< Jenesis 26 >
1 Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera.
Бысть же глад на земли, кроме глада бывшаго прежде во время Авраамле. Отиде же Исаак ко Авимелеху царю Филистимску в Герар:
2 Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya.
явися же ему Господь и рече: не ходи во Египет, вселися же в земли, в нейже ти реку,
3 Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.
и обитай в земли той, и буду с тобою, и благословлю тя: тебе бо и семени твоему дам всю землю сию и поставлю клятву Мою, еюже кляхся Аврааму отцу твоему:
4 Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.
и умножу семя твое, яко звезды небесныя, и дам семени твоему всю землю сию: и благословятся о семени твоем вси языцы земнии:
5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”
понеже послуша отец твой Авраам Моего гласа и соблюде заповеди Моя и повеления Моя, и оправдания Моя и законы Моя.
6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.
Вселися же Исаак в Герарех.
7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.”
Вопросиша же мужие места того о Ревекце жене его, и рече: сестра ми есть. Убояся бо рещи, яко жена ми есть, да не когда убиют его мужие места того Ревекки ради, понеже бе доброзрачна.
8 Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.
Бысть же много время тамо: и приникнув Авимелех царь Герарский окном, виде Исаака играюща с Ревеккою женою своею.
9 Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?” Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.”
Призва же Авимелех Исаака и рече ему: убо жена твоя есть? Почто рекл еси, яко сестра ми есть? Рече же ему Исаак: рех бо, да не умру ея ради.
10 Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.”
Рече же ему Авимелех: что сие сотворил еси нам? Вмале не бысть некто от рода моего с женою твоею, и навел бы еси на ны неведение.
11 Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”
Заповеда же Авимелех всем людем своим, глаголя: всяк, иже прикоснется мужу сему, или жене его, смерти повинен будет.
12 Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.
Сея же Исаак в земли той, и приобрете в то лето стократный плод ячменя: благослови же его Господь.
13 Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama.
И возвысися человек, и преуспевая болший бываше, дондеже велик бысть зело.
14 O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.
Быша же ему скоти овец и скоти волов и земледелия многа. Позавидеша же ему Филистимляне:
15 Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.
и вся кладязи, яже ископаша раби отца его, во время отца его, заградиша я Филистимляне и наполниша тыя землею.
16 Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.”
Рече же Авимелех ко Исааку: отиди от нас, яко силнейший сотворился еси от нас зело.
17 Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.
И отиде оттуду Исаак и обита в дебри Герарстей, и вселися тамо.
18 O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.
И паки Исаак ископа кладязи водныя, яже ископаша раби Авраама отца его, и заградиша тыя Филистимляне, по умертвии Авраама отца его: и прозва им имена, по именам, имиже прозва Авраам отец его.
19 Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.
И ископаша раби Исааковы в дебри Герарстей, и обретоша тамо кладязь воды живы.
20 Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya.
И пряхуся пастырие Герарстии с пастырми Исааковыми, глаголюще: наша есть вода. И прозва имя кладязю тому Обида: обидяху бо его.
21 Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.
Отшед же оттуду Исаак, ископа кладязь другий. Пряхуся же и о том: и прозва имя ему Вражда.
22 O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.”
Отшед же оттуду, ископа кладязь другий. И не пряхуся о том, и прозва имя ему Пространство, глаголя: яко ныне распространи Господь нам и возрасти нас на земли.
23 O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba.
Взыде же оттуду ко кладязю Клятвенному:
24 Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya, sị ya, “Abụ m Chineke nna gị Ebraham. Atụla egwu, nʼihi na anọnyere m gị, aga m agọzi gị, mụbaa ọnụọgụgụ ụmụ ụmụ gị nʼihi ohu m Ebraham.”
и явися ему Господь в ту нощь и рече: Аз есмь Бог Авраама отца твоего, не бойся, с тобою бо есмь: и благословлю тя, и умножу семя твое Авраама ради отца твоего.
25 Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri.
И созда тамо жертвенник, и призва имя Господне: и постави тамо скинию свою: ископаша же тамо раби Исааковы кладязь в дебри Герарстей.
26 Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik.
И Авимелех прииде к нему от Герар, и Охозаф невестоводитель его, и Фихол воевода сил его.
27 Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?”
И рече им Исаак: вскую приидосте ко мне? Вы же возненавидесте мене и отсласте мя от себе.
28 Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ
Они же реша: видевше узрехом, яко бе Господь с тобою, и рехом: буди клятва между нами и между тобою, и завещаим с тобою завет,
29 na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”
да не сотвориши с нами зла, якоже не возгнушахомся тобою мы, и якоже сотворихом тебе добро, и отпустихом тя с миром: и ныне благословен ты от Господа.
30 Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa.
И сотвори им пир, и ядоша и пиша.
31 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo.
И воставше заутра, клятся кийждо ближнему: и отпусти я Исаак, и отидоша от него здравы.
32 Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.”
Бысть же в той день, и пришедше раби Исааковы поведаша ему о кладязе, егоже ископаша, и рекоша: не обретохом воды.
33 Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba ruo taa.
И прозва его Клятва. Сего ради прозва имя граду оному кладязь Клятвенный, даже до днешняго дне.
34 Mgbe Ịsọ gbara iri afọ anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiri, onye Het. Ọ lụkwara Basemat nwa Elọn, onye Het.
Бяше же Исав лет четыредесяти: и поя жену Иудифу, дщерь Веоха Хеттеина, и Васемафу, дщерь Елона Хеттеина.
35 Ha ghọrọ Aịzik na Ribeka ihe ọnọdụ obi ilu.
И быша противящеся Исаакови и Ревекце.