< Ezra 2 >

1 Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.
Men disse ere Landskabets Folk, som af de bortførte Fangers Tal, hvilke Nebukadnezar, Kongen af Babel, havde bortført til Babel, droge op, og som kom tilbage til Jerusalem og Juda, hver til sin Stad,
2 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
hvilke kom med Serubabel: Jesua, Nehemia, Seraja, Reelia, Mardokaj, Bilsan, Mispar, Bigvaj, Rehum, Baena; Tallet paa Mændene af Israels Folk var:
3 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ.
Pareos's Børn, to Tusinde, et Hundrede, to og halvfjerdsindstyve;
4 Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ.
Sefatjas Børn, tre Hundrede og to og halvfjerdsindstyve;
5 Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise.
Araks Børn, syv Hundrede, fem og halvfjerdsindstyve;
6 Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ.
Pahat-Moabs Børn af Jesuas og Joabs Børn, to Tusinde, otte Hundrede og tolv;
7 Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ.
Elams Børn, tusinde, to Hundrede, fire og halvtredsindstyve;
8 Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise.
Sathus Børn, ni Hundrede og fem og fyrretyve;
9 Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii.
Saccajs Børn, syv Hundrede og tresindstyve;
10 Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ.
Banis Børn, seks Hundrede og to og fyrretyve;
11 Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ.
Bebais Børn, seks Hundrede og tre og tyve;
12 Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ.
Asgads Børn, tusinde, to Hundrede og to og tyve;
13 Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii.
Adonikams Børn, seks Hundrede og seks og tresindstyve;
14 Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii.
Bigvajs Børn, to Tusinde og seks og halvtredsindstyve;
15 Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ.
Adins Børn, fire Hundrede og fire og halvtredsindstyve;
16 Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ.
Alters Børn af Ezekias, otte og halvfemsindstyve;
17 Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ.
Bezajs Børn, tre Hundrede og tre og tyve;
18 Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ.
Joras Børn, hundrede og tolv;
19 Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
Hasums Børn, to Hundrede og tre og tyve;
20 Ụmụ Giba, iri itoolu na ise.
Gibbars Børn, fem og halvfemsindstyve
21 Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ.
Bethlehems Børn, hundrede og tre og tyve;
22 Ndị ikom Netofa, iri ise na isii.
Nethofas Mænd, seks og halvtredsindstyve;
23 Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ.
de Mænd af Anathoth, hundrede og otte og tyve;
24 Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ.
Asmaveths Børn, to og fyrretyve;
25 Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ.
de Børn af Kirjath-Arim, Kefira og Beeroth, syv Hundrede og tre og fyrretyve;
26 Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu.
de Børn af Rama og Geba, seks Hundrede og en og tyve;
27 Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ.
de Mænd af Mikmas, hundrede og to og tyve;
28 Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
de Mænd af Bethel og Ai, to Hundrede og tre og tyve;
29 Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ.
Nebos Børn, to og halvtredsindstyve;
30 Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii.
de Børn af Magbis, hundrede og seks og halvtredsindstyve,
31 Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ.
den anden Elams Børn, tusinde, to Hundrede og fire og halvtredsindstyve;
32 Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ.
Harims Børn, tre Hundrede og tyve;
33 Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise.
Lods, Hadids og Onos Børn, syv Hundrede og fem og tyve;
34 Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise.
Jerikos Børn, tre Hundrede og fem og fyrretyve;
35 Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ.
Senaas Børn, tre Tusinde og seks Hundrede og tredive.
36 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ
Præsterne: Jejadas Børn af Jesuas Hus, ni Hundrede og tre og halvfjerdsindstyve;
37 ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ
Immers Børn, tusinde og to og halvtredsindstyve;
38 ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa
Pashurs Børn, tusinde og to Hundrede og syv og fyrretyve;
39 ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa.
Harims Børn, tusinde og sytten.
40 Ndị Livayị: Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ.
Leviterne: Jesuas og Kadmiels Børn af Hodavias Børn, fire og halvfjerdsindstyve.
41 Ndị ọbụ abụ: Ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri abụọ na asatọ.
Sangerne: Asafs Børn, hundrede og otte og tyve.
42 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu.
