< Ndị Galeshịa 1 >

1 Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.
UPawuli umphostoli ongaveli ebantwini, njalo kungekho ngomuntu, kodwa ngoJesu Kristu, langoNkulunkulu uYise owamvusa kwabafileyo,
2 Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.
labazalwane bonke abalami, kumabandla eGalathiya:
3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Umusa kawube kini lokuthula okuvela kuNkulunkulu uBaba, leNkosini yethu uJesu Kristu,
4 Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. (aiōn g165)
owazinikela ngenxa yezono zethu, ukuze asophule kulo umhlaba omubi wakhathesi, ngokwentando kaNkulunkulu loBaba wethu; (aiōn g165)
5 Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
obukuye ubukhosi kuze kube nini lanini. Ameni. (aiōn g165)
6 O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ,
Ngiyamangala ukuthi limhlamuke masinyane kangaka lowo owalibizela emuseni kaKristu, laya kwelinye ivangeli;
7 nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.
elingeyisilo elinye; kodwa bakhona abanye abalididayo bethanda ukuhlanekela ivangeli likaKristu.
8 A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.
Kodwa lanxa kungaba yithi kumbe ingilosi evela ezulwini engalitshumayeza ivangeli elehlukene lalelo esalitshumayeza lona, kayibe yisiqalekiso.
9 Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.
Njengoba sesitshilo, lakhathesi ngiyaphinda ngithi: Uba umuntu elitshumayeza ivangeli elehlukene lalelo elalemukelayo, kabe yisiqalekiso.
10 Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
Ngoba ngincenga abantu loba uNkulunkulu khathesi yini? Kumbe ngidinga ukuthokozisa abantu yini? Ngoba uba ngisathokozisa abantu, ngingebe yinceku kaKristu.
11 Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya.
Kodwa ngiyalazisa, bazalwane, ivangeli elatshunyayelwa yimi, ukuthi alinjengokomuntu.
12 Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
Ngoba lami kangilemukelanga emuntwini, futhi kangilifundiswanga, kodwa ngokwembulelwa kukaJesu Kristu.
13 Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya.
Ngoba selizwile ukuhamba kwami kwakuqala kobuJuda, ukuthi ngalizingela kakhulukazi sibili ibandla likaNkulunkulu, njalo ngangilichitha;
14 Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha.
njalo ngangiphumelela kubuJuda ngaphezu kwabanengi abayintanga yami esizweni sami, ngatshisekela ngokwengeziweyo amasiko abobaba.
15 Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya,
Kodwa nxa kwaba kuhle kuNkulunkulu, owangehlukanisa kusukela esizalweni sikamama, wangibiza ngomusa wakhe,
16 ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
ukwembula iNdodana yakhe kimi, ukuze ngiyitshumayele phakathi kwabezizwe, khona lapho kangelulekananga lenyama legazi;
17 Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs.
futhi kangenyukelanga eJerusalema kubo ababengabaphostoli ngaphambi kwami, kodwa ngasuka ngaya eArabhiya, ngasengiphinda ngibuyela eDamaseko.
18 Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise.
Emva kwalokho sekwedlule iminyaka emithathu ngenyukela eJerusalema ukuyabonana loPetro, ngasengihlala laye insuku ezilitshumi lanhlanu.
19 Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
Kodwa kangibonanga lamunye wabaphostoli, ngaphandle kukaJakobe umfowabo weNkosi.
20 Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha.
Lezinto engilibhalela zona, khangelani, phambi kukaNkulunkulu, kangiqambi manga.
21 Emesịa, agara m Siria na Silisia.
Emva kwalokho ngaya ezabelweni zeSiriya lezeKilikhiya.
22 Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ.
Njalo ngangingakaziwa ngobuso emabandleni eJudiya ayekuKristu;
23 Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.”
kodwa ayesizwa nje ukuthi: Owake wasizingela, usetshumayela ukholo owake waluchitha,
24 Ha nyere Chineke otuto nʼihi m.
asedumisa uNkulunkulu kimi.

< Ndị Galeshịa 1 >