< Ezra 3 >

1 Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem.
By the seventh month, the Israelites had settled in their towns, and the people assembled as one man in Jerusalem.
2 Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu.
Then Jeshua son of Jozadak and his fellow priests, along with Zerubbabel son of Shealtiel and his associates, began to build the altar of the God of Israel to sacrifice burnt offerings on it, as it is written in the Law of Moses the man of God.
3 Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi.
They set up the altar on its foundation and sacrificed burnt offerings on it to the LORD—both the morning and evening burnt offerings—even though they feared the people of the land.
4 Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ.
They also celebrated the Feast of Tabernacles in accordance with what is written, and they offered burnt offerings daily based on the number prescribed for each day.
5 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.
After that, they presented the regular burnt offerings and those for New Moons and for all the appointed sacred feasts of the LORD, as well as all the freewill offerings brought to the LORD.
6 Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
On the first day of the seventh month, the Israelites began to offer burnt offerings to the LORD, although the foundation of the temple of the LORD had not been laid.
7 Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.
They gave money to the masons and carpenters, and food and drink and oil to the people of Sidon and Tyre to bring cedar logs from Lebanon to Joppa by sea, as authorized by Cyrus king of Persia.
8 Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.
In the second month of the second year after they had arrived at the house of God in Jerusalem, Zerubbabel son of Shealtiel, Jeshua son of Jozadak, and the rest of their associates including the priests, the Levites, and all who had returned to Jerusalem from the captivity, began the work. They appointed Levites twenty years of age or older to supervise the construction of the house of the LORD.
9 Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.
So Jeshua and his sons and brothers, Kadmiel and his sons (descendants of Yehudah), and the sons of Henadad and their sons and brothers—all Levites—joined together to supervise those working on the house of God.
10 Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị.
When the builders had laid the foundation of the temple of the LORD, the priests in their apparel with trumpets, and the Levites (the sons of Asaph) with cymbals, took their positions to praise the LORD, as David king of Israel had prescribed.
11 Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị: “Ọ dị mma, ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
And they sang responsively with praise and thanksgiving to the LORD: “For He is good; for His loving devotion to Israel endures forever.” Then all the people gave a great shout of praise to the LORD, because the foundation of the house of the LORD had been laid.
12 Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.
But many of the older priests, Levites, and family heads who had seen the first temple wept loudly when they saw the foundation of this temple. Still, many others shouted joyfully.
13 Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.
The people could not distinguish the shouts of joy from the sound of weeping, because the people were making so much noise. And the sound was heard from afar.

< Ezra 3 >