< Ezra 10 >

1 Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
以斯拉祷告,认罪,哭泣,俯伏在 神殿前的时候,有以色列中的男女孩童聚集到以斯拉那里,成了大会,众民无不痛哭。
2 Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
属以拦的子孙、耶歇的儿子示迦尼对以斯拉说:“我们在此地娶了外邦女子为妻,干犯了我们的 神,然而以色列人还有指望。
3 Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
现在当与我们的 神立约,休这一切的妻,离绝她们所生的,照着我主和那因 神命令战兢之人所议定的,按律法而行。
4 Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
你起来,这是你当办的事,我们必帮助你,你当奋勉而行。”
5 Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
以斯拉便起来,使祭司长和利未人,并以色列众人起誓说,必照这话去行;他们就起了誓。
6 Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
以斯拉从 神殿前起来,进入以利亚实的儿子约哈难的屋里,到了那里不吃饭,也不喝水;因为被掳归回之人所犯的罪,心里悲伤。
7 E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.
他们通告犹大和耶路撒冷被掳归回的人,叫他们在耶路撒冷聚集。
8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
凡不遵首领和长老所议定、三日之内不来的,就必抄他的家,使他离开被掳归回之人的会。
9 Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
于是,犹大和便雅悯众人,三日之内都聚集在耶路撒冷。那日正是九月二十日,众人都坐在 神殿前的宽阔处;因这事,又因下大雨,就都战兢。
10 Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.
祭司以斯拉站起来,对他们说:“你们有罪了;因你们娶了外邦的女子为妻,增添以色列人的罪恶。
11 Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”
现在当向耶和华—你们列祖的 神认罪,遵行他的旨意,离绝这些国的民和外邦的女子。”
12 Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
会众都大声回答说:“我们必照着你的话行,
13 Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
只是百姓众多,又逢大雨的时令,我们不能站在外头,这也不是一两天办完的事,因我们在这事上犯了大罪;
14 Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”
不如为全会众派首领办理。凡我们城邑中娶外邦女子为妻的,当按所定的日期,同着本城的长老和士师而来,直到办完这事, 神的烈怒就转离我们了。”
15 Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.
惟有亚撒黑的儿子约拿单,特瓦的儿子雅哈谢阻挡这事,并有米书兰和利未人沙比太帮助他们。
16 Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.
被掳归回的人如此而行。祭司以斯拉和些族长按着宗族都指名见派;在十月初一日,一同在座查办这事,
17 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.
到正月初一日,才查清娶外邦女子的人数。
18 A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
在祭司中查出娶外邦女子为妻的,就是耶书亚的子孙约萨达的儿子,和他弟兄玛西雅、以利以谢、雅立、基大利;
19 Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
他们便应许必休他们的妻。他们因有罪,就献群中的一只公绵羊赎罪。
20 Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
音麦的子孙中,有哈拿尼、西巴第雅。
21 Ikwu Harim: Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
哈琳的子孙中,有玛西雅、以利雅、示玛雅、耶歇、乌西雅。
22 Ndị si nʼikwu Pashua: Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.
巴施户珥的子孙中,有以利约乃、玛西雅、以实玛利、拿坦业、约撒拔、以利亚撒。
23 Nʼime ndị Livayị: Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza.
利未人中,有约撒拔、示每、基拉雅(基拉雅就是基利他),还有毗他希雅、犹大、以利以谢。
24 Nʼime ndị na-abụ abụ, Eliashib. Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ: Shalum, Telem, na Uri.
歌唱的人中有以利亚实。守门的人中,有沙龙、提联、乌利。
25 Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ: Site nʼikwu Parosh: Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya.
以色列人巴录的子孙中,有拉米、耶西雅、玛基雅、米雅民、以利亚撒、玛基雅、比拿雅。
26 Site nʼikwu Elam: Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja.
以拦的子孙中,有玛他尼、撒迦利亚、耶歇、押底、耶利末、以利雅。
27 Site nʼikwu Zatu: Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza.
萨土的子孙中,有以利约乃、以利亚实、玛他尼、耶利末、撒拔、亚西撒。
28 Site nʼikwu Bebai: Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai.
比拜的子孙中,有约哈难、哈拿尼雅、萨拜、亚勒。
29 Site nʼikwu Bani, Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot.
巴尼的子孙中,有米书兰、玛鹿、亚大雅、雅述、示押、耶利末。
30 Site nʼikwu Pahat-Moab, Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase.
巴哈·摩押的子孙中,有阿底拿、基拉、比拿雅、玛西雅、玛他尼、比撒列、宾内、玛拿西。
31 Site nʼikwu Harim: Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon,
哈琳的子孙中,有以利以谢、伊示雅、玛基雅、示玛雅、西缅、
32 Benjamin, Maluk na Shemaraya.
便雅悯、玛鹿、示玛利雅。
33 Site nʼikwu Hashum, Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei.
哈顺的子孙中,有玛特乃、玛达他、撒拔、以利法列、耶利买、玛拿西、示每。
34 Site nʼikwu Bani, Maadai, Amram, Uel,
巴尼的子孙中,有玛玳、暗兰、乌益、
35 Benaya, Bedeia, Keluhi
比拿雅、比底雅、基禄、
36 Venaya, Meremot, Eliashib
瓦尼雅、米利末、以利亚实、
37 Matanaya, Matenai na Jaasu.
玛他尼、玛特乃、雅扫、
38 Site nʼikwu Bani: Binui na Shimei,
巴尼、宾内、示每、
39 Shelemaya, Netan, Adaya,
示利米雅、拿单、亚大雅、
40 Maknadebai, Shashai, Sharai,
玛拿底拜、沙赛、沙赖、
41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
亚萨利、示利米雅、示玛利雅、
42 Shalum, Amaraya na Josef.
沙龙、亚玛利雅、约瑟。
43 Site nʼikwu Nebo: Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya.
尼波的子孙中,有耶利、玛他提雅、撒拔、西比拿、雅玳、约珥、比拿雅。
44 Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.
这些人都娶了外邦女子为妻,其中也有生了儿女的。

< Ezra 10 >