< Ndị Galeshịa 6 >
1 Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
Brothers, even if a man may be overtaken in any trespass, you who [are] spiritual restore such a one in a spirit of meekness, considering yourself—lest you also may be tempted.
2 Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Bear the burdens of one another, and so fill up the law of the Christ,
3 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
for if anyone thinks [himself] to be something—being nothing—he deceives himself;
4 Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
and let each one prove his own work, and then he will have the glorying in regard to himself alone, and not in regard to the other,
5 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
for each one will bear his own burden.
6 Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
And let him who is instructed in the word share with him who is instructing in all good things.
7 Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
Do not be led astray: God is not mocked; for what a man may sow—that he will also reap,
8 Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
because he who is sowing to his own flesh, of the flesh will reap corruption; and he who is sowing to the Spirit, of the Spirit will reap continuous life; (aiōnios )
9 Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
and in doing good we should not be weary, for at the proper time we will reap—not desponding;
10 Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
therefore, then, as we have opportunity, may we work the good to all, and especially to those of the household of faith.
11 Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
You see in how large letters I have written to you with my own hand;
12 Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
as many as are willing to make a good appearance in the flesh, these constrain you to be circumcised—only that they may not be persecuted for the Cross of the Christ,
13 Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
for neither do those circumcised keep the Law themselves, but they wish you to be circumcised, that they may glory in your flesh.
14 Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
And for me, let it not be—to glory, except in the Cross of our Lord Jesus Christ, through which the world has been crucified to me, and I to the world;
15 Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
for in Christ Jesus neither circumcision avails anything, nor uncircumcision, but a new creation;
16 Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
and as many as walk by this rule—peace on them, and kindness, and on the Israel of God!
17 Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
From now on, let no one give me trouble, for I carry the scars of the Lord Jesus in my body.
18 Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
The grace of our Lord Jesus Christ [is] with your spirit, brothers! Amen.