< Ezra 9 >

1 Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.
И егда совершена быша сия, приступиша ко мне князие, глаголюще: не отлучишася людие Израилевы и священницы и левити от людий земных, (но) в мерзостех их (суть), иже суть Хананее, Еффее, Ферезее, Иевусее, Аммонитяне, Моавитяне и Мосеритяне и Аморреане,
2 Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.”
понеже пояша от дщерей их себе и сыном своим, и смесися семя святое с людьми земными, и рука князей и воевод в преступлении сем в начале.
3 Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
И егда услышах словеса сия, раздрах ризы моя, и вострепетах, и терзах власы главы моея и брады моея, и седох тужа.
4 Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.
И собрашася ко мне вси боящиися слова Бога Израилева за преступление пришедших от пленения, и аз седях прискорбен даже до жертвы вечерния.
5 Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m
И в жертву вечернюю востах от сетования моего, и внегда раздрах ризы моя, и трепетах, и преклоних колена моя, и прострох руце мои ко Господу Богу моему
6 nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.
и рекох: Господи Боже мой, стыждуся и срамляюся воздвигнути лице мое к Тебе, яко беззакония наша умножишася паче глав наших, и прегрешения наша возрастоша даже до небесе:
7 Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa.
от дний отец наших в преступлении велицем есмы даже до дне сего, и в беззакониих наших предани есмы мы и царие наши и священницы наши и сынове наши в руку царей языческих, в мечь и в пленение, и в расхищение и в стыдение лица нашего, якоже в день сей:
8 “Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị.
и ныне умилостивися над нами Бог наш, еже оставити ны во спасение и дати нам твердость на месте святыни Его, еже просветити очеса наша и дати оживление малое в работе нашей:
9 Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.
яко раби есмы, и в работе нашей не остави нас Господь Бог наш: и преклони на нас милосердие пред цари Персскими, дати нам живот, еже воздвигнути им дом Богу нашему и возставити запустевшая его, и дати нам ограждение во Иудеи и Иерусалиме:
10 “Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị,
и ныне что речем, Боже наш, по сем? Яко оставихом повеления Твоя,
11 nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.
яже дал еси нам рукою раб Твоих пророков, глаголя: земля, на нюже вы входите наследити ю, земля нечиста есть, по нечистоте людий языческих, в мерзостех их, имиже наполниша ю от уст даже до уст во сквернениих своих,
12 Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’
и ныне дщерей ваших не дадите сыном их и дщерей их не приемлите сыновом вашым, и не ищите мира их и блага их даже до века, яко да укрепитеся и снесте благая земли, и наследие дадите сыновом вашым даже до века:
13 “Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ.
и по всех, яже приидоша на нас в делех наших злых и гресе нашем велицем, понеже несть якоже Бог наш, иже избавил еси нас от беззаконий наших и дал еси нам спасение:
14 Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye?
зане обратихомся разорити заповеди Твоя и смеситися с людьми земными: не прогневайся на нас даже до скончания, еже не быти останку и спасаемому:
15 Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”
Господи Боже Израилев, праведен еси Ты, яко остахомся спасени, якоже день сей: се, мы пред Тобою есмы вси в беззакониих наших, понеже не возможно стати пред Тобою сего ради.

< Ezra 9 >