< Jenesis 16 >

1 Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega.
Now Sarai, Abram’s wife, bore him no children. She had a servant, an Egyptian, whose name was Hagar.
2 Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.” Ebram kweere ihe Serai kwuru.
Sarai said to Abram, “See now, the LORD has restrained me from bearing. Please go in to my servant. It may be that I will obtain children by her.” Abram listened to the voice of Sarai.
3 Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
Sarai, Abram’s wife, took Hagar the Egyptian, her servant, after Abram had lived ten years in the land of Canaan, and gave her to Abram her husband to be his wife.
4 Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime. Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya.
He went in to Hagar, and she conceived. When she saw that she had conceived, her mistress was despised in her eyes.
5 Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
Sarai said to Abram, “This wrong is your fault. I gave my servant into your bosom, and when she saw that she had conceived, she despised me. May the LORD judge between me and you.”
6 Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
But Abram said to Sarai, “Behold, your maid is in your hand. Do to her whatever is good in your eyes.” Sarai dealt harshly with her, and she fled from her face.
7 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,
The LORD’s angel found her by a fountain of water in the wilderness, by the fountain on the way to Shur.
8 jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
He said, “Hagar, Sarai’s servant, where did you come from? Where are you going?” She said, “I am fleeing from the face of my mistress Sarai.”
9 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”
The LORD’s angel said to her, “Return to your mistress, and submit yourself under her hands.”
10 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
The LORD’s angel said to her, “I will greatly multiply your offspring, that they will not be counted for multitude.”
11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Ị dị ime ugbu a, ị ga-amụ nwa nwoke. Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.
The LORD’s angel said to her, “Behold, you are with child, and will bear a son. You shall call his name Ishmael, because the LORD has heard your affliction.
12 Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ. Ọ ga-emegide onye ọbụla, onye ọbụla ga-emegidekwa ya. Ọ ga-ebi nʼime ibu iro, megide ụmụnna ya niile.”
He will be like a wild donkey among men. His hand will be against every man, and every man’s hand against him. He will live opposed to all of his brothers.”
13 Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
She called the name of the LORD who spoke to her, “You are a God who sees,” for she said, “Have I even stayed alive after seeing him?”
14 Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
Therefore the well was called Beer Lahai Roi. Behold, it is between Kadesh and Bered.
15 Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.
Hagar bore a son for Abram. Abram called the name of his son, whom Hagar bore, Ishmael.
16 Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
Abram was eighty-six years old when Hagar bore Ishmael to Abram.

< Jenesis 16 >