesis 31 >