< Jenesis 21 >

1 Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa.
INkosi yasimhambela uSara njengokukhuluma kwayo, njalo iNkosi yenza kuSara njengoba yayitshilo.
2 Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
USara wasethatha isisu, wamzalela indodana uAbrahama ebudaleni bakhe, ngesikhathi esimisiweyo uNkulunkulu abesitshilo kuye.
3 Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
UAbrahama wasesitha ibizo lendodana yakhe, eyazalelwa yena, uSara amzalela yona, wathi nguIsaka.
4 Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu.
UAbrahama wasesoka uIsaka indodana yakhe isilensuku eziyisificaminwembili, njengoba uNkulunkulu wamlaya.
5 Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
Njalo uAbrahama wayeleminyaka elikhulu lapho ezalelwa uIsaka indodana yakhe.
6 Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.”
USara wasesithi: UNkulunkulu ungenzele uhleko, wonke ozwayo uzahleka lami.
7 O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
Wathi futhi: Ngubani obengatsho kuAbrahama ukuthi: USara uzamunyisa abantwana? Ngoba ngimzalele indodana ebudaleni bakhe.
8 Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.
Umntwana wakhula, walunyulwa. UAbrahama wasesenza idili elikhulu mhla uIsaka elunyulwa.
9 Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo,
USara wasebona indodana kaHagari umGibhithekazi ayeyizalele uAbrahama ikloloda.
10 ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”
Ngakho wathi kuAbrahama: Xotsha lesisigqilikazi lendodana yaso; ngoba indodana yalesisigqilikazi kayiyikudla ilifa kanye lendodana yami, kanye loIsaka.
11 Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi.
Lalelilizwi laba libi kakhulu emehlweni kaAbrahama, ngenxa yendodana yakhe.
12 Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.
Kodwa uNkulunkulu wathi kuAbrahama: Kakungabi kubi emehlweni akho, ngenxa yomfana langenxa yesigqilikazi sakho; konke uSara azakutsho kuwe, lalela ilizwi lakhe, ngoba kuIsaka inzalo yakho izabizwa.
13 Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”
Kodwa lendodana yesigqilikazi ngizayenza ibe yisizwe, ngoba iyinzalo yakho.
14 Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.
Ngakho uAbrahama wavuka ekuseni kakhulu, wathatha isinkwa lesigxingi samanzi, wakunika uHagari, ekubeka emahlombe akhe, lomntwana, wamyekela wahamba. Wasehamba wazula enkangala iBherishebha.
15 Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa.
Amanzi esephelile esigxingini waphosela umntwana phansi kwesinye sezihlahlakazana.
16 Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.
Wasehamba wahlala phansi maqondana laye, esuka kuye khatshanyana, okungaba yikutshoka ngedandili; ngoba wathi: Kangingaboni ukufa komntwana. Wahlala maqondana laye, waphakamisa ilizwi lakhe wakhala inyembezi.
17 Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina.
UNkulunkulu wasesizwa ilizwi lomfana. Yasimemeza ingilosi kaNkulunkulu kuHagari isemazulwini, yathi kuye: Ulani, Hagari? Ungesabi, ngoba uNkulunkulu ulizwile ilizwi lomfana lapho akhona.
18 Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”
Sukuma, uphakamise umfana, umbambe ngesandla sakho; ngoba ngizamenza abe yisizwe esikhulu.
19 Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.
UNkulunkulu wasevula amehlo akhe, njalo wabona umthombo wamanzi; wahamba, wagcwalisa isigxingi ngamanzi, wamnathisa umfana.
20 Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
Njalo uNkulunkulu waba lomfana, wakhula, wahlala enkangala, waba ngumtshoki.
21 Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.
Wahlala enkangala iParani; unina wasemthathela umfazi elizweni leGibhithe.
22 Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme.
Kwasekusithi ngalesosikhathi uAbhimeleki loFikoli, induna yebutho yakhe, wakhuluma kuAbrahama wathi: UNkulunkulu ulawe kukho konke okwenzayo.
23 Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”
Ngakho-ke funga kimi lapha ngoNkulunkulu ukuthi kawuyikungikhohlisa mina kumbe indodana yami kumbe izizukulwana zami; njengomusa engikwenzele wona, yenza kimi, lelizweni ohlala kilo njengowemzini.
24 Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”
UAbrahama wasesithi: Mina ngizafunga.
25 Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
Kodwa uAbrahama wamsola uAbhimeleki ngenxa yomthombo wamanzi ebeziwuphangile izinceku zikaAbhimeleki.
26 Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
UAbhimeleki wasesithi: Angazi owenze le into; njalo lawe kawungitshelanga, futhi lami kangizwanga ngakho, ngaphandle kwalamuhla.
27 Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.
UAbrahama wasethatha izimvu lenkomo, wazinika uAbhimeleki; njalo bobabili benza isivumelwano.
28 Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
UAbrahama wabeka amawundlukazi omhlambi ayisikhombisa wodwa.
29 Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”
UAbhimeleki wasesithi kuAbrahama: Ayini lapha lamawundlukazi ayisikhombisa owabeke wodwa?
30 Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”
Wasesithi: Ngoba uzakwemukela esandleni sami amawundlukazi ayisikhombisa, ukuze abe yibufakazi kimi bokuthi lumthombo ngiwugebhile.
31 Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.
Ngakho wabiza leyondawo ngokuthi yiBherishebha, ngoba lapho bafunga bobabili.
32 Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia.
Ngakho benza isivumelwano eBherishebha. UAbhimeleki wasesukuma, loFikoli induna yebutho lakhe, babuyela elizweni lamaFilisti.
33 Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi.
Wasehlanyela isihlahla setamarisiki eBherishebha wabiza khona ibizo leNkosi, uNkulunkulu olaphakade.
34 Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge.
UAbrahama wasehlala njengowezizwe elizweni lamaFilisti insuku ezinengi.

< Jenesis 21 >