< Ndị Galeshịa 5 >

1 Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
Protož v svobodě, kterouž Kristus nás osvobodil, stůjte a nezapletejtež se zase v jho služebnosti.
2 Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
Aj, já Pavel pravím vám, že budete-li se obřezovati, Kristus vám nic neprospěje.
3 Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
A zase osvědčuji všelikému člověku, kterýž se obřezuje, že jest povinen všecken Zákon naplniti.
4 E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.
Odcizili jste se Krista, kteřížkoli v Zákoně ospravedlněni býti hledáte; vypadli jste z milosti.
5 Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị.
My zajisté duchem z víry, naděje spravedlnosti očekáváme.
6 Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.
Nebo v Kristu Ježíši ani obřízka neprospívá, ani neobřízka, ale víra skrze lásku dělající.
7 Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
Běželi jste dobře. Kdo jest vám překazil, abyste pravdy neposlouchali?
8 Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
Neníť ta rada z toho, kterýž vás volá.
9 Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
Maličko kvasu všecko těsto nakvašuje.
10 Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
Jáť mám naději o vás v Pánu, že nic jiného smýšleti nebudete; ale ten, jenž kormoutí vás, trpěti bude soud, kdožť jest on koli.
11 Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe.
Já pak, bratří, káži-li také obřízku, i pročež protivenství trpím? Tedy jest vyprázdněno pohoršení kříže.
12 Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ na-esogbu unu ga-eme onwe ha ndị onozi.
Ó by raději odřezáni byli, kteříž vás nepokojí.
13 Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.
Nebo vy v svobodu povoláni jste, bratří, toliko abyste té svobody nepokládali sobě za zámysl povolování tělu, ale skrze lásku posluhujte sobě vespolek.
14 Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”
Nebo všecken Zákon v jednom slovu se zavírá, totiž v tom: Milovati budeš bližního svého jako sebe samého.
15 Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.
Pakli se vespolek koušete a žerete, hleďtež, abyste jedni od druhých zkaženi nebyli.
16 Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
Ale pravímť: Duchem choďte, a žádosti těla nevykonáte.
17 Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
Nebo tělo žádá proti Duchu, a Duch proti tělu. Ty pak věci jsou sobě vespolek odporné, tak abyste ne hned, což byste chtěli, to činili.
18 Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu.
Jestliže pak Duchem vedeni býváte, nejste pod Zákonem.
19 Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
Zjevníť jsou pak skutkové těla, jenž jsou: Cizoložstvo, smilstvo, nečistota, chlipnost,
20 Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
Modloslužba, čarování, nepřátelství, svárové, nenávisti, hněvové, dráždění, různice, sekty,
21 Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
Závisti, vraždy, opilství, hodování, a těm podobné věci. Kteréžto kdožkoli činí, toť vám předpovídám, jakož jsem i prve pravil, že království Božího dědicové nebudou.
22 Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
Ovoce pak Ducha jestiť: Láska, radost, pokoj, tichost, dobrotivost, dobrota, věrnost, krotkost, středmost.
23 ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
Proti takovýmť není Zákon.
24 Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
Nebo kteříž jsou Kristovi, tiť jsou tělo své ukřižovali s vášněmi a s žádostmi.
25 Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
Jsme-liť tedy Duchem živi, Duchem i choďme.
26 Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị.
Nebývejme marné chvály žádostivi, jedni druhých popouzejíce a jedni druhým závidíce.

< Ndị Galeshịa 5 >