< Jenesis 15 >

1 Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
After these things the word of the LORD came to Abram in a vision, saying, Fear not, Abram: I am your shield, and your exceeding great reward.
2 Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”
And Abram said, LORD God, what will you give me, seeing I go childless, and the steward of my house is this Eliezer of Damascus?
3 Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.”
And Abram said, Behold, to me you have given no seed: and, see, one born in my house is my heir.
4 Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.”
And, behold, the word of the LORD came to him, saying, This shall not be your heir; but he that shall come forth out of your own bowels shall be your heir.
5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”
And he brought him forth abroad, and said, Look now toward heaven, and tell the stars, if you be able to number them: and he said to him, So shall your seed be.
6 Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume.
And he believed in the LORD; and he counted it to him for righteousness.
7 Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.”
And he said to him, I am the LORD that brought you out of Ur of the Chaldees, to give you this land to inherit it.
8 Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”
And he said, LORD God, whereby shall I know that I shall inherit it?
9 Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.”
And he said to him, Take me an heifer of three years old, and a she goat of three years old, and a ram of three years old, and a turtledove, and a young pigeon.
10 Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.
And he took to him all these, and divided them in the middle, and laid each piece one against another: but the birds divided he not.
11 Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha.
And when the fowls came down on the carcasses, Abram drove them away.
12 Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya.
And when the sun was going down, a deep sleep fell on Abram; and, see, an horror of great darkness fell on him.
13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ.
And he said to Abram, Know of a surety that your seed shall be a stranger in a land that is not theirs, and shall serve them; and they shall afflict them four hundred years;
14 Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta.
And also that nation, whom they shall serve, will I judge: and afterward shall they come out with great substance.
15 Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.
And you shall go to your fathers in peace; you shall be buried in a good old age.
16 Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”
But in the fourth generation they shall come here again: for the iniquity of the Amorites is not yet full.
17 Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee.
And it came to pass, that, when the sun went down, and it was dark, behold a smoking furnace, and a burning lamp that passed between those pieces.
18 Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.
In the same day the LORD made a covenant with Abram, saying, To your seed have I given this land, from the river of Egypt to the great river, the river Euphrates:
19 Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn,
The Kenites, and the Kenizzites, and the Kadmonites,
20 na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim,
And the Hittites, and the Perizzites, and the Rephaims,
21 na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”
And the Amorites, and the Canaanites, and the Girgashites, and the Jebusites.

< Jenesis 15 >