< Ezra 8 >

1 Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:
Ava ndivo vakuru vemhuri naavo vakanyorwa pamwe chete navo vakauya pamwe chete neni kubva kuBhabhironi panguva yokutonga kwaMambo Atazekisesi:
2 ndị ikwu Finehaz, Geshọm; ndị ikwu Itama, Daniel; ndị ikwu Devid, Hatush
kuzvizvarwa zvaFinehasi, Gerishomi; kuzvizvarwa zvaItamari, Dhanieri; kuzvizvarwa zvaDhavhidhi, Hatushi
3 ndị ikwu Shekanaya; ndị ikwu Parosh, Zekaraya na narị mmadụ na iri ise ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ.
akabva kuzvizvarwa zvaShekania; kuzvizvarwa zvaParoshi, Zekaria, uye pamwe chete naye kwakanyorwa varume zana namakumi mashanu;
4 Ndị ikwu Pahat-Moab, Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ,
kuzvizvarwa zvaPahati-Moabhu, Eriehoenai mwanakomana waZekaria, uye pamwe chete naye varume mazana maviri;
5 ndị ikwu Zatu, Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ so ya.
kuzvizvarwa zvaZatu, Shekania mwanakomana waJahazieri, uye pamwe chete naye varume mazana matatu;
6 Ndị ikwu Adin, Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise so ya.
kuzvizvarwa zvaAdhini, Ebhedhi mwanakomana waJonatani, uye pamwe chete naye varume makumi mashanu;
7 Ndị sitere nʼikwu Elam, Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa,
kuzvizvarwa zvaEramu, Jeshaya mwanakomana waAtaria uye pamwe chete naye varume makumi manomwe;
8 ndị sitere nʼikwu Shefataya, Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ.
kuzvizvarwa zvaShefatia, Zebhadhia mwanakomana Mikaeri, uye pamwe chete naye varume makumi masere;
9 Ndị sitere nʼikwu Joab, Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ,
kuzvizvarwa zvaJoabhu, Obhadhia mwanakomana waJehieri, uye pamwe chete naye varume mazana maviri negumi navasere;
10 ndị sitere nʼikwu Bani, Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii.
kuzvizvarwa zvaBhani, Sheromiti mwanakomana waJosifia, uye pamwe chete naye varume zana namakumi matanhatu;
11 Ndị sitere nʼikwu Bebai; Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ,
kuzvizvarwa zvaBhebhai, Zekaria mwanakomana waBhebhai, uye pamwe chete naye varume makumi maviri navasere;
12 ndị sitere nʼikwu Azgad, Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri.
kuzvizvarwa zvaAzigadhi, Johanani mwanakomana waHakatani, uye pamwe chete naye varume zana negumi;
13 Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii bụ ndị so ha,
kuzvizvarwa zvaAdhonikami, ivo vokupedzisira, mazita avo vaiti Erifereti, Jeuyeri naShemaya, uye pamwe chete navo varume makumi matanhatu;
14 ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa bụ ndị so ha.
kuzvizvarwa zvaBhigivhai, Utai naZakuri, uye pamwe chete navo varume makumi manomwe.
15 Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.
Ndakavaunganidza vose parwizi runoerera rwakananga kuAhavha, uye takagarapo pamisasa kwamazuva matatu. Pandakacherechedza pakati pavanhu navaprista, handina kuona vaRevhi pakati pavo.
16 Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.
Nokudaro ndakadana Eriezeri, Arieri, Shemaya, Erinati, Jaribhi, Erinatani, Natani, Zekaria, naMeshurami, avo vakanga vari vatungamiri naJoyaribhi naErinatani, avo vakanga vari varume vakadzidza,
17 Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.
uye ndakavatuma kuna Idho, mutungamiri womuKasifia. Ndakavaudza zvokutaura kuna Idho nehama dzake, varanda vomutemberi muKasifia, kuitira kuti vagouya navashandi vomumba maMwari wedu kwatiri.
18 Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ. Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.
Nokuti ruoko rwenyasha rwaMwari wedu rwakanga rwuri pamusoro pedu, vakauya naSherebhia, murume aiva nounyanzvi, akabva kuzvizvarwa zvaMari, mwanakomana waRevhi, mwanakomana waIsraeri, uye navanakomana vaSherebhia nehama dzake, varume gumi navasere,
19 Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ.
uye Hashabhia, pamwe chete naJeshaya aibva kuzvizvarwa zvaMerari, nehama dzake navana vavo, varume makumi maviri.
