< Ndị Galeshịa 1 >

1 Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.
PAUL the apostle (not sent from men, nor by man, but by Jesus Christ, and our Father who raised him from the dead),
2 Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.
and all the brethren with me, to the churches of Galatia:
3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
grace unto you, and peace from God the Father and our Lord Jesus Christ;
4 Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. (aiōn g165)
who gave himself for our sins, that he might pluck us out of this present wicked world, according to the will of God and our Father: (aiōn g165)
5 Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
to whom be glory for ever and ever. Amen. (aiōn g165)
6 O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ,
I marvel that ye are so quickly departed from him that called you, by the grace of Christ into another gospel
7 nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.
which is not another; but there are certain persons who trouble you, and desire to pervert the gospel of Christ.
8 A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.
But though even we, or an angel from heaven, preach unto you another gospel, different from that which we have preached to you, let him be an anathema.
9 Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.
As we have before spoken, and I now repeat it again, If any man preach a gospel different from that ye have received, let him be anathema.
10 Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
For do I now use persuasions from men, or from God? or do I seek to please men? for if I yet pleased men, I should not be the servant of Christ.
11 Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya.
But I give you to understand, brethren, that the gospel which was preached by me is not a merely human ministry.
12 Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
For I neither received it from man, nor was taught, but by immediate revelation from Jesus Christ.
13 Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya.
For ye have heard of my former manner of life, when I professed Judaism, that in the most outrageous manner I persecuted the church of God, and wasted it:
14 Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha.
and signalized myself in Judaism above many of those of my own age among my countrymen, being more exceedingly a zealot for the traditions of my fathers.
15 Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya,
But when it pleased God, who selected me from my mother’s womb, and called me by his grace,
16 ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
to reveal his Son in me, that I might preach the glad tidings of him to the nations, immediately I conferred not with flesh and blood,
17 Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs.
nor went up to Jerusalem to those who were apostles before me; but I went away into Arabia, and returned again unto Damascus.
18 Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise.
Afterwards at the expiration of three years I went up unto Jerusalem to pay a visit to Peter, and I abode with him fifteen days.
19 Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
But I saw no other of the apostles except James, the Lord’s brother.
20 Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha.
Now respecting the things which I write unto you, behold, in the presence of God, I lie not.
21 Emesịa, agara m Siria na Silisia.
Afterwards I went into the regions of Syria and Cilicia;
22 Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ.
and I was personally unknown to the churches of Judea, which are in Christ:
23 Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.”
only they had heard, that he who persecuted us in time past, now preaches the faith which he once laid waste.
24 Ha nyere Chineke otuto nʼihi m.
And they glorified God on my behalf.

< Ndị Galeshịa 1 >