Portnernes Børn: Sallums Børn, Aters Børn, Talmons Børn, Akkubs Børn, Hatitas Børn, Sobajs Børn; de vare alle sammen hundrede og ni og tredive.
43 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: Ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
De livegne: Zihas Børn, Hasufas Børn, Tabaoths Børn,
44 Keros, Siaha, Padon,
Keros's Børn, Siehas Børn, Padons Børn,
45 Lebana, Hagaba, Akub,
Lebanas Børn, Hagabas Børn, Akkubs Børn,
46 Hagab, Shalmai, Hanan,
Hagabs Børn, Samlajs Børn, Hanans Børn,
47 Gidel, Gaha, Reaya,
Giddels Børn, Gahars Børn, Reajas Børn,
48 Rezin, Nekoda, Gazam,
Rezins Børn, Nekodas Børn, Gassams Børn,
49 Ụza, Pasea Besai,
Ussas Børn, Passeas Børn, Besajs Børn,
50 Asna, Meunim, Nefusim,
Asnas Børn, Meunims Børn, Nefusims Børn,
51 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
Bakbuks Børn, Hakufas Børn, Harhurs Børn,
52 Bazlut, Mehida, Hasha,
Bazluths Børn, Mehidas Børn, Harsas Børn,
53 Bakos, Sisera, Tema,
Barkos's Børn, Siseras Børn, Thamas Børn,
54 Nezaya na Hatifa.
Nezias Børn, Hathifas Børn.
55 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
Salomos Tjeneres Børn: Sotajs Børn, Soferets Børn, Prudas Børn,
56 Jaala, Dakon, Gidel
Jaelas Børn, Darkons Børn, Giddels Børn.
57 Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
Sefatjas Børn, Hattils Børn, Pokereth-Hazzebajms Børn, Amis Børn.
58 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
Alle de livegne og Salomos Tjeneres Børn vare tre Hundrede og to og halvfemsindstyve.
59 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
Og disse ere de som droge op fra Thel-Mela, Thel-Harsa, Kerub, Addan og Immer; men de kunde ikke angive deres Fædres Hus og deres Slægt, om de vare af Israel,
60 Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ.
nemlig Delajas Børn, Tobias Børn, Nekodas Børn, seks Hundrede og to og halvtredsindstyve.
61 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
Og af Præsternes Børn var der: Habajas Børn, Hakons Børn, Barsilfajs Børn, hans, som tog en Hustru af Barsillajs, Gileaditens, Døtre og blev nævnet efter deres Navn.
62 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
Disse ledte efter deres Fortegnelse i Slægtregistrene, men bleve ikke fundne deri, og de bleve som urene afviste fra Præstedømmet.
63 Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
Og Hattirsatha sagde til dem, at de skulde ikke æde af de højhellige Ting, førend en Præst stod med Urim og med Thummim.
64 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii,
Hele Forsamlingen var til Hobe: To og fyrretyve Tusinde, tre Hundrede og tresindstyve
65 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ.
foruden deres Tjenere og deres Tjenestepiger: Disse vare syv Tusinde, tre Hundrede og syv og tredive, og de havde to Hundrede Sangere og Sangersker.
66 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise.
Deres Heste vare syv Hundrede og seks og tredive, deres Muler to Hundrede og fem og fyrretyve.
67 Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ.
Deres Kameler vare fire Hundrede og fem og tredive, Asener seks Tusinde, syv Hundrede og tyve.
68 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
Og nogle af Øversterne for Fædrenehusene, der de kom til Herrens Hus, som var i Jerusalem, gave frivilligt til Guds Hus for at rejse det paa dets Grundvold.
69 Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu, maịna ọlaọcha dị puku ise na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị.
De gave efter deres Formue, som Sammenskud til Arbejdet i Guld en og tresindstyve Tusinde Drakmer og fem Tusinde Pund Sølv og hundrede Præstekjortler.
70 Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.
Saa boede Præsterne og Leviterne og nogle af Folket og Sangerne og Portnerne og de livegne i sine Stæder; og al Israel boede i sine Stæder.

< Ezra 2 >