< Jenesis 10 >

1 Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
ノアの子セム、ハム、ヤペテの系図は次のとおりである。洪水の後、彼らに子が生れた。
2 Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
ヤペテの子孫はゴメル、マゴグ、マダイ、ヤワン、トバル、メセク、テラスであった。
3 Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
ゴメルの子孫はアシケナズ、リパテ、トガルマ。
4 Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
ヤワンの子孫はエリシャ、タルシシ、キッテム、ドダニムであった。
5 (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
これらから海沿いの地の国民が分れて、おのおのその土地におり、その言語にしたがい、その氏族にしたがって、その国々に住んだ。
6 Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
ハムの子孫はクシ、ミツライム、プテ、カナンであった。
7 Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
クシの子孫はセバ、ハビラ、サブタ、ラアマ、サブテカであり、ラアマの子孫はシバとデダンであった。
8 Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
クシの子はニムロデであって、このニムロデは世の権力者となった最初の人である。
9 Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
彼は主の前に力ある狩猟者であった。これから「主の前に力ある狩猟者ニムロデのごとし」ということわざが起った。
10 Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.
彼の国は最初シナルの地にあるバベル、エレク、アカデ、カルネであった。
11 Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
彼はその地からアッスリヤに出て、ニネベ、レホボテイリ、カラ、
12 na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
およびニネベとカラとの間にある大いなる町レセンを建てた。
13 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
ミツライムからルデ族、アナミ族、レハビ族、ナフト族、
14 ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
パテロス族、カスル族、カフトリ族が出た。カフトリ族からペリシテ族が出た。
15 Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
カナンからその長子シドンが出て、またヘテが出た。
16 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
その他エブスびと、アモリびと、ギルガシびと、
17 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
ヒビびと、アルキびと、セニびと、
18 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara,
アルワデびと、ゼマリびと、ハマテびとが出た。後になってカナンびとの氏族がひろがった。
19 oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
カナンびとの境はシドンからゲラルを経てガザに至り、ソドム、ゴモラ、アデマ、ゼボイムを経て、レシャに及んだ。
20 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
これらはハムの子孫であって、その氏族とその言語とにしたがって、その土地と、その国々にいた。
21 A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
セムにも子が生れた。セムはエベルのすべての子孫の先祖であって、ヤペテの兄であった。
22 Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
セムの子孫はエラム、アシュル、アルパクサデ、ルデ、アラムであった。
23 Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.
アラムの子孫はウヅ、ホル、ゲテル、マシであった。
24 Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba.
アルパクサデの子はシラ、シラの子はエベルである。
25 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
エベルにふたりの子が生れた。そのひとりの名をペレグといった。これは彼の代に地の民が分れたからである。その弟の名をヨクタンといった。
26 Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
ヨクタンにアルモダデ、シャレフ、ハザルマウテ、エラ、
27 Hadoram, Ụzal, Dikla,
ハドラム、ウザル、デクラ、
28 Obal, Abimael, Sheba,
オバル、アビマエル、シバ、
29 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
オフル、ハビラ、ヨバブが生れた。これらは皆ヨクタンの子であった。
30 Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
彼らが住んだ所はメシャから東の山地セパルに及んだ。
31 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
これらはセムの子孫であって、その氏族とその言語とにしたがって、その土地と、その国々にいた。
32 Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
これらはノアの子らの氏族であって、血統にしたがって国々に住んでいたが、洪水の後、これらから地上の諸国民が分れたのである。

< Jenesis 10 >