< Jenesis 28 >

1 Aịzik kpọrọ Jekọb gọzie ya, nye ya iwu sị ya, “Alụla nwunye site nʼala Kenan.
Choncho Isake anayitanitsa Yakobo namudalitsa nʼkumuwuzitsa kuti, “Usakwatire mkazi wa kuno ku Kanaani.
2 Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban.
Panopo upite ku Padanaramu, ku nyumba kwa Betueli abambo a amayi akowa, kumeneko ukakwatire mmodzi mwa ana aakazi a Labani, mlongo wa amayi akowa.
3 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba.
Mulungu Wamphamvuzonse akudalitse iwe nakupatse ana ambiri mpaka udzasanduke gulu lalikulu la mitundu ya anthu.
4 Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
Mulunguyo akudalitse iwe monga mmene anamudalitsira Abrahamu kuti zidzukulu zako zidzalandira dziko limene ukukhalamo ngati mlendo kuti lidzakhale lawo. Ili ndi dziko limene Mulungu anapereka kwa Abrahamu.”
5 Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ.
Ndipo Isake anamulola Yakobo kuti anyamuke kupita ku Padanaramu kwa Labani mwana wa Betueli Mwaramu. Labani anali mlongo wa Rebeka, mayi wa Yakobo ndi Esau.
6 Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,”
Tsopano Esau anadziwa kuti Isake anadalitsa Yakobo ndi kumutumiza ku Padanaramu kuti akakwatire kumeneko. Anawuzidwanso kuti, “Usakwatire mkazi wa ku Kanaani.”
7 Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram.
Yakobo anamvera abambo ake ndi amayi ake ndi kupita ku Padanaramu.
8 O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik.
Ndiye pamenepo Esau anazindikira kuti abambo ake Isake sankakondwera ndi akazi a ku Kanaani;
9 Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ.
anapita kwa Ismaeli mwana wa Abrahamu nakwatira Mahalati mwana wa Ismaeli, mlongo wake wa Nebayoti. Anatero kuwonjezera akazi amene anali nawo kale.
10 Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran.
Yakobo ananyamuka pa ulendo kuchoka ku Beeriseba kupita ku Harani.
11 Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra.
Atafika pa malo pena, anayima kuti agonepo chifukwa dzuwa linali litalowa. Anatenga mwala wina pomwepo natsamiritsapo mutu wake, ndipo anagona.
12 Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa.
Mʼmaloto, anaona makwerero oyimikidwa pansi ndipo anakafika kumwamba. Angelo a Mulungu amakwera ndi kutsika pa makwereropo.
13 Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya.
Tsono Yehova anayimirira pambali pake, nati, “Ine ndine Yehova, Mulungu wa Abrahamu kholo lake la Isake abambo ako. Ndidzakupatsa iwe ndi zidzukulu zako dziko limene ukugonamolo.
14 Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a.
Zidzukulu zako zidzachuluka ngati fumbi la pa dziko lapansi ndipo zidzabalalikira kumadzulo ndi kummawa, kumpoto ndi kummwera. Anthu onse adzalandira madalitso kudzera mwa iwe ndi zidzukulu zako.
15 Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.”
Ine ndili nawe pamodzi ndipo ndidzakuyangʼanira kulikonse upiteko, ndipo ndidzakubwezera ku dziko lino. Sindidzakusiya mpaka nditachita zimene ndakulonjezazi.”
16 Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”
Yakobo atadzidzimuka, anati, “Zoonadi Yehova ali pa malo ano, ndipo ine sindinadziwe.”
17 Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
Tsono anachita mantha ndipo anati, “Malo ano ndi woopsa ndithu. Zoonadi pano ndi pa nyumba ya Mulungu ndi khomo la kumwamba.”
18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.
Mmamawa mwake Yakobo anatenga mwala umene anatsamira mutu wake uja nawuyimika ngati chipilala ndi kuthira mafuta pamwamba pake
19 Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.
Iye anawatcha malowo Beteli, ngakhale kuti poyamba mzindawo ankawutcha Luzi.
20 Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi,
Pamenepo Yakobo analumbira kwa Yehova nati, “Ngati inu Mulungu mukhala ndi ine, kundiyangʼanira pa ulendo wangawu ndi kundipatsa chakudya ndi chovala;
21 m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-abụ Chineke m.
ngati inu mudzandibweretsa kwathu mu mtendere, ndiye kuti mudzakhala Mulungu wanga,
22 Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
ndipo mwala uwu ndawuyimikawu udzakhala Nyumba ya Mulungu. Ine ndidzakupatsani chakhumi cha zinthu zonse zimene mudzandipatse.”

< Jenesis 28 >