< Jenesis 23 >

1 Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
Sarah lived one hundred twenty-seven years. This was the length of Sarah's life.
2 Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
Sarah died in Kiriath Arba (that is, Hebron), in the land of Canaan. Abraham came to mourn for Sarah, and to weep for her.
3 Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
Abraham rose up from before his dead, and spoke to the sons of Heth, saying,
4 “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
"I am a stranger and a foreigner living with you. Give me a possession of a burying-place with you, that I may remove my dead for burial."
5 Ụmụ Het zara Ebraham sị,
The sons of Heth answered Abraham, saying to him,
6 “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
"Hear us, my lord. You are a prince of God among us. Bury your dead in the best of our tombs. None of us will withhold from you his tomb to prevent you from burying your dead."
7 Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
Abraham rose up, and bowed himself to the people of the land, to the sons of Heth.
8 sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,
He talked with them, saying, "If you agree that I may remove my dead for burial, hear me, and approach Ephron the son of Zohar for me,
9 ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
that he may give me the cave of Machpelah, which he owns; it is at the end of his field. For the full price let him give it to me in your presence as a burial place."
10 Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
Now Ephron was sitting among the sons of Heth. Ephron the Hethite answered Abraham in the hearing of the sons of Heth, even of all who went in at the gate of his city, saying,
11 sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
"No, my lord, hear me. I give you the field, and I give you the cave that is in it. In the presence of the sons of my people I give it to you. Bury your dead."
12 Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
Abraham bowed himself down before the people of the land.
13 ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
He spoke to Ephron in the audience of the people of the land, saying, "But if you will, please hear me. I will give the price of the field. Take it from me, and I will bury my dead there."
14 Efrọn zara Ebraham,
Ephron answered Abraham, saying to him,
15 “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
"My lord, listen to me. What is a piece of land worth four hundred shekels of silver between me and you? Therefore bury your dead."
16 Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
Abraham listened to Ephron. Abraham weighed to Ephron the silver which he had named in the audience of the sons of Heth, four hundred shekels of silver, according to the current merchants' standard.
17 Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,
So the field of Ephron, which was in Machpelah, which was before Mamre, the field, the cave which was in it, and all the trees that were in the field, that were in all of its borders, were deeded
18 ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.
to Abraham as a possession in the presence of the sons of Heth, before all who went in at the gate of his city.
19 Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.
After this, Abraham buried Sarah his wife in the cave of the field of Machpelah before Mamre (that is, Hebron), in the land of Canaan.
20 Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
The field, and the cave that is in it, were deeded to Abraham as a possession for a burial place by the sons of Heth.

< Jenesis 23 >