< Ndị Galeshịa 2 >

1 Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee.
Emva kweminyaka elitshumi lane ngaya eJerusalema futhi, ngalesisikhathi ngangiloBhanabhasi. Ngathatha loThithu futhi.
2 Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.
Ngaya khona njengokwambulelwa ngethula phambi kwabo ivangeli engilitshumayela kwabeZizweni. Kodwa lokhu ngakwenza ngasese kulabo ababekhanya bengabakhokheli. Ngangifuna ukuba lesiqiniseko sokuthi angigijimeli ize.
3 Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
Ikanti loThithu owayelami kazange abanjwe ngamandla ukuba asoke lanxa wayengumGrikhi.
4 Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
Indaba le yavela ngoba abanye abazalwane bamanga basebengene phakathi kwethu ukuba bahlole ukukhululeka esilakho kuKhristu uJesu ukuze basenze izigqili.
5 Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
Kasibavumelanga lakancane ukuze iqiniso levangeli lihlale likhona kini.
6 Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.
Labo ababeqakathekiswa, loba beyilokho ababeyikho khona akwenzi mahluko kimi; uNkulunkulu kahluleli ngokubonakala ngaphandle, labobantu kabengezanga lutho elizwini lami.
7 Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.
Esikhundleni salokho babona ukuthi ngangiphiwe umsebenzi wokutshumayela ivangeli kwabeZizweni njengoPhethro owaphiwa umsebenzi wokutshumayela ivangeli kwabasokiweyo.
8 Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.
Ngoba uNkulunkulu, owayesebenza kuPhethro njengompostoli kwabasokiweyo, wayesebenza kimi futhi ekutshumayeleni kwami njengompostoli kwabeZizweni.
9 Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.
UJakhobe, loKhefasi kanye loJohane, abadume njengensika, banika mina loBhanabhasi ilungelo lokuhlanganyela labo lapho sebebone umusa engawuphiwayo. Bavuma ukuthi siye kwabeZizweni, bona baye kwabasokiweyo.
10 Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.
Abakucelayo kuphela nje yikuthi siqhubeke sikhumbula abayanga, yona kanye into engangitshisekela ukuyenza.
11 Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.
Ekufikeni kukaKhefasi e-Antiyokhi ngamphikisa sikhangelene ngoba wayesoleka.
12 Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
Ngaphambilini kwafika abantu abathile bevela kuJakhobe owayevame ukudla labeZizweni. Kodwa sebefikile waqalisa ukuhlehlela emuva, wazehlukanisa labeZizweni ngoba wayesesaba ababengabeqembu lokusoka.
13 Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya.
Amanye amaJuda lawo ahlanganyela laye kulokhukuzenzisa kwakhe, kwaze kwathi ngenxa yokuzenzisa kwawo uBhanabhasi waholelwa ekulahlekeni.
14 Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
Kwathi lapho ngibona ukuba babengenzi okuhambelana leqiniso levangeli, ngathi kuKhefasi phambi kwabo bonke, “Wena ungumJuda kodwa uphila njengoweZizweni hatshi njengomJuda. Pho kwenzeka njani ukuba ubambe ngamandla abeZizweni ukuba balandele imikhuba yamaJuda na?
15 Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie,
Thina esingamaJuda ngokuzalwa hatshi ‘izoni zeZizweni’
16 ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.
siyakwazi ukuthi umuntu kalungisiswa yikugcina umthetho kodwa yikukholwa kuJesu Khristu. Ngakho-ke, lathi futhi, sibeke ukukholwa kwethu kuKhristu uJesu ukuba silungiswe yikukholwa kuKhristu hatshi ngokugcina umthetho ngoba kakho ozalungisiswa ngokugcina umthetho.
17 Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!
Kodwa nxa sisafuna ukulungisiswa kuKhristu, kube sokubonakala ukuthi thina ngokwethu siyizoni, lokho kutsho ukuthi uKhristu usekela isono na? Akunjalo lakancane!
18 Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.
Nxa ngikwakha kutsha lokho engakudilizayo, ngibonakalisa ukuthi ngiyisaphulamthetho.
19 Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.
Ngoba ngomthetho ngafa emthethweni ukuze ngiphilele uNkulunkulu.
20 Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
Sengibethelwe kanye loKhristu, akuseyimi engiphilayo, kodwa uKhristu uphila phakathi kwami. Ukuphila engikuphila emzimbeni, ngikuphila ngokukholwa eNdodaneni kaNkulunkulu, eyangithandayo njalo yazinikela ngenxa yami.
21 Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.
Kangiwudeli umusa kaNkulunkulu ngoba nxa ukulunga kuzuzwa ngomthetho, uKhristu wafela ize.”

< Ndị Galeshịa 2 >