< Ezra 8 >

1 Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:
當亞達薛西王年間,同我從巴比倫上來的人,他們的族長和他們的家譜記在下面:
2 ndị ikwu Finehaz, Geshọm; ndị ikwu Itama, Daniel; ndị ikwu Devid, Hatush
屬非尼哈的子孫有革順;屬以他瑪的子孫有但以理;屬大衛的子孫有哈突;
3 ndị ikwu Shekanaya; ndị ikwu Parosh, Zekaraya na narị mmadụ na iri ise ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ.
屬巴錄的後裔,就是示迦尼的子孫有撒迦利亞,同着他,按家譜計算,男丁一百五十人;
4 Ndị ikwu Pahat-Moab, Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ,
屬巴哈‧摩押的子孫有西拉希雅的兒子以利約乃,同着他有男丁二百;
5 ndị ikwu Zatu, Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ so ya.
屬示迦尼的子孫有雅哈悉的兒子,同着他有男丁三百;
6 Ndị ikwu Adin, Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise so ya.
屬亞丁的子孫有約拿單的兒子以別,同着他有男丁五十;
7 Ndị sitere nʼikwu Elam, Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa,
屬以攔的子孫有亞他利雅的兒子耶篩亞,同着他有男丁七十;
8 ndị sitere nʼikwu Shefataya, Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ.
屬示法提雅的子孫有米迦勒的兒子西巴第雅,同着他有男丁八十;
9 Ndị sitere nʼikwu Joab, Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ,
屬約押的子孫有耶歇的兒子俄巴底亞,同着他有男丁二百一十八;
10 ndị sitere nʼikwu Bani, Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii.
屬示羅密的子孫有約細斐的兒子,同着他有男丁一百六十;
11 Ndị sitere nʼikwu Bebai; Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ,
屬比拜的子孫有比拜的兒子撒迦利亞,同着他有男丁二十八;
12 ndị sitere nʼikwu Azgad, Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri.
屬押甲的子孫有哈加坦的兒子約哈難,同着他有男丁一百一十;
13 Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii bụ ndị so ha,
屬亞多尼干的子孫,就是末尾的,他們的名字是以利法列、耶利、示瑪雅,同着他們有男丁六十;
14 ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa bụ ndị so ha.
屬比革瓦伊的子孫有烏太和撒布,同着他們有男丁七十。
15 Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.
我招聚這些人在流入亞哈瓦的河邊,我們在那裏住了三日。我查看百姓和祭司,見沒有利未人在那裏,
16 Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.
就召首領以利以謝、亞列、示瑪雅、以利拿單、雅立、以利拿單、拿單、撒迦利亞、米書蘭,又召教習約雅立和以利拿單。
17 Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.
我打發他們往迦西斐雅地方去見那裏的首領易多,又告訴他們當向易多和他的弟兄尼提寧說甚麼話,叫他們為我們上帝的殿帶使用的人來。
18 Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ. Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.
蒙我們上帝施恩的手幫助我們,他們在以色列的曾孫、利未的孫子、抹利的後裔中帶一個通達人來;還有示利比和他的眾子與弟兄共一十八人。
19 Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ.
又有哈沙比雅,同着他有米拉利的子孫耶篩亞,並他的眾子和弟兄共二十人。
20 Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
從前大衛和眾首領派尼提寧服事利未人,現在從這尼提寧中也帶了二百二十人來,都是按名指定的。
21 Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.
那時,我在亞哈瓦河邊宣告禁食,為要在我們上帝面前克苦己心,求他使我們和婦人孩子,並一切所有的,都得平坦的道路。
22 Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.
我求王撥步兵馬兵幫助我們抵擋路上的仇敵,本以為羞恥;因我曾對王說:「我們上帝施恩的手必幫助一切尋求他的;但他的能力和忿怒必攻擊一切離棄他的。」
23 Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
所以我們禁食祈求我們的上帝,他就應允了我們。
24 Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.
我分派祭司長十二人,就是示利比、哈沙比雅,和他們的弟兄十人,
25 Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke.
將王和謀士、軍長,並在那裏的以色列眾人為我們上帝殿所獻的金銀和器皿,都秤了交給他們。
26 E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100).
我秤了交在他們手中的銀子有六百五十他連得;銀器重一百他連得;金子一百他連得;
27 Iri efere ọlaedo abụọ nke ọnụahịa ya bụ puku darik, tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
金碗二十個,重一千達利克;上等光銅的器皿兩個,寶貴如金。
28 Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha.
我對他們說:「你們歸耶和華為聖,器皿也為聖;金銀是甘心獻給耶和華-你們列祖之上帝的。
29 Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”
你們當警醒看守,直到你們在耶路撒冷耶和華殿的庫內,在祭司長和利未族長,並以色列的各族長面前過了秤。」
30 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.
於是,祭司、利未人按着分量接受金銀和器皿,要帶到耶路撒冷我們上帝的殿裏。
31 Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.
正月十二日,我們從亞哈瓦河邊起行,要往耶路撒冷去。我們上帝的手保佑我們,救我們脫離仇敵和路上埋伏之人的手。
32 Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.
我們到了耶路撒冷,在那裏住了三日。
33 Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha.
第四日,在我們上帝的殿裏把金銀和器皿都秤了,交在祭司烏利亞的兒子米利末的手中。同着他有非尼哈的兒子以利亞撒,還有利未人耶書亞的兒子約撒拔和賓內的兒子挪亞底。
34 Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ.
當時都點了數目,按着分量寫在冊上。
35 Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
從擄到之地歸回的人向以色列的上帝獻燔祭,就是為以色列眾人獻公牛十二隻,公綿羊九十六隻,綿羊羔七十七隻,又獻公山羊十二隻作贖罪祭,這都是向耶和華焚獻的。
36 E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ.
他們將王的諭旨交給王所派的總督與河西的省長,他們就幫助百姓,又供給上帝殿裏所需用的。

< Ezra 8 >