< Jenesis 23 >
1 Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
Saala yawangaala emyaka kikumi mu abiri mu musanvu.
2 Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
N’afiira e Kiriyasuwalaba, ye Kebbulooni, mu nsi ya Kanani. Saala bwe yafa Ibulayimu n’ayingira okumukungubagira n’amukaabira.
3 Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
Oluvannyuma Ibulayimu n’ava awali omulambo gwe n’agenda eri Abakiiti n’abagamba nti,
4 “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
“Ndi mugenyi era omutambuze mu mmwe, munfunire ekifo aw’okuziika, ndyoke nziikewo omuntu wange anve ku maaso.”
5 Ụmụ Het zara Ebraham sị,
Abakiiti ne baddamu Ibulayimu nti,
6 “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
“Tuwulirize mukama waffe. Laba, oli muntu mukulu wakati mu ffe. Ziika mukazi wo mu emu ku ntaana zaffe gy’oneeroboza. Tewali n’omu mu ffe anaakuuma ntaana ye, oba okukuziyiza okuziika omuntu wo.”
7 Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
Ibulayimu n’agolokoka n’avuunama eri Abakiiti, bannannyini nsi.
8 sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,
N’abagamba nti, “Obanga munzikirizza mu mwoyo mulungi okuziika omuntu wange, mumpulirize. Kale munneegayiririre Efulooni mutabani wa Zokali,
9 ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
anguze empuku ey’e Makupeera, gy’alina, eri ku nkomerero y’ennimiro ye. Agingulize mu maaso gammwe, mmusasule omuwendo gwayo gwonna, efuuke ekifo kyange eky’okuziikangamu mu mmwe.”
10 Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
Mu kiseera ekyo Efulooni yali atudde awo wakati mu Bakiiti. Efulooni, Omukiiti n’addamu Ibulayimu nga Abakiiti bonna abaaliwo mu mulyango gw’ekibuga nga bawulira nti,
11 sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
“Nedda mukama wange. Mpuliriza. Nkuwadde ennimiro n’empuku erimu, ng’abantu bange balaba, ziika omuntu wo.”
12 Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
Awo Ibulayimu n’avuunama mu maaso gaabwe bonna.
13 ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
N’agamba Efulooni, bonna nga bawulira nti, “Obanga okkirizza, nkusaba nsasule omuwendo gw’ennimiro gwonna ndyoke nziikewo mukazi wange.”
Efulooni n’addamu Ibulayimu nti,
15 “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
“Mpuliriza mukama wange, ennimiro esaana ebitundu by’effeeza ebikumi bina. Kale ekyo ki eri ab’omukwano? Twala ennimiro oziikemu abafu bo.”
16 Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
Ne bakkiriziganya, Ibulayimu kwe kusasula Efulooni ensimbi ze bakkirizaganya nga Abakiiti bonna balaba.
17 Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,
Olwo ennimiro ya Efulooni mu Makupeera, eyali ku luuyi olw’ebuvanjuba olwa Mamule, ennimiro awamu n’empuku eyalimu, n’emiti gyonna egyali mu nnimiro ekitundu kyonna ne bifuuka bya
18 ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.
Ibulayimu nga Abakiiti bonna abaafuluma mu mulyango gw’ekibuga balaba.
19 Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.
Oluvannyuma Ibulayimu n’aziika Saala mukazi we mu mpuku mu nnimiro ya Makupeera ku luuyi olw’ebuvanjuba bwa Mamule, ye Kebbulooni, mu nsi ya Kanani.
20 Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
Abakiiti ne bakwasa Ibulayimu ennimiro awamu n’empuku yaamu mu butongole okubeera obutaka bwe okuziikangamu abantu be.