20 Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
Vakauyawo navaranda vomutemberi mazana maviri namakumi maviri, uwandu hwakanga hwanyorwa naDhavhidhi namakurukota kuti vabatsire vaRevhi. Vose vakanga vakanyorwa mazita avo.
21 Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.
Ipapo, paRwizi rweAhavha, ndakatara nguva yokutsanya kuti tizvininipise pamberi paMwari wedu uye kuti timukumbire kuti atifambise rwendo rwakanaka isu navana vedu nepfuma yedu yose.
22 Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.
Nokuti ndakanyara kukumbira mambo kuti atipe varwi navatasvi vamabhiza kuti vatirwire kubva kuvavengi vedu parwendo nokuti takanga taudza mambo kuti, “Ruoko rwenyasha rwaMwari wedu rwuri pamusoro pomunhu wose anotarira kwaari.”
23 Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
Naizvozvo takatsanya uye tikanyengetera kuna Mwari wedu pamusoro paizvozvi, uye akapindura munyengetero wedu.
24 Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.
Ipapo ndakatsaura vaprista vaitungamira gumi navaviri, pamwe chete naSherebhia, naHashabhia uye nehama dzavo gumi,
25 Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke.
uye ndakavaerera zvipiriso zvesirivha negoridhe nemidziyo yakanga yapiwa kuimba yaMwari wedu namambo navapi vake vamazano namakurukota ake uye navaIsraeri vose.
26 E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100).
Ndakavaerera matarenda mazana matanhatu namakumi mashanu esirivha, nemidziyo yesirivha yairema matarenda zana, namatarenda zana egoridhe,
27 Iri efere ọlaedo abụọ nke ọnụahịa ya bụ puku darik, tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
mbiya dzegoridhe makumi maviri dzaikosha madhariki chiuru chimwe chete, uye nemidziyo miviri yakaisvonaka yendarira yaibwinya, inokosha segoridhe.
28 Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha.
Ndakati kwavari, “Imi pamwe chete nemidziyo iyi makatsaurirwa Jehovha. Sirivha negoridhe ndizvo zvipo zvokupa nokuzvisarudzira kuna Jehovha, Mwari wamadzibaba enyu.
29 Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”
Muzvirinde zvakanaka kusvikira mazviyera pamberi pavakuru vavaprista navaRevhi uye navakuru vemhuri dzavaIsraeri paJerusarema mumakamuri eimba yaJehovha.”
30 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.
Ipapo vaprista navaRevhi vakagamuchira sirivha negoridhe nemidziyo mitsvene yakanga yaerwa kuti iendeswe kuimba yaMwari wedu muJerusarema.
31 Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.
Pazuva regumi namaviri romwedzi wokutanga takabva parwizi rweAhavha tichienda kuJerusarema. Ruoko rwaMwari rwakanga rwuri pamusoro pedu, uye akatidzivirira kubva kuvavengi navakanga vakativandira panzira.
32 Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.
Saka takasvika muJerusarema tikazororamo kwamazuva matatu.
33 Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha.
Pazuva rechina, muimba yaMwari takayera sirivha negoridhe nemidziyo mitsvene mumaoko aMeremoti mwanakomana waUria, muprista. Ereazari mwanakomana waFinehasi akanga aripowo naye, uye navaRevhi vanoti Jozabhadhi mwanakomana waJeshua naNoadhia mwanakomana waBhinui.
34 Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ.
Zvinhu zvose zvakaverengwa uwandu hwazvo uye zvikayerwa, uye uremu hwazvo zvose hwakanyorwa panguva iyoyo.
35 Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Ipapo vatapwa vakanga vadzoka kubva kuutapwa vakabayira zvipiriso zvinopiswa kuna Mwari waIsraeri: hando gumi nembiri dzavaIsraeri vose, makondobwe makumi mapfumbamwe namatanhatu, namakwayana makono makumi manomwe namanomwe, uye nhongo dzembudzi gumi nembiri, sechipiriso chechivi. Zvose izvi zvaiva chipiriso chinopiswa kuna Jehovha.
36 E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ.
Vakapawo zvirevo zvamambo kumachinda amambo uye navabati mhiri kwaYufuratesi, avo vakazopawo rubatsiro kuvanhu nokuimba yaMwari.

< Ezra 8 >