< Ezra 2 >
1 Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.
Ga lissafin waɗanda suka dawo daga bauta a Babilon, waɗanda Nebukadnezzar sarkin Babilon ya kwasa zuwa bauta a ƙasar Babilon (sun dawo Urushalima da Yahuda, kowa ya koma garinsu.
2 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
Sun komo tare da Zerubbabel, da Yeshuwa, da Nehemiya, da Serahiya, da Re’elaya, da Mordekai, da Bilshan, da Misfar, da Bigwai, da Rehum, da Ba’ana). Ga jerin mazan mutanen Isra’ila.
3 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ.
Zuriyar Farosh mutum 2,172
4 Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ.
ta Shefatiya 372
5 Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise.
ta Ara 775
6 Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ.
ta Fahat-Mowab (ta wurin Yeshuwa da Yowab) 2,812
7 Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ.
ta Elam 1,254
8 Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise.
ta Zattu 945
9 Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii.
ta Zakkai 760
10 Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ.
ta Bani 642
11 Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ.
ta Bebai 623
12 Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ.
ta Azgad 1,222
13 Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii.
ta Adonikam 666
14 Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii.
ta Bigwai 2,056
15 Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ.
ta Adin 454
16 Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ.
ta Ater (ta wurin Hezekiya) 98
17 Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ.
ta Bezai 323
18 Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ.
ta Yora 112
19 Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
ta Hashum 223
20 Ụmụ Giba, iri itoolu na ise.
ta Gibbar 95.
21 Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ.
Mutanen Betlehem 123
22 Ndị ikom Netofa, iri ise na isii.
na Netofa 56
23 Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ.
na Anatot 128
24 Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ.
na Azmawet 42
25 Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ.
na Kiriyat Yeyarim, da Kefira Beyerot 743
26 Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu.
na Rama da Geba 621
27 Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ.
na Mikmash 122
28 Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
na Betel da Ai 223
29 Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ.
na Nebo 52
30 Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii.
na Magbish 156
31 Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ.
na ɗayan Elam ɗin 1,254
32 Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ.
na Harim 320
33 Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise.
na Lod, da Hadid da Ono 725
34 Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise.
na Yeriko 345
35 Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ.
na Sena’a 3,630.
36 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ
Firistoci. Zuriyar Yedahiya (ta wurin iyalin Yeshuwa) 973
37 ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ
ta Immer 1,052
38 ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa
ta Fashhur 1,247
39 ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa.
ta Harim 1,017.
40 Ndị Livayị: Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ.
Lawiyawa. Lawiyawa na zuriyar Yeshuwa da Kadmiyel (ta wurin Hodawiya) mutum 74.
41 Ndị ọbụ abụ: Ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri abụọ na asatọ.
Mawaƙa. Zuriyar Asaf mutum 128.
42 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu.
Masu tsaron haikali. Zuriyar Shallum, Ater, Talmon, Akkub, Hatita, da Shobai mutum 139.
43 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: Ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
Ma’aikatan haikali. Zuriyar Ziha, Hasufa, Tabbawot,
46 Hagab, Shalmai, Hanan,
Hagab, Shamlai, Hanan,
50 Asna, Meunim, Nefusim,
Asna, Meyunawa, Nefussiyawa,
51 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
Bakbuk, Hakufa, Harhur,
52 Bazlut, Mehida, Hasha,
Bazlut, Mehida, Harsha,
55 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
Zuriyar bayin Solomon. Zuriyar Sotai, Hassoferet, Feruda,
57 Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
Shefatiya, Hattil, Fokeret-Hazzebayim, da Ami.
58 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
Dukan zuriyar ma’aikatan haikali, da kuma bayin Solomon 392.
59 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
Waɗannan mutanen ne suka zo daga garuruwan Tel-Mela, Tel-Harsha, Kerub, Addan da Immer, amma ba su iya nuna ainihin tushensu daga Isra’ila ba.
60 Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ.
’Yan zuriyar Delahiya, Tobiya, da Nekoda 652.
61 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
Daga cikin firistoci kuma, zuriyar Hobahiya, Hakkoz da Barzillai (wanda ya auri diyar Barzillai mutumin Gileyad da ake kuma kira da wannan suna).
62 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
Waɗannan sun nemi sunayen iyalansu a cikin littafin da ake rubuta sunayen amma ba su ga sunayensu ba, saboda haka sai aka hana su zama firistoci domin an ɗauka su marasa tsabta ne.
63 Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
Gwamna ya umarce su cewa kada su ci wani abinci mai tsarki sai firist ya yi shawara ta wurin Urim da Tummim tukuna.
64 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii,
Yawan jama’ar duka ya kai mutum 42,360,
65 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ.
ban da bayinsu maza da mata 7,337; suna kuma da mawaƙa maza da mata 200.
66 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise.
Suna da dawakai guda 736, alfadarai 245,
67 Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ.
raƙuma 435, da jakuna 6,720.
68 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
Sa’ad da suka isa haikalin Ubangiji a Urushalima, sai waɗansu shugabannin iyalai suka yi bayarwar yardar rai ta gudummawarsu domin sāke gina gidan Allah a wurin da yake.
69 Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu, maịna ọlaọcha dị puku ise na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị.
Bisa ga ƙarfinsu suka bayar da darik 61,000 na zinariya, da maina 5,000 na azurfa, da rigunan firistoci guda 100.
70 Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.
Firistoci, da Lawiyawa, da mawaƙa, da masu tsaron ƙofofi, da masu aiki a haikali, tare da waɗansu mutane, da dukan sauran Isra’ilawa suka zauna a garuruwansu.