< Jenesis 25 >

1 Ebraham lụrụ nwunye ọzọ, onye aha ya bụ Ketura.
Abrahamu anakwatira mkazi wina dzina lake Ketura.
2 Ọ mụụrụ ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua.
Iyeyu anamubalira Zimurani, Yokisani, Medani, Midiyani, Isibaki ndi Suwa.
3 Jokshan bụ nna Sheba na Dedan. Ụmụ ndị ikom Dedan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim.
Yokisani anabereka Seba ndi Dedani ndipo zidzukulu za Dedani ndiwo Aasuri, Aletusi, ndi Aleumi.
4 Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura.
Ana aamuna a Midiyani anali, Efai, Eferi, Hanoki, Abida ndi Elida. Onsewa anali zidzukulu za Ketura.
5 Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere.
Abrahamu anasiyira Isake chilichonse anali nacho.
6 Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso.
Koma pamene anali ndi moyo, Abrahamu anapereka mphatso kwa ana aakazi ake ena onse. Kenaka anawatumiza ku dziko la kummawa kuti akhale kutali ndi mwana wake Isake.
7 Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise.
Abrahamu anakhala ndi moyo zaka 175.
8 Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
Abrahamu anamwalira atakalamba kwambiri ndipo anakakhala ndi anthu a mtundu wake.
9 Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het,
Ana ake, Isake ndi Ismaeli anamuyika mʼphanga la Makipela pafupi ndi Mamre, mʼmunda umene kale unali wa Efroni mwana wa Zohari Mhiti,
10 ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya.
uwu ndi munda umene Abrahamu anagula kwa Ahiti. Kumeneko Abrahamu anakayikidwa pamodzi ndi mkazi wake Sara.
11 Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị.
Atamwalira Abrahamu, Mulungu anadalitsa mwana wake Isake, amene ankakhala pafupi ndi Beeri-lahai-roi (chitsime cha Wamoyo Wondipenya).
12 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya.
Nazi zidzukulu za Ismaeli, mwana wa Abrahamu amene wantchito wa Sara, Hagara Mwigupto uja, anaberekera Abrahamu.
13 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya. Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam,
Awa ndi mayina a ana a Ismaeli monga mwa mndandanda wa mabadwidwe awo: Nebayoti ndiye anali mwana woyamba wa Ismaeli; kenaka Kedara, Adibeeli, Mibisamu,
14 Mishma, Duma, Masa,
Misima, Duma, Masa,
15 Hadad, Tema, Jetua, Nafish na Kedema.
Hadadi, Tema, Yeturi, Nafisi ndi Kedema;
16 Ndị a bụ ụmụ Ishmel, ndị a bụkwa aha ndịisi ikwu iri na abụọ ha, dịka ebe obibi ha si dị, na dịka ọmụma ụlọ ikwu ha si dị.
Amenewa ndi ana a Ismaeli ndi mayina awo monga mwa midzi ndi misasa yawo. Anali olamulira mafuko khumi ndi awiri.
17 Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
Ismaeli anakhala ndi moyo zaka 137. Iye anamwalira ndipo anakakhala ndi anthu a mtundu wake.
18 Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo.
Zidzukulu za Ismaeli zinkakhala mʼdera la pakati pa Havila ndi Suri, kummwera kwa Igupto, mukamapita cha ku Asuri. Choncho anakhala kummawa kwa abale awo.
19 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik.
Iyi ndi mbiri ya Isake mwana wa Abrahamu. Abrahamu anabereka Isake
20 Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.
ndipo Isake anali ndi zaka makumi anayi pamene anakwatira Rebeka mwana wa Betueli Mwaramu wa ku Padanaramu mlongo wa Labani Mwaramu.
21 Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
Isake anapempherera mkazi wake kwa Yehova popeza iye anali wosabereka. Yehova anayankha pemphero lake ndipo mkazi wake Rebeka anatenga pathupi.
22 Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị.
Koma pamene anawo amalimbana mʼmimba mwake, iye anati, “Bwanji zikundichitikira zoterezi?” Choncho anapita kukafunsa kwa Yehova.
23 Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
Yehova anati kwa iye, “Udzabala mafuko awiri a anthu olimbana, ndipo magulu awiri a anthu ochokera mwa iwe adzasiyana; fuko limodzi lidzakhala la mphamvu kuposa linzake, ndipo wamkulu adzatumikira wamngʼono.”
24 Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.
Pamene nthawi inakwana yakuti abeleke, Rebeka anaberekadi mapasa.
25 Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ.
Woyamba kubadwa anali wofiira, ndipo thupi lake lonse linali ngati chovala cha ubweya; choncho anamutcha Esau.
26 Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.
Kenaka mʼbale wake anabadwa atagwira chidendene cha Esau; choncho anamutcha Yakobo. Isake anali ndi zaka 60 pamene Rebeka anabereka mapasawa.
27 Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu.
Anyamatawo anakula ndipo Esau anakhala katswiri wosaka, munthu wamʼthengo, pamene Yakobo anali munthu wofatsa, wokonda kukhala pa nyumba.
28 Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
Isake ankakonda Esau chifukwa cha nyama za kutchire zomwe ankakonda kudya, koma Rebeka ankakonda Yakobo.
29 Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu.
Tsiku lina pamene Yakobo ankaphika chakudya, Esau anabwera kuchokera kuthengo ali wolefuka ndi njala.
30 Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.)
Iye anati kwa Yakobo, “Tandipatsako phala lofiiralo, ndimwe! Ndalefuka ndi njala.” (Nʼchifukwa chake amatchedwanso Edomu).
31 Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”
Yakobo anayankha, “Choyamba undigulitse ukulu wako.”
32 Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?”
Esau anati, “Chabwino, ine ndatsala pangʼono kufa, ukulu undithandiza chiyani?”
33 Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya.
Koma Yakobo anati, “Lumbira kwa ine choyamba.” Kotero Esau analumbiradi, ndipo anagulitsa ukulu wake kwa Yakobo.
34 Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
Choncho Yakobo anamupatsa Esau buledi ndi phala lofiira lija. Iye anadya ndi kumwa, nanyamuka kumapita. Motero Esau anapeputsa ukulu wake wachisamba uja.

< Jenesis 25 >