< Jenesis 10 >
1 Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
Hawa ndio wazao wa Noa: Shemu, Hamu na Yafethi, ambao walizaa wana baada ya gharika.
2 Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
Wana wa Yafethi walikuwa: Gomeri, Magogu, Madai, Yavani, Tubali, Mesheki na Tirasi.
3 Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
Wana wa Gomeri walikuwa: Ashkenazi, Rifathi na Togarma.
4 Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
Wana wa Yavani walikuwa: Elisha, Tarshishi, Kitimu na Rodanimu.
5 (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
(Kutokana na hawa mataifa ya Pwani yalienea katika nchi zao, kwa koo zao katika mataifa yao, kila moja kwa lugha yake.)
6 Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
Wana wa Hamu walikuwa: Kushi, Misraimu, Putu na Kanaani.
7 Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
Wana wa Kushi walikuwa: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Wana wa Raama walikuwa: Sheba na Dedani.
8 Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
Kushi akamzaa Nimrodi, ambaye alikua akawa mtu shujaa duniani.
9 Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
Alikuwa mwindaji hodari mbele za Bwana. Ndiyo sababu watu husema, “Kama Nimrodi, hodari wa kuwinda mbele za Bwana.”
10 Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.
Vituo vyake vya kwanza katika ufalme wake vilikuwa Babeli, Ereki, Akadi na Kalne katika Shinari.
11 Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
Kutoka nchi ile alikwenda Ashuru, ambako alijenga Ninawi, Rehoboth-iri, Kala,
12 na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
na Reseni, iliyo kati ya Ninawi na Kala; huo ndio mji mkubwa.
13 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
Misraimu alikuwa baba wa: Waludi, Waanami, Walehabi, Wanaftuhi,
14 ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
Wapathrusi, Wakasluhi (hao ndio asili ya Wafilisti), na Wakaftori.
15 Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
Kanaani alikuwa baba wa: Sidoni mzaliwa wake wa kwanza, Hethi,
16 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
Wayebusi, Waamori, Wagirgashi,
17 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
Wahivi, Waariki, Wasini,
18 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara,
Waarvadi, Wasemari na Wahamathi. Baadaye koo za Wakanaani zilitawanyika,
19 oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
na mipaka ya Kanaani ilienea kutoka Sidoni kuelekea Gerari hadi Gaza, kisha kuelekea Sodoma, Gomora, Adma na Seboimu, hadi kufikia Lasha.
20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
Hawa ni wana wa Hamu kwa koo zao na lugha zao, katika nchi zao na mataifa yao.
21 A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
Shemu ambaye ni ndugu mkubwa wa Yafethi, kwake kulizaliwa wana pia. Shemu alikuwa baba wa wana wote wa Eberi.
22 Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
Wana wa Shemu walikuwa: Elamu, Ashuru, Arfaksadi, Ludi na Aramu.
23 Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.
Wana wa Aramu walikuwa: Usi, Huli, Getheri na Mesheki.
24 Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba.
Arfaksadi alikuwa baba wa Shela, naye Shela akamzaa Eberi.
25 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
Eberi akapata wana wawili: Mmoja wao aliitwa Pelegi, kwa kuwa wakati wake ndipo dunia iligawanyika; nduguye aliitwa Yoktani.
26 Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
Yoktani alikuwa baba wa: Almodadi, Shelefu, Hasarmawethi, Yera,
29 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
Ofiri, Havila na Yobabu. Hawa wote walikuwa wana wa Yoktani.
30 Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
Nchi waliyoishi ilienea toka Mesha kuelekea Sefari kwenye nchi ya vilima iliyoko mashariki.
31 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
Hao ndio wana wa Shemu kwa koo zao na lugha zao, katika nchi zao na mataifa yao.
32 Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
Hizi ndizo koo za wana wa Noa, kufuatana na vizazi vyao, katika mataifa yao. Kutokana na hawa mataifa yalienea duniani kote baada ya gharika.