< Ndị Galeshịa 2 >

1 Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee.
Senere, efter fjorten Års Forløb, drog jeg atter op til Jerusalem med Brnabas og tog også Titus med.
2 Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.
Men jeg drog op ifølge en Åbenbaring og forelagde dem, men særskilt de ansete, det Evangelium, som jeg prædiker iblandt Hedningerne, - om jeg vel løber eller har løbet forgæves.
3 Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
Men end ikke min Ledsager, Titus, som var en Græker, blev tvungen til at omskæres,
4 Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
nemlig for de indsnegne falske Brødres Skyld, som jo havde listet sig ind for at lure på vor Frihed, som vi have i Kristus Jesus, for at de kunde gøre os til Trælle.
5 Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
For dem vege vi end ikke et Øjeblik i Eftergivenhed, for at Evangeliets Sandhed måtte blive varig hos eder.
6 Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.
Men fra deres Side, som ansås for at være noget, (hvordan de fordum vare, er mig uden Forskel; Gud ser ikke på et Menneskes Person; ) - over for mig nemlig havde de ansete intet at tilføje.
7 Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.
Men tværtimod, da de så, at jeg har fået Evangeliet til de uomskårne betroet, ligesom Peter til de omskårne,
8 Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.
(thi han, som gav Peter Kraft til Apostelgerning for de omskårne, gav også mig Kaft dertil for Hedningerne; )
9 Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.
og da de lærte den mig givne Nåde at kende, gave Jakob og Kefas og Johannes, som ansås for at være Søjler, mig og Barnabas Samfundshånd for at vi skulde gå til Hedningerne og de til de omskårne;
10 Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.
kun at vi skulde komme de fattige i Hu, hvad jeg også just har bestræbt mig for at gøre.
11 Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.
Men da Kefas kom til Antiokia, trådte jeg op imod ham for hans åbne Øjne, thi domfældt var han.
12 Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
Thi førend der kom nogle fra Jakob, spiste han sammen med Hedningerne; men da de kom, trak han sig tilbage og skilte sig fra dem af Frygt for dem af Omskærelsen.
13 Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya.
Og med ham hyklede også de øvrige Jøder, så at endog Barnabas blev dragen med af deres Hykleri.
14 Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
Men da jeg så, at de ikke vandrede rettelig efter Evangeliets Sandhed, sagde jeg til Kefas i alles Påhør: Når du, som er en Jøde, lever på hedensk og ikke på jødisk Vis, hvor kan du da tvinge Hedningerne til at opføre sig som Jøder?
15 Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie,
Vi ere af Natur Jøder og ikke Syndere af hedensk Byrd;
16 ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.
men da vi vide, at et Menneske ikke bliver retfærdiggjort af Lovens Gerninger, men kun ved Tro på Jesus Kristus, så have også vi troet på Kristus Jesus, for at vi måtte blive retfærdiggjorte al Tro på Kristus og ikke af Lovens Gerninger; thi af Lovens Geringer skal intet Kød blive retfærdiggjort.
17 Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!
Men når vi, idet vi søgte at blive retfærdiggjorte i Kristus, også selv fandtes at være Syndere, så er jo Kristus en Tjener for Synd? Det være langtfra!
18 Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.
når jeg nemlig igen bygger det op, som jeg nedbrød, da viser jeg mig selv som Overtræder.
19 Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.
Thi jeg er ved Loven død fra Loven, for at jeg skal leve for Gud.
20 Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
Med Kristus er jeg korsfæstet, og det er ikke mere mig, der lever, men Kristus lever i mig; men hvad jeg nu lever, i Kødet, det lever jeg i Troen, på Guds Søn, som elskede mig og gav sig selv hen for mig.
21 Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.
Jeg ophæver ikke Guds Nåde; thi er der Retfærdighed ved Loven, da er jo Kristus død forgæves.

< Ndị Galeshịa 2 >