< Ndị Galeshịa 6 >
1 Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
Mri ya, inde ba vu indji asi ti lahtre, u biyi wa bi he ni Ruhu ndindi'a, bi ka nji indji'a ye ni tu nkoh Ruhu tsatsar. I wu, wuka mla yah tume, duna ri mi tron na.
2 Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Bika ban yah kpa-mbi, nakima bi hu tron Almasihu.
3 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
Nakima inde ko nha ni ya ndi wawu hi kpe, alhali ana kpe na, asi gyuru tuma.
4 Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
Ko nha ka tsra tu ma toh, naki ani toh kpe wa ani kpon ni wu, duna ban tume na wu zan ndrjo ri, ko wu tsra ni ndrjo na.
5 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
Nakima ko nha ni ban ron kpima.
6 Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
Wa ba tsro itre anaki ani guchi ri amfani ikpi ma bi bin wa wu'u ni ndji wa a tsro'a.
7 Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
Na duba gyuru yi na bana zan Irji na. Naki ikpe wa ndji'a chu, ani chan kima i.
8 Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
Nakima wa'a chu ni lahtre, ani chan me me, ama indji wa a chu ni Ruhu ndindi, ani chan dri u se ka kle ni Ruhu ndindi (aiōnios )
9 Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
Kina tie die ni ti ndindi na, naki ni toh wa abi ki chan, inde kina die na.
10 Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
Naki inde ki he ni toh kika tie ndindi ni ko-nha. Ki ti ndindi masama ni biwa ba he ni mi njanji.
11 Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
Ya gbugbu imbe wa mi nha ni yiwu ni wo mu.
12 Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
Biwa bason ndi duba tsro hali ndindima ni mi kpa, baba i basi tie yi yah du ba you gjin ni yiwu. Basi tie nakima ni ka ngrji ba don duba na tie ba yah na ni tu giciye Almasihu.
13 Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
Don biwa ba you gji ni bawu bana hu tron a na. Nakima ba son duba you gji ni nyu, don duba na wru wo nisan ni kpa-mba na.
14 Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
Mina wru wo ni san na, se ni giciye Bachi mbu Yesu Almasihu, ni tuma ba klo gbungblu ni mu, i me me ni gbungblu.
15 Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
Nakima you gji ni hama, gji ana kpe na, ni yu'u kima Ite sa'a ma ahe ni muhiminci.
16 Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
Ngye bi wa ba sun ni mi kaida du si suron ni shishi u lo suron ka he ni ba, nitu Israila u Irji.
17 Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
Ni zizan hi koshishi du ndrjo ri kana dame ni me na don mi ban tagia u Yesu hi kpa mu.
18 Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Ndindi u Bachi-mbu Yesu Almasihu ka sun ni Ruhu ndindi bi mri yah, Amin.