< Jenesis 12 >

1 Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị.
Now God had said to Abram, "Go out from your country, and from your relatives, and from your father's house, to the land that I will show you.
2 “Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị.
And I will make of you a great nation. And I will bless you and make your name great. And you will be a blessing.
3 Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
And I will bless those who bless you, and I will curse those who treat you with contempt, and through you all the families of the earth will be blessed."
4 Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije.
So Abram left, as God had told him, and Lot went with him. Abram was seventy-five years old when he departed from Haran.
5 O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ.
Abram took Sarai his wife, Lot his brother's son, and all their possessions that they had accumulated, and the people whom they had acquired in Haran, and they left to go to the land of Canaan. And they came to the land of Canaan,
6 Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ.
and Abram passed through the land to the place of Shechem, to the oak of Moreh. At that time the Canaanites were in the land.
7 Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.
Then God appeared to Abram and said to him, "I will give this land to your offspring." He built an altar there to God, who appeared to him.
8 Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.
He left from there to the mountain on the east of Bethel, and pitched his tent, having Bethel on the west, and Ai on the east. There he built an altar and called on the name of God.
9 Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.
And Abram traveled on, continuing toward the Negev.
10 Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge.
There was a famine in the land, so Abram went down into Egypt to sojourn there, because the famine was severe in the land.
11 Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.
It happened, when he had come near to enter Egypt, that he said to Sarai his wife, "Look, I know what a beautiful woman you are.
12 Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.
It will happen, when the Egyptians will see you, that they will say, 'This is his wife.' And they will kill me, but they will let you live.
13 Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”
Please say that you are my sister, that it may be well with me for your sake, and that I may live because of you."
14 Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma.
It happened that when Abram had come into Egypt, the Egyptians saw that the woman was very beautiful.
15 Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero.
The princes of Pharaoh saw her, and praised her to Pharaoh; and the woman was taken into the household of Pharaoh.
16 Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.
He dealt well with Abram for her sake, and he acquired sheep, cattle, male donkeys, male servants, female servants, female donkeys, and camels.
17 Ma Onyenwe anyị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram.
But God plagued Pharaoh and his house with great and grievous plagues because of Sarai, Abram's wife.
18 Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị?
Pharaoh summoned Abram and said, "What is this that you have done to me? Why did you not tell me that she was your wife?
19 Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwanyị, si otu a mee m ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Ugbu a, lee nwunye gị, kpọrọ ya laa.”
Why did you say, 'She is my sister,' so that I took her to be my wife? Now therefore, look, your wife is before you. Take, and go."
20 Fero nyere iwu banyere Ebram na ndị ikom so ya. Ha zilagara ya, ya na nwunye ya, na ihe niile o nwere.
Pharaoh commanded men concerning him, and they sent him away with his wife and all his possessions.

< Jenesis 12 >